< Diuteronomi 24 >

1 Ọ bụrụ na nwoke akpọrọ nwanyị, lụọ ya, ma emesịa ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị ya nʼihi na ọ dị ihe ọ chọpụtara nʼahụ ya nke na-adịghị mma, ọ ga-ede akwụkwọ alụkwaghị m nye nwanyị ahụ nʼaka, zilaa ya.
Bí ọkùnrin kan bá fẹ́ obìnrin kan, tí ó sì gbe ní ìyàwó, yóò sì ṣe, bí obìnrin náà kò bá rí ojúrere ní ojú ọkùnrin náà, nítorí ó rí ohun àìtọ́ kan lára rẹ̀, ǹjẹ́ kí ó kọ ìwé ìkọ̀sílẹ̀ fún obìnrin náà, kí ó sì fi lé e lọ́wọ́, kí ó sì ran jáde kúrò nínú ilé rẹ̀,
2 Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya,
tí ó bá di ìyàwó ọkùnrin mìíràn lẹ́yìn ìgbà tí ó kúrò nílé rẹ,
3 ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ,
àti tí ọkọ rẹ̀ kejì kò bá fẹ́ràn rẹ̀ tí ó sì kọ ìwé-ẹ̀rí ìkọ̀sílẹ̀ sí i, kí ó fi fún un kí ó sì lé e kúrò nílé e rẹ̀, tàbí tí ọkọ rẹ̀ kejì bá kú,
4 nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa.
nígbà náà ni ọkọ, tí ó ti kọ̀ ọ́ sílẹ̀, kò gbọdọ̀ fẹ́ ẹ mọ́ lẹ́yìn tí ó ti di àìmọ́. Nítorí èyí ni ìríra níwájú Olúwa. Má ṣe mú ẹ̀ṣẹ̀ wá sórí ilẹ̀ tí Olúwa Ọlọ́run rẹ yóò fi fún ọ bí ogún.
5 Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.
Bí ọkùnrin kan bá ṣẹ̀ṣẹ̀ gbéyàwó, o kò gbọdọ̀ ran lọ sí ogun tàbí kí ó ní iṣẹ́ kan láti ṣe. Ó ní láti ní òmìnira fún ọdún kan kí ó dúró sílé kí ó sì mú inú dídùn bá ìyàwó rẹ̀ tí ó fẹ́.
6 Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.
Ẹnikẹ́ni kò gbọdọ̀ gba ìyá ọlọ tàbí ọmọ ọlọ gẹ́gẹ́ bí ohun ìdúró fún gbèsè, nítorí pé ẹ̀mí ènìyàn ni ó gbà ní pàṣípàrọ̀ n nì.
7 Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị.
Bí a bá mú ọkùnrin kan tí ó jí ọ̀kan nínú arákùnrin rẹ̀ ní Israẹli gbé àti tí ó jí ọ̀kan nínú ẹrú tàbí kí ó tà á, ẹni tí ó jí ènìyàn gbé ní láti kú. Ẹ ní láti wẹ búburú kúrò láàrín yín.
8 Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso.
Ní ti ààrùn ẹ̀tẹ̀ kíyèsára láti máa ṣe gẹ́gẹ́ bí àwọn àlùfáà tí wọ́n jẹ́ ọmọ Lefi ti pàṣẹ fún ọ. O ní láti máa fi ìṣọ́ra tẹ̀lé ohun tí mo ti pàṣẹ fún wọn.
9 Chetakwa ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
Rántí ohun tí Olúwa Ọlọ́run rẹ ṣe sí Miriamu lójú ọ̀nà lẹ́yìn ìgbà tí o jáde kúrò ní Ejibiti.
10 Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe.
Nígbà tí o bá wín arákùnrin rẹ ní ohunkóhun, má ṣe lọ sí ilé rẹ̀ láti gba ohun tí ó bá mú wá bí ẹ̀rí.
11 Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi.
Dúró síta gbangba kí o sì jẹ́ kí ọkùnrin tí o wín mú ògo rẹ jáde wá fún ọ.
12 Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị.
Bí ọkùnrin náà bá jẹ́ tálákà má ṣe lọ sùn ti ìwọ ti ògo rẹ.
13 Weghachiri ya akwa ahụ nʼanyasị, ka onye agbataobi gị jiri ya hie ụra abalị. Mgbe ahụ ha ga-ekele gị, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agụkwara gị ya nʼezi omume.
Dá aṣọ ìlekè rẹ padà ní àṣálẹ́ kí ó bá à le sùn lórí i rẹ̀. Nígbà náà ni yóò dúpẹ́ lọ́wọ́ rẹ, ó sì máa jásí ìwà òdodo níwájú Olúwa Ọlọ́run rẹ.
14 Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị.
Má ṣe ni alágbàṣe kan lára tí ó jẹ́ tálákà àti aláìní, bóyá ó jẹ́ arákùnrin Israẹli tàbí àlejò tí ó ń gbé ní ọ̀kan nínú àwọn ìlú rẹ.
15 Kwụọ ya ụgwọ ya ụbọchị niile tupu anwụ adaa, nʼihi na ebe ọ bụ nwa ogbenye, obi ya dabeere nʼụgwọ ahụ ị ga-akwụ ya. Ọ bụrụ na i meghị otu a, ọ ga-akwa akwa kpọkuo Onyenwe anyị megide gị. A ga-agụkwara gị ya dịka mmehie.
San owó iṣẹ́ rẹ̀ ní ọjọ́ kan náà kí ó tó di àṣálẹ́, nítorí ó jẹ́ tálákà, ó sì gbẹ́kẹ̀lé e bí kò ṣe bẹ́ẹ̀ ó lè ké pe Olúwa sí ọ, o sì máa gba ìdálẹ́bi ẹ̀ṣẹ̀.
16 Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.
Baba kò gbọdọ̀ kú fún àwọn ọmọ wọn tàbí kí àwọn ọmọ kú fún baba wọ́n; olúkúlùkù ní láti kú fún ẹ̀ṣẹ̀ òun tìkára rẹ̀.
17 Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe.
Má ṣe yí ìdájọ́ po fún àlejò tàbí aláìní baba, tàbí gba aṣọ ìlekè opó bí ẹ̀rí.
18 Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a.
Rántí pé o jẹ́ ẹrú ní Ejibiti tí Olúwa Ọlọ́run rẹ sì gbà ọ́ níbẹ̀. Ìdí nìyí tí mo fi pa á láṣẹ fún ọ láti ṣe èyí.
19 Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba.
Nígbà tí o bá ń kórè oko rẹ tí o sì fojú fo ìtí kan, má ṣe padà lọ mú u. Fi í kalẹ̀ fún àwọn àlejò, aláìní baba àti opó, kí Olúwa Ọlọ́run rẹ lè bùkún fún gbogbo iṣẹ́ ọwọ́ ọ̀ rẹ.
20 Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ.
Nígbà tí o bá ń gun igi olifi lára àwọn igi i rẹ, má ṣe padà lọ sí ẹ̀ka náà ní ìgbà kejì. Fi èyí tí ó kù fún àlejò, aláìní baba àti opó.
21 Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ.
Nígbà tí ìwọ bá kórè èso àjàrà nínú ọgbà àjàrà rẹ, má ṣe lọ sí ọgbà náà mọ́. Fi èyí tí ó kù fún àlejò, aláìní baba àti opó.
22 Chetakwa na o nwere mgbe ị bụ ndị ohu nʼala Ijipt. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a.
Rántí pé ìwọ ti jẹ́ àlejò ní Ejibiti. Ìdí nìyí tí mo fi pa á láṣẹ fún ọ láti ṣe èyí.

< Diuteronomi 24 >