< Diuteronomi 24 >

1 Ọ bụrụ na nwoke akpọrọ nwanyị, lụọ ya, ma emesịa ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị ya nʼihi na ọ dị ihe ọ chọpụtara nʼahụ ya nke na-adịghị mma, ọ ga-ede akwụkwọ alụkwaghị m nye nwanyị ahụ nʼaka, zilaa ya.
人妻を取てこれを娶れる後恥べき所のこれにあるを見てこれを好まずなりたらば離縁状を書てこれが手に交しこれをその家より出すべし
2 Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya,
その婦これが家より出たる後往て他の人に嫁ぐことをせんに
3 ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ,
後の夫もこれを嫌ひ離縁状を書てその手にわたして之を家より出し又はこれを妻にめとれるその後の夫死るあるも
4 nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa.
是は已に身を汚玷したるに因て之を出したるその先の夫ふたたびこれを妻にめとるべからず是ヱホバの憎みたまふ事なればなり汝の神ヱホバの汝に與へて產業となさしめたまふ地に汝罪を負すなかれ
5 Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.
人あらたに妻を娶りたる時は之を軍に出すべからずまた何の職務をもこれに任すべからずその人は一年家に間居してその娶れる妻を慰むべし
6 Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.
人その磨礱を質におくべからず是その生命をつなぐ物を質におくなればなり
7 Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị.
イスラエルの子孫の中なるその兄弟を拐帶してこれを使ひまたはこれを賣る人あるを見ばその拐帶者を殺し然して汝らの中より惡を除くべし
8 Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso.
汝癩病を愼み凡て祭司たるレビ人が汝らに敎ふる所を善く守りて行ふべし即ち我が彼らに命ぜしごとくに汝ら守りて行ふべし
9 Chetakwa ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
汝らがエジプトより出きたれる路にて汝の神ヱホバがミリアムに爲たまひしところの事を誌えよ
10 Ọ bụrụ na i binye mmadụ ihe ọbụla, abanyekwala nʼụlọ ya ịnata ihe a na-enye gị dị ka ihe ebe.
凡て汝の鄰に物を貸あたふる時は汝みづからこれが家にいりてその質物を取べからず
11 Guzo nʼezi! Ka onye ahụ ị na-ebinye ihe wetara gị ihe ibe ahụ nʼezi.
汝は外に立をり汝が貸たる人その質物を外に持いだして汝に付すべし
12 Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị.
その人もし困苦者ならば之が質物を留おきて睡眠に就べからず
13 Weghachiri ya akwa ahụ nʼanyasị, ka onye agbataobi gị jiri ya hie ụra abalị. Mgbe ahụ ha ga-ekele gị, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agụkwara gị ya nʼezi omume.
かならず日の入る頃その質物を之に還すべし然せばその人おのれの上衣をまとふて睡眠につくことを得て汝を祝せん是汝の神ヱホバの前において汝の義となるべし
14 Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị.
困苦る貧き傭人は汝の兄弟にもあれ又は汝の地にてなんぢの門の内に寄寓る他國の人にもあれ之を虐ぐべからず
15 Kwụọ ya ụgwọ ya ụbọchị niile tupu anwụ adaa, nʼihi na ebe ọ bụ nwa ogbenye, obi ya dabeere nʼụgwọ ahụ ị ga-akwụ ya. Ọ bụrụ na i meghị otu a, ọ ga-akwa akwa kpọkuo Onyenwe anyị megide gị. A ga-agụkwara gị ya dịka mmehie.
當日にこれが値をはらふべし日の入るまで延すべからず其は貧き者にてその心にこれを慕へばなり恐らくは彼ヱホバに汝を訴ふるありて汝罪を獲ん
16 Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.
父はその子等の故によりて殺さるべからず子等はその父の故によりて殺さるべからず各人おのれの罪によりて殺さるべきなり
17 Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe.
汝他國の人または孤子の審判を曲べからずまた寡婦の衣服を質に取べからず
18 Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a.
汝誌ゆべし汝はエジプトに奴隸たりしが汝の神ヱホバ汝を其處より贖ひいだしたまへり是をもて我この事をなせと汝に命ずるなり
19 Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba.
汝田野にて穀物を刈る時もしその一束を田野に忘れおきたらば返りてこれを取べからず他國の人と孤子と寡婦とにこれを取すべし然せば汝の神ヱホバ凡て汝が手に作ところの事に祝福を降したまはん
20 Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ.
汝橄欖を打落す時は再びその枝をさがすべからずその遺れる者を他國の人と孤子と寡婦とに取すべし
21 Otu a ka ị ga-emekwa nʼihe banyere mkpụrụ ubi vaịnị gị. Atụtụkọchala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ya. Hapụrụ ndị ọbịa, na ndị mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ ihe niile fọdụrụ.
また葡萄園の葡萄を摘とる時はその遺れる者を再びさがすべからず他國の人と孤子と寡婦とにこれを取すべし
22 Chetakwa na o nwere mgbe ị bụ ndị ohu nʼala Ijipt. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a.
汝誌ゆべし汝はエジプトの國に奴隸たりしなり是をもて我この事を爲せと汝に命ず

< Diuteronomi 24 >