< Diuteronomi 23 >
1 Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
No man whose genitals have been damaged or cut off is allowed to enter the Lord's sanctuary.
2 Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
No one of mixed race is allowed to enter the Lord's sanctuary, and none of his descendants may do so either, up to the tenth generation.
3 Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.
No Ammonite or Moabite or any of their descendants are allowed to enter the Lord's sanctuary, up to the tenth generation.
4 Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ.
For they did not come to meet you with food and water on your journey from Egypt, and they hired Balaam, son of Beor, from Pethor in Mesopotamia, to curse you.
5 Ma Onyenwe anyị Chineke gị egeghị Belam ntị, kama Onyenwe anyị Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị hụrụ gị nʼanya.
But the Lord your God refused to listen to Balaam. The Lord your God turned what was meant to be a curse into a blessing for you because the Lord your God loves you.
6 Achọla udo ndị Amọn na Moab, na ọdịmma ha ụbọchị ndụ gị niile ruo mgbe ebighị ebi.
Don't arrange a peace treaty with them or help them out as long as you live.
7 Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha.
Don't look down on an Edomite, for they are your relatives. Don't look down on an Egyptian either, because you lived as foreigners in their country.
8 Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke Onyenwe anyị.
The third generation of their children are allowed to enter the Lord's sanctuary.
9 Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha.
When you are in an army camp during a war with your enemies, make sure you avoid anything wrong.
10 Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
Any man there who becomes unclean because of a release of semen must leave the camp and remain outside.
11 Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị.
Towards the end of the day he must wash himself with water, and at sunset he may return to the camp.
12 Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
Choose a place outside the camp to be used as a toilet.
13 Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ.
You need to have a spade as part of your equipment so that you can dig a hole, and then when you're finished you can cover up your excrement.
14 Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. Onyenwe anyị achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị.
The Lord your God is present with you in your camp to keep you safe and to defeat your enemies. Your camp must be kept holy, because if he sees anything unclean among you and he will leave you.
15 Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,
Don't send a slave back to their master if they have come to you for protection.
16 hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya.
Let the slave live in your country wherever they want, in whatever town they want. Don't mistreat them.
17 Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị.
No Israelite women or men are to be cult prostitutes.
18 Ị gaghị ewebata nʼụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
Don't bring into the house of the Lord your God any money from a prostitute, whether a woman or a man, using it to fulfill a promise to the Lord, for both are offensive to the Lord your God.
19 A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa.
Don't charge a fellow Israelite interest on money, food, or any other kind of loan.
20 Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta.
You may charge a foreigner interest, but not an Israelite, so that the Lord your God may bless you in everything you do in the country that you are going in to occupy.
21 Mgbe i kwere Onyenwe anyị bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya.
If you make a promise to the Lord your God, don't be slow in keeping it, because he will definitely demand that you fulfill it and you will be guilty of sin if you don't.
22 Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla!
If you don't make such promises then you won't be guilty of sin.
23 Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye Onyenwe anyị Chineke gị.
But make sure to carry out what you've said to the Lord your God, because it was you who freely chose to make such a promise.
24 Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị.
When you walk through your neighbor's vineyard, you can eat as many grapes as you want, but you must not collect any to take with you.
25 Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.
When you walk through your neighbor's grainfield, you may pick the ears of grain with your hand, but you must not use a sickle to harvest it.