< Diuteronomi 22 >

1 Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ atụrụ nwanna gị ka ọ na-akpafu, emela dịka a ga-asị na ị hụghị ya, jide ya, kpụlaara ya onye nwe ya.
In kun ga saniya ko tunkiyar ɗan’uwanku wadda ta ɓace, kada ku ƙyale ta, amma ku tabbata kun komar da ita gare shi.
2 Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya.
In ɗan’uwan ba ya zama kusa da ku, ko kuwa ba ku san shi ba, sai ku kai ta gida ku ajiye ta sai ya zo nemanta. Sa’an nan ku ba shi ita.
3 Otu a kwa ka ị ga-eme ma ị hụ ịnyịnya ibu nwanna gị, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla ị ga-atụtụta. Were ya debere onye nwe ya.
Ku yi haka in kun sami jakin ɗan’uwanku, ko rigarsa, ko kowane abin da ya ɓace. Kada ku ƙyale shi.
4 Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi nwanna gị ka ha dara nʼụzọ, elela anya nʼebe ọzọ, gaa nyere ya aka bulie ya.
In kuka ga jakin ɗan’uwanku, ko saniyarsa ya fāɗi a kan hanya, kada ku ƙyale shi. Ku taimaka, ku tā da shi.
5 Nwanyị ekwesighị iyi uwe ndị ikom, nwoke agaghị eyikwa uwe ndị inyom. Nʼihi na ihe arụ ka ọ bụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
Kada mace ta sa suturar maza, kada kuma namiji ya sa suturar mata, gama Ubangiji Allahnku yana ƙyamar duk mai yin haka.
6 Ọ bụrụ na ị hụ akwụ nnụnụ tọgbọ nʼala, maọbụ nke dị nʼelu osisi, ọ bụrụkwa na ọ bụ nnụnụ nke nọ nʼelu ụmụ ya, maọbụ nʼelu akwa ya, ewerela nne na ụmụ nnụnụ ya.
In kuka ga gidan tsuntsu kusa da hanya, ko a kan itace, ko kuma a ƙasa, mahaifiyar tsuntsun kuwa tana kwance a kan’ya’yanta, ko kuwa a kan ƙwanta, kada ku kama mahaifiyar duk da’ya’yan.
7 Hapụ nne nnụnụ ka ọ laa, ma were naanị ụmụ ya. Ihe ga-agakwara gị nke ọma nʼihi ya, ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
Za ku iya kwashe’ya’yan, amma ku tabbata kun bar mahaifiyar tă tafi. Yin haka zai sa ku sami zaman lafiya da tsawon rai.
8 Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.
Sa’ad da kuka gina sabon gida, ku ja masa dakali kewaye da rufinku don kada ku jawo laifin zub da jini a kan gidanku in wani ya fāɗi daga kan rufin.
9 Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ.
Kada ku shuka iri biyu a gonar inabinku; in kuka yi haka, ba abin da kuka shuka ne kaɗai zai ƙazantu ba, amma har da inabinku ma.
10 Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.
Kada ku haɗa bijimi da jaki su yi noma tare.
11 Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa.
Kada ku sa rigar ulu da aka gauraye da lilin aka saƙa.
12 Ị ga-akpanyere onwe gị ihe ogho akpara akpa, nʼakụkụ anọ nke uwe mgbokwasị gị.
Ku yi tuntu a kusurwan huɗu na rigar da kuke sa.
13 Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaagbọghọ, mesie mgbe o dinakwuru ya kpebie nʼobi ya na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ,
In mutum ya auri mace, bayan ya kwana da ita, sa’an nan ya ƙi ta
14 ọ bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ,
ya kuma zarge ta, ya ba ta mummunan suna, yana cewa, “Na auri wannan mata, amma sa’ad da na kusace ta, ban sami tabbaci cewa ita budurwa ba ce,”
15 nne nwaagbọghọ ahụ, na nna ya, ga-ewere ihe ga-egosi na nwa ha amabeghị nwoke gaa nʼihu ndị okenye obodo ahụ, nʼọnụ ụzọ ama.
sai mahaifin yarinyar da mahaifiyarta su kawo shaida cewa ita budurwa ce wa dattawan gari a ƙofar garin.
16 Nna nwaagbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye, “Enyere m nwoke a nwa m nwanyị dịka nwunye, ma ugbu a, ọ chọkwaghị ịlụ ya.
Mahaifin yarinyar zai ce wa dattawa, “Na ba da’yata aure ga wannan mutum, amma ya ƙi ta.
17 Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ.
Yanzu ya zage ta cewa, ‘Ban sami’yarku budurwa ba.’ Amma ga shaidar budurcin’yata.” Sa’an nan iyayenta za su shimfiɗa zanen a gaban dattawan garin,
18 Ndị okenye obodo ahụ ga-akpọrọ nwoke nyekwa ya ahụhụ.
dattawan kuwa za su ɗauki mutumin su hukunta shi.
19 Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile.
Za su ci masa tara shekel azurfa ɗari, su ba mahaifin yarinyar, domin wannan mutum ya ba wa budurwa mutuniyar Isra’ila mummunan suna. Za tă ci gaba da zama matarsa; ba kuwa zai sake ta ba muddin ransa.
20 Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke.
Amma fa in zarge gaskiya ne, ba a kuwa sami shaidar budurcin yarinyar ba,
21 A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.
sai a kawo ta a ƙofar gidan mahaifinta, a can mazan gari za su jajjefe ta da dutse har tă mutu. Ta yi abin kunya a Isra’ila ta wurin lalaci a yayinda take a gidan mahaifinta. Dole ku fid da mugu daga cikinku.
22 Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.
In aka kama wani yana kwance da matar wani, dole a kashe dukansu biyu, wato, mutumin da ya kwana da matar da kuma matar. Dole a fid da mugu daga Isra’ila.
23 Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo,
In mutum ya sadu da budurwa a gari wadda aka yi alkawarin aure, ya kuma kwana da ita
24 ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.
sai ku ɗauki su biyu zuwa ƙofar wannan gari, ku jajjefe su da dutse har su mutum, za a kashe yarinyar domin tana a cikin gari ba ta kuwa yi ihu neman taimako ba, za a kashe mutumin domin ya yi lalata da matar wani. Dole ku fi da mugu daga cikinku.
25 Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ.
Amma in a bayan gari ne mutumin ya sadu da yarinyar da aka yi alkawari aure, ya kuma yi mata fyaɗe, mutumin da ya yi wannan ne kaɗai zai mutu.
26 Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya.
Kada ku yi wa yarinyar kome, ba tă yi zunubin da ya cancanci mutuwa ba. Wannan batu ya yi kamar da na mutumin da ya fāɗa wa maƙwabcinsa ya kuma kashe shi.
27 A pụrụ ị sị na nwaagbọghọ ahụ tiri mkpu ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.
Tun da ya same ta a jeji ne, wataƙila yarinyar ta yi kukan neman taimako, amma babu wani da zai cece ta.
28 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri ike jide nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-ekwebeghị nkwa ịlụ, mee ka ha abụọ dinaa,
In mutum ya sadu da yarinyar da ba a yi alkawarin aurenta ba, ya kuma yi mata fyaɗe, aka kuma kama su,
29 nwoke ahụ ga-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ iri shekel ọlaọcha ise. Ọ ga-alụkwa nwaagbọghọ ahụ nʼihi na o mebiela ya. Ọ gakwaghị achụpụ ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
sai yă biya mahaifin yarinyar shekel hamsin na azurfa. Dole yă auri yarinyar, gama ya yi lalata da ita. Ba zai taɓa sake ta ba muddin ransa.
30 Nwoke ọbụla agaghị alụ nwunye nna ya, nʼihi na ọ bụ nwunye nna ya. Ime ihe dị otu a bụ imerụ ihe ndina nna ya.
Kada mutum yă auri matar mahaifinsa, kada yă ƙasƙantar gādon mahaifinsa.

< Diuteronomi 22 >