< Diuteronomi 21 >

1 Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, biri nʼime ya, ọ bụrụ na ị hụ otu onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ nʼime ọhịa, ma ị maghị onye gburu ya,
If one be found slain in the land which the LORD your God gives you to possess it, lying in the field, and it be not known who has slain him:
2 ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.
Then your elders and your judges shall come forth, and they shall measure to the cities which are round about him that is slain:
3 Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla
And it shall be, that the city which is next to the slain man, even the elders of that city shall take an heifer, which has not been worked with, and which has not drawn in the yoke;
4 ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ.
And the elders of that city shall bring down the heifer to a rough valley, which is neither eared nor sown, and shall strike off the heifer’s neck there in the valley:
5 Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ.
And the priests the sons of Levi shall come near; for them the LORD your God has chosen to minister to him, and to bless in the name of the LORD; and by their word shall every controversy and every stroke be tried:
6 Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ, nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ.
And all the elders of that city, that are next to the slain man, shall wash their hands over the heifer that is beheaded in the valley:
7 Ha ga-ekwupụta sị, “Aka anyị dị ọcha, ọ bụghị anyị gburu nwoke a, anyị amakwaghị onye gburu ya.
And they shall answer and say, Our hands have not shed this blood, neither have our eyes seen it.
8 Onyenwe anyị, kpuchiere ndị gị Izrel mmehie ha, bụ ndị gị ị gbapụtara. Agụla ndị gị dịka ndị ikpe mara nʼihi ọnwụ nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ.” Otu a ka a ga-esi kpuchie mmehie nʼihi mwụfu ọbara ahụ.
Be merciful, O LORD, to your people Israel, whom you have redeemed, and lay not innocent blood to your people of Israel’s charge. And the blood shall be forgiven them.
9 Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
So shall you put away the guilt of innocent blood from among you, when you shall do that which is right in the sight of the LORD.
10 Mgbe ị pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka i merie ndị iro gị, dọta ụfọdụ nʼime ha nʼagha,
When you go forth to war against your enemies, and the LORD your God has delivered them into your hands, and you have taken them captive,
11 ọ bụrụ na ị hụ nwaagbọghọ mara mma nke masịrị gị nʼetiti ndị a dọtara nʼagha, i nwere ike iduru ya ka ọ bụrụ nwunye gị.
And see among the captives a beautiful woman, and have a desire to her, that you would have her to your wife;
12 Ị ga-akpọbata ya nʼụlọ gị, mee ka ọ kpụcha agịrị isi ya, bekwaa mbọ ya niile,
Then you shall bring her home to your house, and she shall shave her head, and pare her nails;
13 yipụ uwe ahụ o yi mgbe e jidere ya. Ọ ga-anọdụ nʼụlọ gị ruo ụjụ nʼihi nna ya na nne ya otu ọnwa. Emesịa, i nwere ike ịbakwuru ya ghọọ di ya, ya onwe ya ga-aghọkwa nwunye gị.
And she shall put the raiment of her captivity from off her, and shall remain in your house, and mourn her father and her mother a full month: and after that you shall go in to her, and be her husband, and she shall be your wife.
14 Ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-ahapụ ya ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Ị gaghị ere ya nʼọnụ ego ọbụla maọbụ kpasi ya agwa dịka ohu, ebe ọ bụ na ị wedala ya nʼala site nʼịhụ ọtọ ya anya.
And it shall be, if you have no delight in her, then you shall let her go where she will; but you shall not sell her at all for money, you shall not make merchandise of her, because you have humbled her.
15 Ọ bụrụ na nwoke lụrụ ndị inyom abụọ, ma hụ otu nʼime ha nʼanya karịa nke ọzọ, ọ bụrụkwa na ndị inyom abụọ ahụ mụtaara ya ụmụ ndị ikom, ma nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị buuru ụzọ mụta nwa nwoke,
If a man have two wives, one beloved, and another hated, and they have born him children, both the beloved and the hated; and if the firstborn son be hers that was hated:
16 mgbe nwoke ahụ na-eke ihe onwunwe ya, ọ gaghị ewere oke ruuru ọkpara ya, nke nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị mụtara kenye nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ hụrụ nʼanya mụrụ.
Then it shall be, when he makes his sons to inherit that which he has, that he may not make the son of the beloved firstborn before the son of the hated, which is indeed the firstborn:
17 Ọ ga-anabata nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ na-ahụghị nʼanya mụtara dị ka ọkpara, nye ya, oke abụọ site nʼihe niile o nwere. Nʼihi na nwoke ahụ bụ mmalite ume ya, ọnọdụ nke ị bụ ọkpara bụkwa nke ya.
But he shall acknowledge the son of the hated for the firstborn, by giving him a double portion of all that he has: for he is the beginning of his strength; the right of the firstborn is his.
18 Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị.
If a man have a stubborn and rebellious son, which will not obey the voice of his father, or the voice of his mother, and that, when they have chastened him, will not listen to them:
19 Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha.
Then shall his father and his mother lay hold on him, and bring him out to the elders of his city, and to the gate of his place;
20 Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, “Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke.”
And they shall say to the elders of his city, This our son is stubborn and rebellious, he will not obey our voice; he is a glutton, and a drunkard.
21 Ndị ikom niile nke obodo ahụ ga-ewere nkume tugbuo ya. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ ahụ nʼetiti unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe mere, ụjọ ga-atụkwa ha.
And all the men of his city shall stone him with stones, that he die: so shall you put evil away from among you; and all Israel shall hear, and fear.
22 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla emee ihe ọjọọ kwesiri ọnwụ, ọ bụrụ na e kpee ya ikpe ọnwụ, kwụgbuo ya nʼosisi,
And if a man have committed a sin worthy of death, and he be to be put to death, and you hang him on a tree:
23 unu agaghị ahapụ ozu ya ka ọ dịgide nʼelu osisi abalị ahụ niile. Hụnụ na e liri ya nʼotu ụbọchị ahụ, nʼihi na onye ọbụla a kwụbara nʼelu osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ. Emerụla ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
His body shall not remain all night on the tree, but you shall in any wise bury him that day; (for he that is hanged is accursed of God; ) that your land be not defiled, which the LORD your God gives you for an inheritance.

< Diuteronomi 21 >