< Diuteronomi 20 >
1 Mgbe i pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na i lee anya hụ na ndị iro gị nwere ọtụtụ ịnyịnya, ụgbọ agha na ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa gị, unu atụla egwu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị, onye ahụ mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼudo, nọnyeere gị.
Nígbà tí o bá lọ sí ogun pẹ̀lú ọ̀tá rẹ, tí o sì rí ẹṣin àti àwọn kẹ̀kẹ́ ogun àti ológun tí ó jù ọ́ lọ, má ṣe bẹ̀rù u wọn, nítorí Olúwa Ọlọ́run rẹ tí ń mú ọ jáde wá láti ilẹ̀ Ejibiti, yóò wà pẹ̀lú rẹ.
2 Tupu agha ebido, otu onye nchụaja ga-eguzo nʼihu ndị agha Izrel gwa ha okwu sị,
Nígbà tí o bá fẹ́ lọ jagun, àlùfáà yóò wá síwájú, yóò sì bá ọmọ-ogun sọ̀rọ̀,
3 “Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba.
yóò sì wí pé, “Gbọ́, ìwọ Israẹli, lónìí ò ń jáde lọ sójú ogun sí ọ̀tá rẹ. Ẹ má ṣe jẹ́ kí ọkàn yín ṣojo tàbí bẹ̀rù; ẹ má ṣe jáyà tàbí kí ẹ fi ààyè fún ìjayà níwájú u wọn.
4 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri.”
Nítorí Olúwa Ọlọ́run yín ní bá yín lọ, láti bá àwọn ọ̀tá yín jà fún yín, láti gbà yín là.”
5 Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!
Àwọn olórí ogun yóò sì wí fún àwọn ènìyàn pé, “Ẹnikẹ́ni tí ó kọ́ ilé tuntun tí kò sì tì ì yà á sọ́tọ̀? Jẹ́ kí ó lọ ilé, tàbí ó lè kú sójú ogun kí ẹlòmíràn sì gbà á.
6 Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya!
Ǹjẹ́ ẹnikẹ́ni tí ó gbin ọgbà àjàrà kan tí kò sì tí ì bẹ̀rẹ̀ sí ń gbádùn rẹ̀? Jẹ́ kí ó lọ ilé, tàbí kí ó kú sójú ogun kí ẹlòmíràn sì gbádùn rẹ̀.
7 Ọ dị nwoke nwere nwaagbọghọ o kwere nkwa na ọ ga-alụ? Ya laa, gaa lụọ nwanyị! Nʼihi na ọ bụrụ na ọ nwụọ nʼagha, nwoke ọzọ ga-alụ ya.”
Ǹjẹ́ ẹnikẹ́ni tí ó wá ògo obìnrin kan tí kò ì tí ì fẹ́ ẹ? Jẹ́ kí ó lọ ilé, tàbí kí ó kú sójú ogun kí ẹlòmíràn sì fẹ́ ẹ.”
8 Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ahụ ga-ekwukwa sị, “Ọ dị onye egwu na-atụ? Ọ bụrụ na o nwere onye ụjọ na-atụ, ya laghachi nʼụlọ ya ka ịtụ ụjọ ya hapụ ijide ndị ọzọ.”
Nígbà náà ni olórí yóò tún fi kún un pé, “Ǹjẹ́ ọkùnrin kankan ń bẹ̀rù tàbí páyà? Jẹ́ kí ó lọ ilé nítorí kí arákùnrin rẹ̀ má ba à wá tún dáyà fò ó.”
9 Mgbe ndịisi agha gwachara ndị agha ha okwu ndị a, ha ga-ahọpụta ndịisi ga-achịkọta usuu ndị agha.
Nígbà tí olórí ogun bá ti dákẹ́ ọ̀rọ̀ sísọ sí àwọn ènìyàn, wọn yóò yan olórí ogun lórí i rẹ̀.
10 Mgbe ị bịaruru obodo ọbụla nso ibuso ya agha, ị ga-ebu ụzọ kpọọ ndị bi nʼime ya oku, maka ime udo.
Nígbà tí ó bá súnmọ́ iwájú láti dojúkọ ìlú kan láti bá a jà, nígbà náà ni kí ó fi àlàáfíà lọ̀ ọ́.
11 Ọ bụrụ na ha anabata ime udo, megheere gị ọnụ ụzọ ama ha, ndị niile bi nʼime obodo ahụ ga-abụrụ gị ndị ọrụ na-agbakwara gị odibo.
Tí wọ́n bá dá ọ lóhùn àlàáfíà, tí wọ́n sì ṣí ìlẹ̀kùn, gbogbo àwọn tó wà níbẹ̀ yóò máa jẹ́ olùsìn fún ọ, wọn ó sì máa sìn ọ́.
12 Ma ọ bụrụ na ha ekweghị ime udo, lụso gị agha, mgbe ahụ, ndị agha gị ga-agba ya gburugburu.
Tí wọ́n bá kọ̀ láti bá ọ ṣe àlàáfíà ṣùgbọ́n tí wọ́n bá gbóguntì ọ́, nígbà náà ni kí ìwọ gbà á.
13 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị nyefere gị ya nʼaka, were mma agha gbuo nwoke ọbụla nọ nʼime ya.
Nígbà tí Olúwa Ọlọ́run rẹ bá fi lé ọ lọ́wọ́, kí ẹ̀yin kí ó fi ojú idà pa gbogbo àwọn ọkùnrin tí ó wà níbẹ̀.
14 Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma.
Ní ti obìnrin, àwọn ọmọdé, ohun ọ̀sìn àti gbogbo ohun tí ó kù nínú ìlú náà, o lè mú ìwọ̀nyí gẹ́gẹ́ bí ìkógun fún ara rẹ. O sì lè lo ìkógun tí Olúwa Ọlọ́run rẹ fi fún ọ láti ọ̀dọ̀ àwọn ọ̀tá rẹ.
15 Iwu ndị a metụtara naanị mmeso ị ga-emeso obodo ndị tere anya. O metụtaghị obodo ndị na-adịghị nʼime mba ndị a dị nso.
Báyìí ni ìwọ yóò ṣe sí gbogbo ìlú tí wọ́n wà ní ọ̀nà jíjìn sí ọ tí wọn kò sì tara àwọn orílẹ̀-èdè tí ó wà lẹ́gbẹ̀ẹ́ ẹ̀ rẹ.
16 Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi.
Ṣùgbọ́n, nínú àwọn ìlú ti àwọn orílẹ̀-èdè tí Olúwa Ọlọ́run rẹ ń fún ọ gẹ́gẹ́ bí ogún, má ṣe dá ohun ẹlẹ́mìí kankan sí.
17 Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.
Pa wọ́n run pátápátá, àwọn ọmọ Hiti, ọmọ Amori, ọmọ Kenaani, ọmọ Peresi, ọmọ Hifi, ọmọ Jebusi gẹ́gẹ́ bí Olúwa Ọlọ́run rẹ ti pa á láṣẹ fún ọ.
18 Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị.
Bí kò ṣe bẹ́ẹ̀, wọn yóò kọ́ ọ láti tẹ̀lé gbogbo ohun ìríra tí wọ́n ń ṣe nínú sí sin àwọn ọlọ́run wọn, ìwọ yóò sì ṣẹ̀ sí Olúwa Ọlọ́run rẹ.
19 Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha?
Nígbà tí o bá dó ti ìlú kan láti ọjọ́ pípẹ́, ẹ bá wọn jà láti gbà á, má ṣe pa àwọn igi ibẹ̀ run nípa gbígbé àáké lé wọn, nítorí o lè jẹ èso wọn. Má ṣe gé wọn lulẹ̀. Nítorí igi igbó ha á ṣe ènìyàn bí, tí ìwọ ó máa dó tì rẹ̀.
20 Naanị osisi na-adịghị amị mkpụrụ ka ị ga-egbutu, nke a na-adịghị eri mkpụrụ ya eri. Jiri ha meere onwe gị ngwa ọgụ, dịka ubibi, na nkwasa, na ihe unu ji etitu mgbidi obodo ahụ.
Ṣùgbọ́n ìwọ lè gé àwọn igi tí o mọ̀ pé wọn kì í ṣe igi eléso lulẹ̀ kí o sì lò wọ́n láti kọ́ ìṣọ́ sí ìlú tí ó ń bá ọ jagun, títí tí yóò fi ṣubú.