< Diuteronomi 20 >
1 Mgbe i pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na i lee anya hụ na ndị iro gị nwere ọtụtụ ịnyịnya, ụgbọ agha na ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa gị, unu atụla egwu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị, onye ahụ mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼudo, nọnyeere gị.
當你出征進攻你的仇敵,見到戰馬戰車和比你更多的群眾時,你不必害怕,因為領你出埃及地的上主你的天主與你在一起。
2 Tupu agha ebido, otu onye nchụaja ga-eguzo nʼihu ndị agha Izrel gwa ha okwu sị,
當你們快要交戰時,司祭應上前來,對民眾訓話,
3 “Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba.
向他們說:「以色列,請聽! 你們今天就要上陣攻打你們的仇敵,你們不要灰心,不要害怕,不要恐慌,不要在他們面前戰慄,
4 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri.”
因為上主你們的天主與你們同去,幫助你們攻打你們的仇敵,使你們勝利。」
5 Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!
然後長官對民眾說:「誰若蓋了新房屋,還沒有祝聖,他可回家去,免得他死在戰場,別人來替他祝聖。
6 Ọ dị nwoke ọbụla kụrụ ubi vaịnị ọhụrụ nke ọ na-esitebeghị nʼime ya ghọọ mkpụrụ ọbụla? Ya laa, ka ọ ghara ịnwụ nʼagha, hapụrụ ya onye ọzọ nke ga-eri mkpụrụ si na ya!
誰若栽種了葡萄園,還沒有享用過,他可回家去,免得他死在戰場,別人來替他收穫。
7 Ọ dị nwoke nwere nwaagbọghọ o kwere nkwa na ọ ga-alụ? Ya laa, gaa lụọ nwanyị! Nʼihi na ọ bụrụ na ọ nwụọ nʼagha, nwoke ọzọ ga-alụ ya.”
誰若與女人訂了婚,還沒有迎娶,他可回家去,免得他死在戰場,別人來娶她。」
8 Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ahụ ga-ekwukwa sị, “Ọ dị onye egwu na-atụ? Ọ bụrụ na o nwere onye ụjọ na-atụ, ya laghachi nʼụlọ ya ka ịtụ ụjọ ya hapụ ijide ndị ọzọ.”
長官再繼續對民眾致辭說:「誰若害怕灰心,他可回家去,免得他使兄弟的心,如他的一樣沮喪。」
9 Mgbe ndịisi agha gwachara ndị agha ha okwu ndị a, ha ga-ahọpụta ndịisi ga-achịkọta usuu ndị agha.
長官向民眾訓完話,就派定軍官統率部隊。
10 Mgbe ị bịaruru obodo ọbụla nso ibuso ya agha, ị ga-ebu ụzọ kpọọ ndị bi nʼime ya oku, maka ime udo.
當你臨近一城要進攻時,應先向那城提議和平;
11 Ọ bụrụ na ha anabata ime udo, megheere gị ọnụ ụzọ ama ha, ndị niile bi nʼime obodo ahụ ga-abụrụ gị ndị ọrụ na-agbakwara gị odibo.
若那地給你和平的答覆,給你開門,城內所有的人民就臣服於你,給你服役。
12 Ma ọ bụrụ na ha ekweghị ime udo, lụso gị agha, mgbe ahụ, ndị agha gị ga-agba ya gburugburu.
如不與你講和,反願與你作戰,你就圍攻。
13 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị nyefere gị ya nʼaka, were mma agha gbuo nwoke ọbụla nọ nʼime ya.
幾時上主你的天主將城交在你手中,你應用利刃殺盡所有的男人;
14 Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma.
至於婦女、嬰兒、牲畜和在城內所有的一切,算是你奪得的勝利品,你可享用你由仇人奪得的勝利品,因為是上主你的天主賜給你的。
15 Iwu ndị a metụtara naanị mmeso ị ga-emeso obodo ndị tere anya. O metụtaghị obodo ndị na-adịghị nʼime mba ndị a dị nso.
這是你對於離你很遠,且不屬於這些民族的城市的作法。
16 Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi.
但是在上主你的天主賜給你作產業的這些人民的城市內,你不可讓任何生靈生活,
17 Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.
應將他們:即赫特人、阿摩黎人。客納罕人、培黎齊人、希威人和耶步斯人,盡行毀滅,如上主你的天主吩咐你的,
18 Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị.
免得他們教你學習他們對自己的神所行的一切可惡之事,使你們得罪上主你們的天主。
19 Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha?
若你圍攻一座城,需要多日纔能攻取佔領,你不可用斧頭砍伐那裏的樹木;你可以吃樹上的果子,卻不可砍倒樹;難道田間的樹可當作你圍攻的敵人看待﹖
20 Naanị osisi na-adịghị amị mkpụrụ ka ị ga-egbutu, nke a na-adịghị eri mkpụrụ ya eri. Jiri ha meere onwe gị ngwa ọgụ, dịka ubibi, na nkwasa, na ihe unu ji etitu mgbidi obodo ahụ.
只是那些你不知道不結實的樹木,你可毀壞砍伐,用來建築圍攻的設備,為進攻與你交戰的城市,直到將城攻下。