< Diuteronomi 2 >

1 Anyị laghachiri azụ chee ihu nʼọzara nʼụzọ gawara Osimiri Uhie, dịka Onyenwe anyị gwara m. Ọtụtụ afọ ka anyị nọ na-awagharị gburugburu ugwu Sia.
Zvino takadzoka tikafamba takananga kurenje nenzira inoenda kuGungwa Dzvuku, sezvandakanga ndarayirwa naJehovha. Kwenguva yakareba takafamba nenzira yaipoterera nenyika yamakomo yeSeiri.
2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m,
Ipapo Jehovha akati kwandiri,
3 “Unu agbaala ala ugwu ugwu a gburugburu ogologo oge, cheenụ ihu nʼakụkụ ugwu.
“Mafamba nenzira yokupoterera nyika iyi yamakomo kwenguva yakakwana, zvino chidzokai muende nechokumusoro.
4 Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya.
Rayira vanhu uti, ‘Mava pedyo kuti mupfuure nomunyika yehama dzenyu zvizvarwa zvaEsau, vagere paSeiri. Ivo vachakutyai, asi muchenjere kwazvo.
5 Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.
Musavatanga kuti murwe, handingakupei chikamu chipi zvacho chenyika yavo, kunyange pangakwana kuisa rutsoka rwenyu. Ndakapa Esau nyika yamakomo yeSeiri kuti ive yake.
6 Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’”
Munofanira kuvaripa nesirivha zvokudya zvamuchadya nemvura yamuchanwa.’”
7 Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu.
Jehovha Mwari wenyu akakuropafadzai pamabasa ose amaoko enyu. Akakutarirai parwendo rwenyu murenje iri guru. Jehovha Mwari wenyu akava nemi, makore makumi mana aya, uye hapana chinhu chamakashayiwa.
8 Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.
Naizvozvo takapfuura hama dzedu zvizvarwa zvaEsau, vanogara muSeiri. Takasiya nzira inoenda kuArabha, yeArabha, inobva kuErati neEzioni Gebheri, ndokufamba nenzira yomurenje reMoabhu.
9 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”
Ipapo Jehovha akataura kwandiri, akati, “Musafurusa vaMoabhu kana kuvadenha, nokuti handizokupai chikamu chipi zvacho chenyika yavo. Ndakapa Ari kuzvizvarwa zvaRoti kuti ive yavo.”
10 (Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak.
(VaEmi vaisigarako vaiva vanhu vakasimba, vakawanda uye vakareba savaAnaki.
11 A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.
SavaAnaki ivowo vaionekwa savaRefaimu, asi vaMoabhu vaivadana nezita rokuti vaEmi.
12 Ma mgbe gara aga ọ bụ ndị Hor bi na Sia, ma ndị Edọm, ụmụ Ịsọ, chụpụrụ ha. Ha bibiri ndị Hor bichikwaa ala ha, dịka ụmụ Izrel si bichie nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha dịka ihe nketa.)
VaHori vaimbogarawo muSeiri, asi vana vaEsau vakavadzinga kubva imomo. Vakaparadza vaHori vakanga varimo ivo vasati vavamo vakagara munzvimbo yavo, sezvakangoitawo Israeri munyika yavakapiwa naJehovha kuti ive yavo).
13 Onyenwe anyị gwara anyị okwu sị, “Ugbu a bilienụ, gafee Ndagwurugwu Zered.” Anyị bilikwara gafee.
Uye Jehovha akati, “Zvino chisimukai muyambuke Mupata weZeredhi.” Saka takayambuka mupata.
14 Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị ṅụrụ ha nʼiyi.
Makore makumi matatu namasere akanga apfuura kubva panguva yatakabva paKadheshi Bharinea kusvikira patakazoyambuka Mupata weZeredhi. Panguva iyoyi chizvarwa chose chavarume vezera rokurwa chakanga chaparara kubva pamisasa, sezvakanga zvapikirwa naJehovha kwavari.
15 E, aka Onyenwe anyị dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ.
Ruoko rwaJehovha rwakaramba ruchivarwisa kusvikira rwavaparadza zvachose.
16 Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara,
Zvino wokupedzisira pakati pavarume ava vokurwa akati afa,
17 Onyenwe anyị sịrị m,
Jehovha akati kwandiri,
18 “Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.
“Nhasi unofanira kupfuura nomunyika yeMoabhu, paAri.
19 Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.”
Kana woswedera pedyo navaAmoni, usavafurusa kana kuvadenha kuti murwisane, nokuti handingakupei kuti mutore nyika ipi zvayo yavaAmori. Ndakaipa kuti ive yezvizvarwa zvaRoti.”
20 Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum.
(Naiyowo yainzi inyika yevaRafaimu, vaisimbogaramo; asi vaAmoni vaivadaidza kuti vaZamuzumi.
21 Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha.
Vaiva vanhu vakasimba, vakawanda, uye vakareba savaAnaki. Jehovha akavaparadza pamberi pavaAmoni, avo vakavadzinga ndokugara munzvimbo yavo.
22 Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa.
Jehovha akanga aitira zvimwe chetezvo kuzvizvarwa zvaEsau, vaigara muSeiri, paakaparadza vaHori pamberi pavo. Vakavadzinga ndokugara munzvimbo yavo kusvikira nhasi.
23 Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.
Uye kana vari vaAvhi vakanga vagere mumisha kusvikira kuGaza, vaKafitori vaibva Kafitori vakavaparadza ndokugara munzvimbo yavo.)
24 Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu.
Budai zvino muende, muyambuke mupata weArinoni. Tarirai ndakaisa muruoko rwenyu Sihoni muAmori, mambo weHeshibhoni, nenyika yake. Tangai kuitora mugorwa naye.
25 Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.”
Nhasi chaiye ndichatanga kuvhundutsa nokutyisa ndudzi dzose dziri pasi pedenga nokuda kwenyu. Ivo vachanzwa guhu pamusoro penyu vagodedera nokutya kwazvo pamusoro penyu.
26 Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị,
Ndakatuma nhume kubva murenje reKedhemoti kuna Sihoni mambo weHeshibhoni ndichikumbira rugare, uye ndikati,
27 “Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
“Titenderei kuti tipfuure nomunyika yenyu. Tichafamba nemugwagwa mukuru; hatizotsauki kurudyi kana kuruboshwe.
28 Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala,
Mutitengesere zvokudya nemvura yokunwa nomutengo wazvo wesirivha. Chingotitenderai henyu kuti tipfuure netsoka,
29 dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
sezvatakaitirwa nezvizvarwa zvaEsau vagere muSeiri, nevaMoabhu vagere muAri. Kusvikira tayambuka Jorodhani tichipinda munyika iyo yatinopiwa naJehovha Mwari wedu.”
30 Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a.
Asi Sihoni mambo weHeshibhoni akaramba kutitendera kuti tipfuure nomo. Nokuti Jehovha Mwari wenyu akanga aomesa mweya wake uye akanga arambidza mwoyo wake, kuti agomuisa mumaoko enyu, sezvaaita iye zvino.
31 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.”
Jehovha akati kwandiri, “Tarira ndatanga kuisa Sihoni nenyika yake kwauri. Zvino chitanga kuikunda ugotora nyika yake.”
32 Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz,
Sihoni nehondo yake yose akati auya kuzorwa nesu paJahazi,
33 Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile.
Jehovha Mwari wedu akamuisa kwatiri uye takamuparadza, iye pamwe chete navanakomana vake nehondo yake yose.
34 Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ.
Panguva iyoyo takatora maguta ake ose tikaaparadza chose, varume navakadzi uye navana. Hapana watakasiya ari mupenyu.
35 Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata.
Asi zvipfuwo nezvatakapamba kubva mumaguta takazvitora kuti zvive zvedu.
36 Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị.
Kubva paAroeri pamahombekombe oMupata weArinoni, nokubva kuguta rokumupata, kunyange kusvikira kuGireadhi, hakuna kumbova kana neguta rimwe chete rakatikunda. Jehovha Mwari wedu akatipa vose.
37 Ma dịka usoro iwu Onyenwe anyị Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.
Asi maererano nokurayira kwaJehovha Mwari wedu hamuna kuswedera kunyika ipi zvayo yavaAmoni, kunyange kunyika iri kurutivi rweJabhoki kana kunyika yakapoteredza maguta ari mumakomo.

< Diuteronomi 2 >