< Diuteronomi 19 >

1 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile,
When the LORD your God has cut off the nations, whose land the LORD your God gives you, and you succeed them, and dwell in their cities, and in their houses;
2 mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche.
You shall separate three cities for you in the middle of your land, which the LORD your God gives you to possess it.
3 Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.
You shall prepare you a way, and divide the coasts of your land, which the LORD your God gives you to inherit, into three parts, that every slayer may flee thither.
4 Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.
And this is the case of the slayer, which shall flee thither, that he may live: Whoever kills his neighbor ignorantly, whom he hated not in time past;
5 Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya.
As when a man goes into the wood with his neighbor to hew wood, and his hand fetches a stroke with the ax to cut down the tree, and the head slips from the helve, and lights on his neighbor, that he die; he shall flee to one of those cities, and live:
6 Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.
Lest the avenger of the blood pursue the slayer, while his heart is hot, and overtake him, because the way is long, and slay him; whereas he was not worthy of death, inasmuch as he hated him not in time past.
7 Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ.
Why I command you, saying, You shall separate three cities for you.
8 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa,
And if the LORD your God enlarge your coast, as he has sworn to your fathers, and give you all the land which he promised to give to your fathers;
9 nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ.
If you shall keep all these commandments to do them, which I command you this day, to love the LORD your God, and to walk ever in his ways; then shall you add three cities more for you, beside these three:
10 Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
That innocent blood be not shed in your land, which the LORD your God gives you for an inheritance, and so blood be on you.
11 Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a,
But if any man hate his neighbor, and lie in wait for him, and rise up against him, and smite him mortally that he die, and flees into one of these cities:
12 ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya.
Then the elders of his city shall send and fetch him there, and deliver him into the hand of the avenger of blood, that he may die.
13 Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma.
Your eye shall not pity him, but you shall put away the guilt of innocent blood from Israel, that it may go well with you.
14 Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta.
You shall not remove your neighbor’s landmark, which they of old time have set in your inheritance, which you shall inherit in the land that the LORD your God gives you to possess it.
15 Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe.
One witness shall not rise up against a man for any iniquity, or for any sin, in any sin that he sins: at the mouth of two witnesses, or at the mouth of three witnesses, shall the matter be established.
16 Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha,
If a false witness rise up against any man to testify against him that which is wrong;
17 a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ.
Then both the men, between whom the controversy is, shall stand before the LORD, before the priests and the judges, which shall be in those days;
18 Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha,
And the judges shall make diligent inquisition: and, behold, if the witness be a false witness, and has testified falsely against his brother;
19 ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị.
Then shall you do to him, as he had thought to have done to his brother: so shall you put the evil away from among you.
20 Ndị niile nụrụ ya ga-atụ egwu, ha agaghị emekwa ihe ọjọọ dị otu ahụ ọzọ.
And those which remain shall hear, and fear, and shall from now on commit no more any such evil among you.
21 Emekwala ebere ọbụla. Ndụ laara ndụ, anya laara anya, eze laara eze, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.
And your eye shall not pity; but life shall go for life, eye for eye, tooth for tooth, hand for hand, foot for foot.

< Diuteronomi 19 >