< Diuteronomi 17 >
1 Achụrụla Onyenwe anyị bụ Chineke gị ehi maọbụ atụrụ nwere nkwarụ ọbụla maọbụ ntụpọ. Onyinye dị otu a bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
Musabayira Jehovha Mwari wenyu mombe kana gwai rine chakaipa pariri kana rakaremara, nokuti izvozvo zvinomunyangadza.
2 Ọ bụrụ na ị nụ na onye ọbụla nʼime obodo ndị ahụ Onyenwe anyị nyere gị, nwoke maọbụ nwanyị na-eme ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị ime ihe megidere ọgbụgba ndụ ya,
Kana pakati penyu mune rimwe ramaguta amuri kupiwa naJehovha pakawanikwa murume kana mukadzi achiita zvakaipa pamberi paJehovha Mwari wenyu, achiputsa sungano,
3 ọ bụrụ na onye ahụ efee chi ndị ọzọ, maọbụ kpọọ isiala nye ha, maọbụ fee anwụ, maọbụ ọnwa, maọbụ kpakpando nke mbara eluigwe bụ ihe m na-enyeghị nʼiwu,
uye akapesana nomurayiro wangu anamata vamwe vamwari, achivapfugamira kana kupfugamira zuva kana mwedzi kana nyeredzi dzokudenga,
4 ọ bụrụ na e mere ka ị maara nʼihe dị otu a dị maọbụ ị nụ ya, ị ghaghị ịjụ ase, nyochaa ya nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ị nụrụ bụ eziokwu, ọ bụrụ nʼezie na e mere ihe arụ dị otu a nʼala Izrel,
uye izvi zvaziviswa kwamuri, ipapo munofanira kunyatsozvibvunzisisa kwazvo. Kana chiri chokwadi uye zvanyatsoonekwa kuti chinhu ichi chinonyangadza chakaitwa muIsraeri,
5 kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya.
torai murume uyu kana mukadzi uyu akaita chinhu ichi chakaipa muende naye kusuo reguta renyu mugomutaka namabwe afe.
6 Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara.
Nokupupura kwezvapupu zviviri kana zvitatu munhu achaurayiwa, asi hapana munhu anofanira kuurayiwa nokupupura kwechapupu chimwe chete.
7 Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
Maoko ezvapupu ndiwo anofanira kutanga pakumuuraya, zvino pashure maoko avanhu vose. Munofanira kubvisa chakaipa pakati penyu.
8 Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,
Kana mhaka dzikauya kumatare enyu dzakanyanya kukuomerai kuti mutonge, dzingava dzokudeurwa kweropa, dzokuendesana kumatare kana dzokurwa, endai nadzo kunzvimbo iyo Jehovha Mwari wenyu achasarudza.
9 nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.
Endai kuvaprista, vanova vaRevhi uye kuvatongi vanenge vachitonga panguva iyoyo. Muvabvunze uye ivo vachakuudzai mutongo wakafanira.
10 Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka.
Muite sezvavanenge vakutongerai panzvimbo ichasarudzwa naJehovha. Muchenjerere kuita zvose zvavanenge vakurayirai kuti muite.
11 Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla
Muite maererano nomurayiro wavanokudzidzisai uye nokutonga kwavanokuudzai. Hamufaniri kutsauka kubva pane zvavanokuudzai, kurudyi kana kuruboshwe.
12 Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye Onyenwe anyị Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ.
Munhu anozvidza mutongi kana muprista anomira achishumira pamberi paJehovha Mwari wenyu anofanira kufa. Munofanira kubvisa chakaipa muIsraeri.
13 Nʼụzọ dị otu a, mmadụ niile ga-anụ ihe mere onye ahụ nupuru isi, ha ga-atụ egwu ghara ịbụ ndị mpako.
Vanhu vose vachazvinzwa uye vagotya, uye havazozvidzi zvakare.
14 Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.”
Kana muchinge mapinda munyika yamuri kupiwa naJehovha Mwari wenyu uye kana muchinge maitora kuti ive yenyu, uye magara mairi, uye mukati, “Ngatizvigadzirei mambo sezvakaita ndudzi dzose dzakapoteredza,”
15 O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị.
chenjererai kuti mugadze mambo achasarudzwa naJehovha Mwari wenyu. Anofanira kubva pakati pehama dzenyu. Musazvigadzira mutorwa, uyo asiri hama yenyu muIsraeri.
16 Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”
Mambo haafaniri kuva namabhiza akawanda kana kuita kuti vanhu vadzokere kuIjipiti kundotora mamwe, nokuti Jehovha akutaurirai kuti, “Hamufaniri kudzoka nenzira iyoyo zvakare.”
17 Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe Onyenwe anyị nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke.
Haafaniri kutora madzimai akawanda, nokuti mwoyo wake ungazotsauswa. Haafaniri kuunganidza sirivha negoridhe zvakawanda.
18 Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze.
Kana achinge agara pachigaro chake choushe, anofanira kuzvinyorera bhuku romurayiro uyu, achitora kubva mumirayiro yavaprista vanova vaRevhi.
19 Ihe ahụ o depụtara ka ọ ga-agụ mgbe niile na ndụ ya. Nke a ga-eme ka ọ mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke ya, na ịgbaso ihe niile dị nʼiwu na ụkpụrụ ndị a.
Anofanira kugara naro uye anofanira kuriverenga mazuva ose oupenyu hwake kuitira kuti adzidze kutya Jehovha Mwari wake uye agochenjerera kutevera mashoko ose omurayiro uyu nemitemo iyi.
20 Ịgụ akwụkwọ iwu a mgbe niile ga-eme ka ọ mata na o nweghị ụzọ o si dị elu karịa ụmụnna ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara iwezuga onwe ya site nʼiwu a nʼụzọ ọbụla. Mgbe ahụ, ya onwe ya, na ụmụ ụmụ ya ga-achị alaeze Izrel ogologo oge.
Uye haafaniri kuzviona seari nani kupfuura hama dzake agotsauka kubva pamurayiro kurudyi kana kuruboshwe. Ipapo iye nezvizvarwa zvake achagara nguva huru paushe hwake muIsraeri.