< Diuteronomi 17 >

1 Achụrụla Onyenwe anyị bụ Chineke gị ehi maọbụ atụrụ nwere nkwarụ ọbụla maọbụ ntụpọ. Onyinye dị otu a bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
No ox or sheep which has a mark on it or is damaged in any way may be offered to the Lord your God: for that is disgusting to the Lord your God.
2 Ọ bụrụ na ị nụ na onye ọbụla nʼime obodo ndị ahụ Onyenwe anyị nyere gị, nwoke maọbụ nwanyị na-eme ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị ime ihe megidere ọgbụgba ndụ ya,
If there is any man or woman among you, in any of the towns which the Lord your God gives you, who does evil in the eyes of the Lord your God, sinning against his agreement,
3 ọ bụrụ na onye ahụ efee chi ndị ọzọ, maọbụ kpọọ isiala nye ha, maọbụ fee anwụ, maọbụ ọnwa, maọbụ kpakpando nke mbara eluigwe bụ ihe m na-enyeghị nʼiwu,
By becoming a servant of other gods and worshipping them or the sun or the moon or all the stars of heaven, against my orders;
4 ọ bụrụ na e mere ka ị maara nʼihe dị otu a dị maọbụ ị nụ ya, ị ghaghị ịjụ ase, nyochaa ya nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ị nụrụ bụ eziokwu, ọ bụrụ nʼezie na e mere ihe arụ dị otu a nʼala Izrel,
If word of this comes to your ears, then let this thing be looked into with care, and if there is no doubt that it is true, and such evil has been done in Israel;
5 kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya.
Then you are to take the man or woman who has done the evil to the public place of your town, and they are to be stoned with stones till they are dead.
6 Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara.
On the word of two or three witnesses, a man may be given the punishment of death; but he is not to be put to death on the word of one witness.
7 Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
The hands of the witnesses will be the first to put him to death, and after them the hands of all the people. So you are to put away the evil from among you.
8 Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,
If you are not able to give a decision as to who is responsible for a death, or who is right in a cause, or who gave the first blow in a fight, and there is a division of opinion about it in your town: then go to the place marked out by the Lord your God;
9 nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.
And come before the priests, the Levites, or before him who is judge at the time: and they will go into the question and give you a decision:
10 Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka.
And you are to be guided by the decision they give in the place named by the Lord, and do whatever they say:
11 Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla
Acting in agreement with their teaching and the decision they give: not turning to one side or the other from the word they have given you.
12 Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye Onyenwe anyị Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ.
And any man who, in his pride, will not give ear to the priest whose place is there before the Lord your God, or to the judge, is to be put to death: you are to put away the evil from Israel.
13 Nʼụzọ dị otu a, mmadụ niile ga-anụ ihe mere onye ahụ nupuru isi, ha ga-atụ egwu ghara ịbụ ndị mpako.
And all the people, hearing of it, will be full of fear and put away their pride.
14 Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, merie ndị bi nʼime ya, biri nʼime ya, i nwere ike malite iche nʼobi gị sị, “Anyị kwesiri inwe eze dịka mba ndị ọzọ niile dị anyị gburugburu.”
When you have come into the land which the Lord your God is giving you, and have taken it for a heritage and are living in it, if it is your desire to have a king over you, like the other nations round about you;
15 O si otu a dịrị, lezie anya hụ na onye ị ga-eme eze bụ onye ahụ Onyenwe anyị Chineke gị ga-ahọpụta. Onye ahụ aghaghị ịbụ onye Izrel nʼihi na i kwesighị ime onye mba ọzọ eze ka ọ chịa gị.
Then see that you take as your king the man named by the Lord your God: let your king be one of your countrymen, not a man of another nation who is not one of yourselves.
16 Hụ na eze ahụ ị họpụtara enweghị ọtụtụ ịnyịnya. Eze ahụ ekwesịkwaghị izipụ ndị ga-aga Ijipt ịzụpụtara ya ọtụtụ ịnyịnya ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị agwala gị sị, “Ị gaghị alaghachi Ijipt ọzọ.”
And he is not to get together a great army of horses for himself, or make the people go back to Egypt to get horses for him: because the Lord has said, You will never again go back that way.
17 Eze ahụ agaghị enwe ọtụtụ nwunye, nʼihi na nke a ga-eme ka obi ya si nʼebe Onyenwe anyị nọ pụọ. Ọ gakwaghị ababiga ụba ọlaọcha na ọlaedo oke.
And he is not to have a great number of wives, for fear that his heart may be turned away; or great wealth of silver and gold.
18 Mgbe ọ nọkwasịrị nʼocheeze dịka eze, ọ ga-esite nʼakwụkwọ iwu a ndị nchụaja bụ ndị Livayị na-edebe, depụtara onwe ya iwu a metụtara obibi ndụ ndị eze.
And when he has taken his place on the seat of his kingdom, he is to make in a book a copy of this law, from that which the priests, the Levites, have in their care:
19 Ihe ahụ o depụtara ka ọ ga-agụ mgbe niile na ndụ ya. Nke a ga-eme ka ọ mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke ya, na ịgbaso ihe niile dị nʼiwu na ụkpụrụ ndị a.
And it is to be with him for his reading all the days of his life, so that he may be trained in the fear of the Lord his God to keep and do all the words of this teaching and these laws:
20 Ịgụ akwụkwọ iwu a mgbe niile ga-eme ka ọ mata na o nweghị ụzọ o si dị elu karịa ụmụnna ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara iwezuga onwe ya site nʼiwu a nʼụzọ ọbụla. Mgbe ahụ, ya onwe ya, na ụmụ ụmụ ya ga-achị alaeze Izrel ogologo oge.
So that his heart may not be lifted up over his countrymen, and he may not be turned away from the orders, to one side or the other: but that his life and the lives of his children may be long in his kingdom in Israel.

< Diuteronomi 17 >