< Diuteronomi 16 >

1 Debe ọnwa Abib iche maka ime Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa Abib ka Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼabalị.
Ẹ kíyèsi oṣù Abibu, kí ẹ sì máa ṣe àjọ̀dún ìrékọjá ti Olúwa Ọlọ́run yín, nítorí pé ní oṣù Abibu yìí ni ó mú un yín jáde ní Ejibiti lóru.
2 Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya.
Ẹ fi ẹran kan rú ẹbọ bí ìrékọjá sí Olúwa Ọlọ́run yín láti inú ọ̀wọ́ ẹran tàbí agbo màlúù yín ní ibi tí Olúwa Ọlọ́run yín yóò yàn bí ibùgbé fún orúkọ rẹ̀.
3 Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ.
Ẹ má ṣe jẹ ẹ́ pẹ̀lú u àkàrà tí a fi ìwúkàrà ṣe, ṣùgbọ́n ọjọ́ méje ni kí ẹ fi jẹ àkàrà tí kò ní ìwúkàrà, àkàrà ìpọ́njú, nítorí pé pẹ̀lú ìkánjú ni ẹ kúrò ní Ejibiti: kí ẹ bá à lè rántí ìgbà tí ẹ kúrò ní Ejibiti ní gbogbo ọjọ́ ayé yín.
4 Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ.
Kí a má sì ṣe rí àkàrà wíwú ní ọ̀dọ̀ rẹ nínú ilẹ̀ rẹ ní ijọ́ méje. Kí ìwọ má ṣe jẹ́ kí nǹkan kan ṣẹ́kù nínú ẹran tí ìwọ ó fi rú ẹbọ ní ìrọ̀lẹ́ ọjọ́ kìn-ín-ní di àárọ̀ ọjọ́ kejì.
5 Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị,
Ẹ kò gbọdọ̀ ṣe ìrékọjá náà ní ìlúkílùú kankan, tí Olúwa Ọlọ́run yín fi fún un yín
6 karịakwa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta.
bí kò ṣe ibi tí yóò yàn gẹ́gẹ́ bí ibùgbé fún orúkọ rẹ̀, níbẹ̀ ni ki ẹ ti ṣe ìrúbọ ìrékọjá náà ní ìrọ̀lẹ́ nígbà tí oòrùn bá ń wọ̀ gẹ́gẹ́ bí ìrántí ìgbà tí ẹ kúrò ní ilẹ̀ Ejibiti.
7 Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị.
Ẹ sun ún kí ẹ sì jẹ ẹ́ ní ibi tí Olúwa Ọlọ́run yín yóò yàn. Ní àárọ̀, kí ẹ padà sí àgọ́ ọ yín.
8 Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla.
Ọjọ́ mẹ́fà ní kí ẹ fi jẹ àkàrà aláìwú, ní ọjọ́ keje, ẹ pe àjọ kan fún Olúwa Ọlọ́run yín, kí ẹ má sì ṣe iṣẹ́ kankan.
9 Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.
Ka ọ̀sẹ̀ méje láti ìgbà tí ẹ bá ti bẹ̀rẹ̀ sí fi dòjé ṣe ìkórè ọkà.
10 Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị.
Nígbà náà ni kí ẹ ṣe àjọ ọ̀sẹ̀ sí Olúwa Ọlọ́run yín, nípa pípèsè ọrẹ àtinúwá, gẹ́gẹ́ bí ìbùkún tí Olúwa Ọlọ́run yín fún un yín.
11 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya.
Kí ẹ sì máa yọ̀ níwájú Olúwa Ọlọ́run yín ní ibi tí yóò yàn ní ibùgbé fún orúkọ rẹ̀: ẹ̀yin, àwọn ọmọ yín ọkùnrin àti àwọn ọmọ yín obìnrin, àwọn ẹrú yín ọkùnrin àti àwọn ẹrú yín obìnrin, àwọn Lefi tí ó wà ní ìlú yín, àti àwọn àjèjì, àwọn aláìní baba, àti àwọn opó tí ń gbé àárín yín.
12 Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a.
Ẹ rántí pé, ẹ ti jẹ́ ẹrú ní Ejibiti rí, nítorí náà ẹ tẹ̀lé àwọn ìlànà wọ̀nyí dáradára.
13 Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile
Ẹ ṣe ayẹyẹ àgọ́ ìpàdé fún ọjọ́ méje lẹ́yìn ìgbà tí ẹ bá ti kórè oko yín tí ẹ ti pakà tí ẹ sì ti fún ọtí tán.
14 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ, nye gị onwe gị, ụmụ ndị ikom na ndị inyom gị, ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, ndị Livayị, ndị ọbịa, ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ ndị bi nʼobodo gị niile.
Ẹ máa yọ̀ ní àkókò àjọ̀dún un yín, ẹ̀yin, àwọn ọmọ yín ọkùnrin àti obìnrin, àwọn ẹrúkùnrin àti ẹrúbìnrin yín, àti àwọn Lefi, àwọn àjèjì, àwọn aláìní baba àti àwọn opó tí ń gbé ní àwọn ìlú u yín.
15 A ga-eme mmemme a nye Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị asaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi ihe ubi gị niile, gọziekwa akaọrụ gị niile, ime ka ọṅụ gị zuo oke.
Ọjọ́ méje ni kí ẹ̀yin kí ó fi ṣe ayẹyẹ fún Olúwa Ọlọ́run yín ní ibi tí Olúwa yóò yàn. Nítorí pé Olúwa Ọlọ́run yín yóò bùkún un yín ní gbogbo ìkórè e yín, àti ní gbogbo iṣẹ́ ọwọ́ yín, ayọ̀ ọ yín yóò sì kún.
16 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu Onyenwe anyị.
Ní ẹ̀ẹ̀mẹ́ta lọ́dún ni kí gbogbo àwọn ọkùnrin rẹ kí ó farahàn níwájú Olúwa Ọlọ́run rẹ̀, ní ibi tí yóò yàn. Níbi àjọ àkàrà àìwú, níbi àjọ ọ̀sẹ̀, àti àjọ àgọ́ ìpàdé. Ẹnikẹ́ni kò gbọdọ̀ wá sí iwájú Olúwa ní ọwọ́ òfo.
17 Onye ọbụla ga-eweta onyinye dịka o nwere ike na dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị gọzie ya.
Kí olúkúlùkù ó mú ọrẹ wá bí agbára rẹ̀ ti tó, gẹ́gẹ́ bí ìbùkún Olúwa Ọlọ́run rẹ tí ó fi fún un ọ̀.
18 Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile.
Ẹ yan àwọn adájọ́ àti àwọn olóyè fún ẹ̀yà a yín kọ̀ọ̀kan, ní gbogbo ìlú tí Olúwa Ọlọ́run yín yóò fún un yín, wọ́n sì gbọdọ̀ máa fi òtítọ́ ṣe ìdájọ́ àwọn ènìyàn.
19 Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
Ìwọ kò gbọdọ̀ yí ìdájọ́ po, ìwọ kò gbọdọ̀ ṣe ojúsàájú ènìyàn. Ìwọ kò gbọdọ̀ gba àbẹ̀tẹ́lẹ̀ nítorí pé àbẹ̀tẹ́lẹ̀ ń fọ́ ojú ọlọ́gbọ́n, ó sì ń ba ọ̀rọ̀ olódodo jẹ́.
20 Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Ẹ tẹ̀lé ìdájọ́ òtítọ́ àní ìdájọ́ òtítọ́ nìkan, kí ẹ bá à lè gbé kí ẹ sì gba ilẹ̀ tí Olúwa Ọlọ́run yín ń fún un yín.
21 Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye Onyenwe anyị Chineke gị.
Ẹ má ṣe ri ère òrìṣà Aṣerah sí ẹ̀gbẹ́ pẹpẹ tí ẹ ti mọ fún Olúwa Ọlọ́run yín.
22 Eguzokwala ogidi nkume ọbụla nʼihi na ha bụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ asị.
Ẹ kò gbọdọ̀ gbé òkúta òrìṣà gbígbẹ́ kan kalẹ̀ fún ara yín, nítorí èyí ni Olúwa Ọlọ́run yín kórìíra.

< Diuteronomi 16 >