< Diuteronomi 16 >
1 Debe ọnwa Abib iche maka ime Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa Abib ka Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼabalị.
Observe the month of Abib, and prepare the passover-sacrifice unto the Lord thy God; for in the month of Abib did the Lord thy God bring thee forth out of Egypt by night.
2 Ị ga-eji anụ si nʼigwe atụrụ na ehi gị chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja ngabiga nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta dịka ebe obibi nye aha ya.
And thou shalt sacrifice the passover-offering unto the Lord thy God of sheep and oxen, in the place which the Lord will choose to let his name dwell there.
3 Erila ya na achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee, kama ụbọchị asaa ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, ya bụ, achịcha ahụhụ, iji cheta na i si nʼala Ijipt pụta ngwangwa. Nke a ga-eme ka i nwee ike na-echeta mgbe i sitere nʼala Ijipt pụta, ụbọchị niile nke ndụ.
Thou shalt not eat therewith any leavened bread: seven days shalt thou eat therewith unleavened bread, the bread of affliction; for in haste didst thou go forth out of the land of Egypt; in order that thou mayest remember the day of thy going forth out of the land of Egypt all the days of thy life.
4 Ka ihe ọbụla na-eko achịcha ghara ịbata nʼezinaụlọ gị abalị asaa ndị ahụ. Unu ahapụkwala anụ ọbụla unu chụrụ nʼaja nʼoge uhuruchi nke ụbọchị mbụ, nọọ ruo ụtụtụ.
And there shall not be seen with thee any leaven in all thy borders seven days: neither shall there any of the flesh, which thou sacrificedst in the evening, on the first day, remain all night until the morning.
5 Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị,
Thou mayest not slay the passover within any of thy gates, which the Lord thy God giveth thee;
6 karịakwa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta.
But at the place which the Lord thy God will choose to let his name dwell in, there shalt thou slay the passover at evening, at the going down of the sun, at the season that thou camest forth out of Egypt.
7 Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị.
And thou shalt roast and eat it in the place which the Lord thy God will choose; and thou shalt turn in the morning, and go unto thy tents.
8 Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla.
Six days shalt thou eat unleavened bread; and on the seventh day shall be a solemn assembly to the Lord thy God: thou shalt do no work.
9 Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.
Seven weeks shalt thou number unto thyself: from the time thou beginnest to put the sickle to the corn, shalt thou begin to number seven weeks.
10 Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị.
And thou shalt keep the feast of weeks unto the Lord thy God with a tribute of a freewill-offering of thy hand, which thou shalt give: according as the Lord thy God shall have blessed thee.
11 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya.
And thou shalt rejoice before the Lord thy God, thou, and thy son, and thy daughter, and thy man-servant, and thy maid-servant, and the Levite that is within thy gates, and the stranger, and the fatherless, and the widow, that are in the midst of thee, in the place which the Lord thy God will choose to let his name dwell there.
12 Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a.
And thou shalt remember that thou hast been a bond-man in Egypt; and thou shalt observe and do these statutes.
13 Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile
The feast of tabernacles shalt thou hold for thyself seven days, when thou hast gathered in the produce of thy threshing-floor and of thy wine-press:
14 Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ, nye gị onwe gị, ụmụ ndị ikom na ndị inyom gị, ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, ndị Livayị, ndị ọbịa, ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ ndị bi nʼobodo gị niile.
And thou shalt rejoice on thy feast, thou, and thy son, and thy daughter, and thy man-servant, and thy maid-servant, and the Levite, and the stranger, and the fatherless, and the widow, that are within thy gates.
15 A ga-eme mmemme a nye Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị asaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi ihe ubi gị niile, gọziekwa akaọrụ gị niile, ime ka ọṅụ gị zuo oke.
Seven days shalt thou keep a solemn feast unto the Lord thy God in the place which the Lord will choose; because the Lord thy God will bless thee in all thy product, and in all the work of thy hands, and thou shalt only rejoice.
16 Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu Onyenwe anyị.
Three times in the year shall every one of thy males appear before the Lord thy God in the place which he will choose: on the feast of unleavened bread, and on the feast of weeks, and on the feast of tabernacles; and no one shall appear before the Lord empty;
17 Onye ọbụla ga-eweta onyinye dịka o nwere ike na dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị gọzie ya.
Every man according to what his hand can give, according to the blessing of the Lord thy God which he hath given thee.
18 Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile.
Judges and officers shalt thou appoint unto thyself in all thy gates, which the Lord thy God giveth thee, throughout thy tribes: and they shall judge the people with a just judgment.
19 Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.
Thou shalt not wrest judgment; thou shalt not respect persons, and thou shalt not take a bribe; for the bribe blindeth the eyes of the wise, and perverteth the words of the righteous.
20 Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Justice, only justice shalt thou pursue; in order that thou mayest live, and retain possession of the land which the Lord thy God giveth thee.
21 Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye Onyenwe anyị Chineke gị.
Thou shalt not plant unto thyself a grove, any tree, near the altar of the Lord thy God, which thou shalt make unto thyself.
22 Eguzokwala ogidi nkume ọbụla nʼihi na ha bụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ asị.
Neither shalt thou set thee up any statue, which the Lord thy God hateth.