< Diuteronomi 15 >
1 Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, ị ga-akagbu ụgwọ niile mmadụ ji gị.
A ƙarshen kowace shekara ta bakwai, dole ku yafe basusuwan da kuke bi.
2 Otu a ka a ga-esi mee ya: Onye ọbụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ niile onye Izrel ibe ya ji ya. Ọ gaghị elekwa anya na onye agbataobi ya maọbụ nwanna ya ga-akwụ ya ụgwọ ahụ, nʼihi na oge a na-ekwusa mgbaghara ụgwọ Onyenwe anyị eruola.
Ga yadda za ku yafe basusuwan, kowane mai bin bashi, yă yafe bashin da yake bin ɗan’uwansa mutumin Isra’ila. Ba zai bukaci mutumin Isra’ila wanda yake ɗan’uwa yă biya shi bashi ba, gama an yi shelar lokacin da Ubangiji ya ajiye na yafe bashi.
3 Mgbaghara a erughị nʼebe ndị ọbịa nọ, ma ị ghaghị ịkagbu ụgwọ ọbụla nwanna gị ji gị.
Za ku iya nemi baƙo yă biya ku bashin da kuke binsa, amma dole ku yafe duk wani bashin da kuke bin ɗan’uwa.
4 Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu,
Amma bai kamata a sami matalauci a cikinku ba, gama Ubangiji Allahnku zai albarkace ku a ƙasar da yake ba ku, ku mallaka a matsayin gādo,
5 ma ọ bụrụ na i rube isi nye Onyenwe anyị Chineke gị, ma lezie anya debe iwu ndị a niile m na-enye gị taa.
in dai kun yi cikakken biyayya ga Ubangiji Allahnku, kuka kuma lura, kuna kiyaye dukan waɗannan umarnan da nake ba ku yau.
6 Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.
Gama Ubangiji Allahnku zai albarkace ku kamar yadda ya yi alkawari, za ku kuma ba al’ummai masu yawa bashi, amma ba za ku karɓa bashi daga wurin wani ba. Za ku yi mulkin al’ummai masu yawa, babu wata kuwa da za tă yi mulkinku.
7 Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya,
In akwai matalauci a cikin’yan’uwanku, a duk wani daga cikin biranen da Ubangiji Allahnku yake ba ku, kada ku taurara zuciya, ko ku ƙi saki hannu ga ɗan’uwanku matalauci.
8 ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ.
A maimakon haka ku bayar hannu sake, ku kuma ba shi bashi gwargwadon abin da yake bukata a sauƙaƙe.
9 Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara.
Ku yi hankali kada ku riƙe wannan mugun tunani cewa, “Shekara ta bakwai, shekarar yafewar basusuwa, ta yi kusa,” har ku nuna mugun nufi ga ɗan’uwa mabukaci, ku ƙi ba shi wani abu. Zai yi kuka ga Ubangiji a kanku, abin kuwa zai zama laifi a kanku.
10 Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya.
Ku bayar hannu sake gare shi, ku kuma yi haka ba tare da gunaguni ba; saboda wannan fa Ubangiji Allahnku zai albarkace ku a cikin dukan aikinku, da kuma kome da kuka sa hannunku a kai.
11 A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.
Kullum za ku kasance da matalauta a ƙasar. Saboda haka na umarce ku ku bayar hannu sake ga’yan’uwa da kuma matalauta, da masu bukata a ƙasarku.
12 Ọ bụrụ na onye Hibru ibe gị, ndị nwoke maọbụ ndị nwanyị, eresi gị onwe ha, gbakwaara gị odibo afọ isii, nʼafọ nke asaa, ị ghaghị ịhapụ ha ka ha nwere onwe ha.
In ɗan’uwa mutumin Ibraniyawa, namiji ko ta mace, ya sayar da kansa gare ka, ya kuma bauta maka shekaru shida, a shekara ta bakwai dole ka’yantar da shi.
13 Mgbe ọ hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu!
Sa’ad da kuka sake shi, kada ku bar shi yă tafi hannu wofi.
14 Ị ga-esite nʼigwe anụ ụlọ gị, na nʼebe ịzọcha ọka gị, na nʼebe ịzọcha vaịnị gị, nye ya onyinye pụrụ iche iji sị ya laa nʼudo. Nye ya onyinye a dịka Onyenwe anyị Chineke gị si gọzie gị.
Ku ba shi kyautai hannu sake daga tumakinku, daga masussukarku, da kuma daga wurin matsewar inabinku. Ku ba shi yadda Ubangiji Allahnku ya albarkace ku.
15 Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt ma Onyenwe anyị bụ Chineke gị gbapụtara gị. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji na-enye gị iwu a taa.
Ku tuna, dā ku bayi ne a Masar, Ubangiji Allahnku kuma ya fisshe ku. Shi ya sa nake ba ku wannan umarni a yau.
16 Ma ọ bụrụ na ohu gị asị gị, “Achọghị m ịhapụ gị,” nʼihi na ọ hụrụ gị na ndị ụlọ gị nʼanya, hụkwa na ihe na-agara gị na ya nke ọma, mgbe gị na ya nọ.
Amma in bawanka ya ce maka, “Ba na so in bar ka,” saboda yana ƙaunarka da iyalinka, ya kuma fiye masa yă zauna da kai,
17 Were agịga kpọpuo ntị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ gị. Ọ ga-abụkwara gị ohu ogologo ndụ ya niile. Otu aka ahụ kwa ka ị ga-eme ohu gị nwanyị.
sai ka ɗauki basilla ka huda kunnensa a bakin ƙofa, zai kuwa zama bawanka dukan rayuwarsa. Ka yi haka ma wa baiwarka.
18 Enwela obi mwute mgbe ọbụla ị na-ahapụ ohu gị ka o nwere onwe ya, nʼihi na ị ga-echeta na ọ rụụrụ gị ọrụ afọ isii, ihe i mefukwara erughị ọkara ihe ị gaara eji goo ndị ọrụ. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzikwa gị nʼihe niile ị na-eme.
Sa’ad da kuka’yantar da shi kada ku damu, gama shekara shida ya yi muku bauta wadda ta ninka ta ɗan ƙodago. Ubangiji Allahnku kuwa zai albarkace ku a kome da kuke yi.
19 Nwa oke ehi ọbụla maọbụ nwa atụrụ ọbụla maọbụ nwa ewu ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼime igwe anụ ụlọ gị ka ị ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị, ejila nwa mbụ nke ehi gị e buru ụzọ mụọ arụ ọrụ ubi, akpachakwala ajị nwa ewu maọbụ nwa atụrụ ọbụla e buru ụzọ mụọ dị nʼime igwe ewu na atụrụ gị.
Ku keɓe wa Ubangiji Allahnku kowane ɗan fari na garkenku na shanu, da na tumaki. Kada ku sa ɗan fari na shanunku aiki, kada kuma ku aske gashin ɗan fari na tumakinku.
20 Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara.
Kowace shekara, kai da iyalinka za ku ci su a gaban Ubangiji Allahnku, a wurin da ya zaɓa.
21 Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị.
In dabbar tana da lahani, gurguntaka ko makantaka, ko kuwa tana da wani mugun lahani, kada ku miƙa ta ga Ubangiji Allahnku.
22 Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada.
Sai ku ci a cikin biranenku. Mutum marar tsabta da mai tsabta zai iya ci kamar yadda ake yi da barewa ko mariri.
23 Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.
Amma kada fa ku ci jinin, ku zubar da shi a ƙasa kamar ruwa.