< Diuteronomi 14 >

1 Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.
Ọmọ Olúwa Ọlọ́run yín ni ẹ̀yin jẹ́: nítorí náà, ẹ má ṣe ya ara yín ní abẹ. Ẹ má ṣe gé irun iwájú orí yín nítorí òkú.
2 Nʼihi na onye dị nsọ ka ị bụ nye Onyenwe anyị Chineke gị. Ọ bụkwa gị ka Onyenwe anyị họọrọ site na ndị niile nọ nʼelu ụwa, ị bụ ihe oke ọnụahịa nye ya.
Nítorí pé ènìyàn mímọ́ ní ẹ jẹ́ fún Olúwa Ọlọ́run yín, nínú gbogbo ènìyàn tí ó wà lórí ilẹ̀ ayé, Ọlọ́run ti yàn yín láti jẹ́ ìṣúra iyebíye rẹ̀.
3 Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ.
Ẹ má ṣe jẹ ohun ìríra kankan.
4 Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu,
Àwọn wọ̀nyí ni ẹranko tí ẹ lè máa jẹ: màlúù, àgùntàn àti ewúrẹ́,
5 na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
àgbọ̀nrín, èsúró, etu, àgóró, ẹfọ̀n, ìgalà àti àgùntàn igbó.
6 Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri.
Ẹ lè jẹ gbogbo ẹranko tí pátákò ẹsẹ̀ rẹ̀ kì í ṣe méjì tí ó sì tún jẹ àpọ̀jẹ.
7 Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
Síbẹ̀síbẹ̀ nínú gbogbo ẹran tí ń jẹ àpọ̀jẹ tí ó sì tún ya pátákò ẹsẹ̀ tí ẹ kò gbọdọ̀ jẹ ni: ìbákasẹ, ehoro, àti ẹranko tí ó dàbí ehoro tí ń gbé inú àpáta. Bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé wọ́n jẹ àpọ̀jẹ, ṣùgbọ́n wọn kò la pátákò ẹsẹ̀, a kà wọ́n sí àìmọ́ fún yín.
8 Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha.
Ẹlẹ́dẹ̀ jẹ́ àìmọ́; bí ó tilẹ̀ jẹ́ pé ó ya pátákò ẹsẹ̀, kì í jẹ àpọ̀jẹ, ẹ kò gbọdọ̀ jẹ ẹran rẹ̀, ẹ kò sì gbọdọ̀ fọwọ́ kan òkú rẹ̀.
9 Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa,
Nínú gbogbo ẹ̀dá alààyè tí ń gbé inú omi, ẹ lè jẹ èyíkéyìí tí ó ní lẹbẹ àti ìpẹ́.
10 ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ.
Ṣùgbọ́n èyíkéyìí tí kò bá ní lẹbẹ àti ìpẹ́, ẹ má ṣe jẹ ẹ́, nítorí pé àìmọ́ ni wọ́n jẹ́ fún yín.
11 Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha,
Ẹ lè jẹ ẹyẹ tí ó bá mọ́.
12 ma unu agaghị eri ndị a: ugo, na udele, na udele ojii,
Ṣùgbọ́n ìwọ̀nyí ní ẹ kò gbọdọ̀ jẹ: idì, igún, àkàlà,
13 na ndagbụ, na ọgankwọ, na ndagbụ dị iche iche,
onírúurú àṣá àti àṣá alátagbà,
14 na ugolọma ọbụla dị iche iche,
onírúurú ẹyẹ ìwò,
15 na enyi nnụnụ, na egbe abalị, na nnụnụ oke osimiri, na egbe dị iche iche,
ògòǹgò, òwìwí, pẹ́pẹ́yẹdò àti onírúurú àwòdì,
16 na okwukwu nta, na okwukwu ukwu, na okwukwu nwere mpi,
onírúurú òwìwí,
17 na okwolo na udele, na komorant,
òwìwí ọ̀dàn, àkàlà, ìgò,
18 na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ.
àkọ̀, òòdẹ̀, onírúurú ẹyẹ odò mìíràn, atọ́ka àti àdán.
19 Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha,
Àti gbogbo kòkòrò tí ń fò tí wọ́n ń kọ́wọ̀ọ́ rìn jẹ́ aláìmọ́ fun un yín, ẹ má ṣe jẹ wọ́n.
20 Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.
Ṣùgbọ́n ẹ lè jẹ èyíkéyìí ẹ̀dá abìyẹ́ tí ó bá mọ́.
21 Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.
Ẹ má ṣe jẹ ohun tí ó ti kú sílẹ̀. Ẹ lè fún àwọn àjèjì tí ń gbé ní èyíkéyìí nínú ìlú yín. Òun lè jẹ ẹ́ tàbí kí ẹ tà á fún àwọn àjèjì. Ṣùgbọ́n ènìyàn mímọ́ fún Olúwa Ọlọ́run yín ni ẹ̀yin jẹ́. Ìwọ kò gbọdọ̀ ṣe ewúrẹ́ nínú wàrà ìyá rẹ̀.
22 Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.
Ẹ rí i dájú pé ẹ̀ ń fi ìdákan nínú mẹ́wàá nínú ìre oko yín lọ́dọọdún pamọ́ sí apá kan.
23 Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.
Ẹ jẹ ìdámẹ́wàá oúnjẹ yín, wáìnì tuntun, òróró, àti àkọ́bí àwọn màlúù yín àti ewúrẹ́ ẹ yín, níwájú Olúwa Ọlọ́run yín, ní ibi tí yóò yàn bí ibùgbé orúkọ rẹ̀. Kí ẹ lè kọ́ bí a ṣé ń bu ọlá fún Olúwa Ọlọ́run yín nígbà gbogbo.
24 Ọ bụrụ na ebe Onyenwe anyị họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ Onyenwe anyị họpụtara dị anya),
Bí ibẹ̀ bá jì tí Olúwa Ọlọ́run rẹ sì ti bùkún fún ọ, tí o kò sì le ru àwọn ìdámẹ́wàá rẹ (nítorí pé ibi tí Olúwa yóò yàn láti fi orúkọ rẹ̀ sí jìnnà jù).
25 mgbe ahụ, gbanwee otu ụzọ nʼụzọ iri nata ọlaọcha, were ọlaọcha ahụ jee nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara.
Ẹ pààrọ̀ àwọn ìdámẹ́wàá yín sí owó, ẹ mú owó náà lọ sí ibi tí Olúwa yóò yàn.
26 Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ.
Fi owó náà ra ohunkóhun tí o bá fẹ́, màlúù, àgùntàn, wáìnì, tàbí ọtí líle, tàbí ohunkóhun tí o bá fẹ́. Kí ìwọ àti ìdílé rẹ sì jẹ ẹ́ níwájú Olúwa níbẹ̀ kí ẹ sì máa yọ̀.
27 Echefukwala ime ka ndị Livayị soro gị rie ihe ị kpatara, nʼihi na ha enweghị ihe nketa ọbụla, maọbụ ihe ubi dịka gị.
Ẹ má ṣe gbàgbé àwọn Lefi tí ó ń gbé nì ìlú yín, nítorí pé wọn kò ní ìpín kan tàbí ogún kan tí í ṣe tiwọn.
28 Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị,
Ní òpin ọdún mẹ́ta mẹ́ta, ẹ̀yin yóò mú gbogbo ìdámẹ́wàá ìre oko àwọn ọdún náà, kí ẹ kó wọn jọ ní ìlú yín.
29 ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.
Kí àwọn Lefi (tí kò ní ìpín tàbí ogún tiwọn) àti àwọn àjèjì, àwọn aláìní baba, àti àwọn opó tí ń gbé ìlú yín lè wá, kí wọn sì jẹ kí wọn sì yó, kí Olúwa Ọlọ́run rẹ le è bùkún fún ọ, nínú gbogbo iṣẹ́ ọwọ́ rẹ.

< Diuteronomi 14 >