< Diuteronomi 14 >

1 Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.
You are the people of Yahweh your God. Do not cut yourselves, nor shave any part of your face for the dead.
2 Nʼihi na onye dị nsọ ka ị bụ nye Onyenwe anyị Chineke gị. Ọ bụkwa gị ka Onyenwe anyị họọrọ site na ndị niile nọ nʼelu ụwa, ị bụ ihe oke ọnụahịa nye ya.
For you are a nation that is set apart to Yahweh your God, and Yahweh has chosen you to be a people for his own possession, more than all peoples that are on the surface of the earth.
3 Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ.
You must not eat any abominable thing.
4 Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu,
These are the animals that you may eat: the ox, the sheep, and the goat,
5 na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
the deer, the gazelle, the roebuck, the wild goat, and ibex, and the antelope, and the mountain sheep.
6 Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri.
You may eat any animals that parts the hoof, that is, that has the hoof divided in two, and that chews the cud.
7 Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
Nevertheless, you must not eat some animals that chew the cud or that have the hoof divided in two: the camel, the rabbit, and the rock badger; because they chew the cud but do not part the hoof, they are unclean to you.
8 Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha.
The pig is unclean to you as well because he parts the hoof but does not chew the cud; he is unclean to you. Do not eat pig meat, and do not touch their carcasses.
9 Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa,
Of these things that are in water you may eat: whatever has fins and scales;
10 ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ.
but whatever has no fins and scales you must not eat; they are unclean to you.
11 Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha,
All clean birds you may eat.
12 ma unu agaghị eri ndị a: ugo, na udele, na udele ojii,
But these are the birds that you must not eat: the eagle, the vulture, the osprey,
13 na ndagbụ, na ọgankwọ, na ndagbụ dị iche iche,
the red kite and black kite, any kind of falcon.
14 na ugolọma ọbụla dị iche iche,
You must not eat any kind of raven,
15 na enyi nnụnụ, na egbe abalị, na nnụnụ oke osimiri, na egbe dị iche iche,
and the ostrich, and the night hawk, the sea gull, any kind of hawk,
16 na okwukwu nta, na okwukwu ukwu, na okwukwu nwere mpi,
the little owl, the great owl, the white owl,
17 na okwolo na udele, na komorant,
the pelican, the carrion vulture, the cormorant.
18 na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ.
You must not eat the stork, any kind of heron, the hoopoe, and the bat.
19 Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha,
All winged, swarming things are unclean to you; they must not be eaten.
20 Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.
You may eat all clean flying things.
21 Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya.
You must not eat of anything that dies of itself; you may give it to the foreigner who is within your towns, that he may eat it; or you may sell it to a foreigner. For you are a nation that is set apart to Yahweh your God. You must not boil a young goat in its mother's milk.
22 Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.
You must surely tithe all the yield of your seed, that which comes out from the field year after year.
23 Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile.
You must eat before Yahweh your God, in the place that he will choose as his sanctuary, the tithe of your grain, of your new wine, and of your oil, and the firstborn of your herd and your flock; that you may learn to always honor Yahweh your God.
24 Ọ bụrụ na ebe Onyenwe anyị họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ Onyenwe anyị họpụtara dị anya),
If the journey is too long for you so that you are not able to carry it, because the place that Yahweh your God will choose as his sanctuary is too far from you, then, when Yahweh God blesses you,
25 mgbe ahụ, gbanwee otu ụzọ nʼụzọ iri nata ọlaọcha, were ọlaọcha ahụ jee nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara.
you will convert the offering into money, tie up the money in your hand, and go to the place that Yahweh your God will choose.
26 Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ.
There you will spend the money for whatever you desire: for oxen, or for sheep, or for wine, or for strong drink, or for whatever you desire; you will eat there before Yahweh your God, and you will rejoice, you and your household.
27 Echefukwala ime ka ndị Livayị soro gị rie ihe ị kpatara, nʼihi na ha enweghị ihe nketa ọbụla, maọbụ ihe ubi dịka gị.
The Levite who is within your gates—do not forsake him, for he has no portion nor inheritance with you.
28 Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị,
At the end of every three years you will present all the tithe of your produce in the same year, and you will store it up within your gates;
29 ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.
and the Levite, because he has no portion nor inheritance with you, and the foreigner, and the fatherless, and the widow who are within your gates, will come and eat and be satisfied. Do this so that Yahweh your God may bless you in all the work of your hand that you do.

< Diuteronomi 14 >