< Diuteronomi 12 >

1 Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ niile unu na-aghaghị idebe ogologo ụbọchị niile unu ga-ebi nʼala ahụ, Onyenwe anyị Chineke nna unu ha nyere unu, dịka ihe nweta.
Waɗannan su ne ƙa’idodi da kuma dokokin da za ku lura, ku kuma kiyaye a ƙasar da Ubangiji, Allahn kakanninku, yake ba ku don ku ci gādonta, muddin kuna zama a ƙasar.
2 Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.
Ku hallaka dukan wuraren da al’umman da kuke kora suke yi wa allolinsu sujada, a kan duwatsu masu tsawo, da a kan tuddai, da kuma ƙarƙashin kowane itace gaba ɗaya.
3 Kwatuokwanụ ebe ịchụ aja ha niile, tijisie ogidi nsọ ha niile, kpọọkwa osisi Ashera ha ọkụ, gbutukwaanụ arụsị niile a apịrị apị nke chi niile ha. Kpochapụkwanụ aha ha niile site nʼebe niile ahụ.
Ku rurrushe bagadansu, ku farfashe keɓaɓɓun duwatsunsu, ku kuma ƙone ginshiƙan Asheransu da wuta; ku yayyanka gumakan allolinsu, ku kuma shafe sunayensu daga waɗannan wurare.
4 Unu agaghị efe Onyenwe anyị Chineke unu ofufe dịka ndị ahụ na-efe arụsị na-eme.
Ba za ku yi wa Ubangiji Allahnku sujada a hanyar da suke yi ba.
5 Kama unu chọpụta ebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, site nʼetiti ebo Izrel niile, ebe ọ ga-akpọkwasị aha ya. Nʼebe ahụ ka unu ga-abịakwute ya.
Amma sai ku nemi wurin da Ubangiji Allahnku zai zaɓa daga cikin dukan kabilanku, inda zai sa Sunansa, yă mai wurin mazauninsa. A wannan wuri ne za ku tafi;
6 Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka unu ga-ewetara Onyenwe anyị aja nsure ọkụ unu, na aja ndị ọzọ niile, na otu ụzọ nʼụzọ iri unu, na onyinye pụrụ iche unu, bụ onyinye unu kwere nkwa inye, na onyinye afọ ofufu unu, na onyinye ụmụ mbụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ unu.
a can ne kuma za ku kawo hadayun ƙonawa da sadakoki, zakkarku da kyautai na musamman, da abin da kuka yi alkawari za ku bayar, da hadayunku na yardar rai, da kuma’ya’yan farin garkunanku na shanu da na tumaki.
7 Unu na ezinaụlọ unu ga-anọkwa nʼebe ahụ, nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu, rie oriri unu. Nʼihu ya kwa ka unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, nʼihi ihe niile ahụ unu setịpụrụ aka unu ime, na nʼihi ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu gọziri unu.
A can, a gaban Ubangiji Allahnku, ku da iyalanku za su ci, su kuma yi farin ciki a kome da kuka sa hannunku a kai, domin Ubangiji Allahnku zai albarkace ku.
8 Unu agaghị emekwa ihe masịrị unu, dịka unu si eme taa, nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọbụla o chere na o ziri ezi nʼanya ya,
Kada ku yi kamar yadda muke yi a nan yau, yadda kowa yake yin abin da ya ga dama.
9 nʼihi na iwu ndị a ebidobeghị ịdị ire, ebe ọ bụ na unu abanyebeghị nʼebe izuike ahụ, na ihe nketa ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu.
Gama ba ku kai wurin hutawa wanda Ubangiji Allahnku zai ba ku gādo ba tukuna.
10 Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ.
Amma sa’ad da kuka haye Urdun, kuka zauna a ƙasar da Ubangiji Allahnku yake ba ku ita gādo, zai kuwa ba ku hutu daga dukan abokan gābanku da suke kewaye da ku, kuka sami zaman lafiya,
11 Mgbe ahụ, unu ga-eweta ihe ndị ahụ niile m nyere unu nʼiwu: aja nsure ọkụ unu niile, na aja ndị ọzọ, na onyinye ahụ pụrụ iche unu kwere nkwa inye, unu ga-eweta ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu họpụtara ebe o kpọkwasịrị aha ya.
sai ku kai dukan abin da na umarce ku ku kai, wato, hadayu na ƙonawa, da sadakokinku, da zakkarku, da hadayunku na ɗagawa, da hadayunku na alkawarin da kuka yi wa Ubangiji a wurin da Ubangiji Allahnku ya zaɓa yă sa sunansa.
12 Unu na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị bi nʼobodo unu, ndị na-enweghị ihe nketa nke aka ha, ga-anọ nʼebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
A can kuma za ku yi farin ciki a gaban Ubangiji Allahnku, ku da’ya’yanku maza da mata, da bayinku maza da mata, da kuma Lawiyawa daga biranenku, waɗanda ba a ba su rabo ba, ba su kuma da gādo na kansu.
13 Ị gaghị achụ aja nsure ọkụ gị nʼebe ọbụla masịrị gị,
Ku kula fa kada ku miƙa hadayun ƙonawa a wani wurin da kuka ga dama.
14 ọ bụ naanị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ ga-ahọpụta otu ebe, nʼala otu ebo. Ọ bụ naanị nʼebe ahụ ka ị ga-esure aja unu niile, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ị ga-eweta onyinye gị niile.
Ku miƙa su kawai a wurin da Ubangiji zai zaɓa a cikin ɗaya daga kabilanku, a can za ku yi kowane abin da na umarce ku.
15 Otu ọ dị, ị pụrụ ịnọ nʼebe ọbụla gbuo anụ ị ga-eri, dịka ọ bụ ele maọbụ mgbada ugbu a. Rie anụ mgbe ọbụla ọ gụrụ gị agụụ, na-erikwa ya mgbe ọbụla i nwetara ya, dịka ngọzị Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Ma onye dị ọcha, ma onye na-adịghị ọcha nwere ike iso rie ya.
Amma kwa iya yanka nama ku ci a garuruwanku, a duk lokacin da ranku yake so, kamar yadda ake yi da gada ko barewa, bisa ga albarkar da Ubangiji Allahnku yake sa muku. Marar tsarki da mai tsarki, duka za ku iya ci.
16 Naanị iwu dị nʼiri anụ ndị a bụ na ị gaghị eri ọbara ya, wụsa ọbara ya nʼala, dịka mmiri.
Amma kada ku ci jini, ku zubar da shi a ƙasa kamar ruwa.
17 Ma o nweghị onyinye ọbụla a na-enye Onyenwe anyị i kwesiri ịnọ nʼụlọ gị rie. I kwesighị ịnọ nʼụlọ gị rie onyinye ndị a: onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka na mmanya ọhụrụ gị, na nke mmanụ oliv, na ụmụ mbụ nke igwe ehi na igwe ewu na atụrụ gị, na ihe ọbụla i kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu gị, na onyinye ndị ọzọ pụrụ iche.
Kada ku ci zakkar hatsi, da na sabon inabi, da kuma na mai a biranenku, ko kuwa na’ya’yan fari na garkunanku na shanu da na tumaki, ko kuwa duk wani abin da kuka yi alkawari za ku bayar, ko hadayunku na yardar rai, ko kyautai na musamman.
18 Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.
A maimakon haka, sai ku ci su a gaban Ubangiji Allahnku a wurin da Ubangiji Allahnku ya zaɓa, da ku da’ya’yanku maza da mata, da bayinku maza da mata, da kuma Lawiyawa daga biranenku, ku kuwa yi farin ciki a gaban Ubangiji Allahnku a kowane abin da kuka sa hannunku.
19 Echefukwala ndị Livayị, gị na ha ga na-enwekọ ihe ndị a niile, ogologo ụbọchị niile i biri nʼala ahụ.
Ku yi hankali, kada ku manta da Lawiyawa, muddin kuna zaune a ƙasarku.
20 Mgbe Onyenwe anyị, bụ Chineke gị mere ka oke ala gị saa mbara, dịka o kwere gị na nkwa, i nwee oke agụụ maka iri anụ na-asị, “Achọrọ m iri anụ,” mgbe ahụ, i nwere ike rie anụ dịka i si chọọ.
Sa’ad da Ubangiji Allahnku ya fadada iyakarku kamar yadda ya yi muku alkawari, kuka kuma ji marmarin nama, kuka kuma ce, “Muna so mu ci nama,” to, za ku iya cin yadda kuke so.
21 Ọ bụrụ nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị kpọkwasịrị aha ya dị gị anya site nʼebe i nọ, i nwere ike gbuo anụ ụlọ site nʼigwe ehi maọbụ ewu na atụrụ nke Onyenwe anyị nyere gị, dịka m si nye gị nʼiwu. Gbuo ha nʼobodo ebe i bi, riekwa ha otu ị chọrọ.
In wurin da Ubangiji Allahnku ya zaɓa don yă sa Sunansa yana da nisa sosai daga inda kuke, za ku iya yankan dabbobi daga garkunanku na shanu da na tumakin da Ubangiji ya ba ku, kamar yadda na umarce ku, a cikin biranenku kuma za ku iya ci, yadda kuke so.
22 Rie ha dịka ị ga-esi rie ele maọbụ mgbada. Onye ọbụla nʼime unu nwere ike rie ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha.
Ku ci su yadda akan ci barewa ko mariri. Marar tsarki da mai tsarki, za ku iya ci.
23 Ma lezie anya hụ na i righị ọbara, nʼihi na ndụ dị nʼọbara. Ị gaghị erikọta anụ ọbụla na ndụ ya.
Amma ku tabbata ba ku ci jinin ba, domin jini ne rai, ba kuwa za ku ci rai cikin naman ba.
24 Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri.
Ba za ku ci jini ba, ku zubar da shi a ƙasa kamar ruwa.
25 Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
Kada ku ci shi, don ku zauna lafiya, da ku da’ya’yanku bayanku, gama za ku riƙa aikata abin da yake daidai a gaban Ubangiji.
26 Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere Onyenwe anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta.
Amma ku ɗauki abubuwa masu tsarki, da kuma duk abin da kuka yi alkawari za ku bayar, ku tafi inda Ubangiji ya zaɓa.
27 Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.
Ku miƙa hadayunku na ƙonawa a bagaden Ubangiji Allahnku, da naman da kuma jinin. Dole a zub da jinin hadayunku a gindin bagaden Ubangiji Allahnku, amma za ku iya cin naman.
28 Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.
Ku yi hankali, ku yi biyayya da dukan waɗannan umarnan da nake ba ku, da kuma’ya’yanku, don ku zauna lafiya, da ku da’ya’yanku a bayanku, gama za ku riƙa aikata abin da yake daidai da kuma yake mai kyau a gaban Ubangiji Allahnku.
29 Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha.
Ubangiji Allahnku zai kawar muku da al’umman nan da kuke niyyar shiga cikin ƙasarsu don ku kore su, bayan kuka kore su, kuka kuma zauna a ƙasarsu,
30 Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.”
to, sai ku lura, kada ku jarrabtu ku kwaikwaye su bayan da an riga an shafe su daga gabanku, kada ku tambayi kome game da allolinsu, kuna cewa, “Yaya waɗannan al’ummai suke bauta wa allolinsu? Mu ma za mu yi kamar yadda suka yi.”
31 Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja.
Ba za ku yi wa Ubangiji Allahnku sujada a hanyar da suke yi ba, gama a cikin yin sujada wa allolinsu, sun yi dukan abubuwan banƙyaman da Ubangiji yake ƙi. Har ma sukan ƙone’ya’yansu maza da mata a wuta a matsayin hadayu.
32 Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.
Ku lura, ku aikata dukan abin da na umarce ku; kada ku ƙara, kada ku rage daga cikin.

< Diuteronomi 12 >