< Diuteronomi 11 >

1 Hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, na-edebezukwa ikpe ya na ụkpụrụ ya na ihe niile o nyere nʼiwu.
Muzikonda Yehova Mulungu wanu ndipo nthawi zonse muzitsata zimene Iyeyo anakulamulani, malangizo, zikhazikitso ndi malamulo ake.
2 Chetanụ taa na ọ bụghị ụmụ unu, kama ọ bụ unu onwe unu jiri anya unu hụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ unu hụrụ ịdị ukwuu ya, ịdị ike ya, ịrụsị ọrụ ike nke ike ya,
Lero kumbukirani kuti si ana anu amene anaona ndi kulawa chilango cha Yehova Mulungu wanu: ukulu wake, dzanja lake lamphamvu, mkono wake wotambasuka;
3 ihe ịrịbama ya niile na ihe niile o mere nʼIjipt, otu o si megide Fero eze Ijipt na ndị ala Ijipt niile.
zizindikiro zozizwitsa zimene anazionetsa ndi zinthu zimene anazichita mʼkati mwa Igupto, Farao mfumu ya Igupto ndi kwa dziko lake lonse;
4 Unu hụrụ ihe o mere ndị agha Ijipt na ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha. Otu o si mee ka ha laa nʼiyi nʼime Osimiri Uhie, mgbe ha na-achụ unu ọsọ, na otu Onyenwe anyị si wetara ha ịla nʼiyi ebighị ebi.
zimene Iye anachita kwa gulu lankhondo la Aigupto, kwa akavalo ndi magaleta awo, mmene Iye anawamizira ndi madzi a mu Nyanja Yofiira pamene amakuthamangitsani, ndi mmene Yehova anawagonjetsera kufikira lero.
5 Ọ bụghị ụmụ unu hụrụ ihe o meere unu nʼoge ahụ niile unu nọ nʼọzara tutu unu erute nʼebe a,
Si ana anu amene anaona zimene Iye anakuchitirani mʼchipululu kufikira pamene munafika pa malo anu,
6 na ihe o mere Datan na Abiram, ụmụ Eliab, ndị si nʼebo Ruben, otu ala si meghee ọnụ ya loda ha, ha na ezinaụlọ ha, ụlọ ikwu ha na ihe ọbụla nke dị ndụ ha nwere nʼetiti Izrel niile.
ndi zimene anachitira Datani ndi Abiramu, ana aamuna a Eliabu mwana wa Rubeni, pamene nthaka inatsekula pakamwa pake pakati pa Aisraeli onse ndi kuwameza pamodzi ndi katundu wawo, matenti awo ndi chilichonse chawo.
7 Ma ọ bụ anya unu hụrụ oke ihe ịtụnanya ndị a niile Onyenwe anyị mere.
Koma ndinuyo amene munaona ntchito zonse zikuluzikulu zimenezi Yehova anakuchitirani.
8 Lezienụ anya debe iwu ndị a m na-enye unu taa, ka unu nwee ike, baa bichikwaa ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta,
Tsono muzisunga malamulo onse amene ndikukupatsani lero kuti mukhale ndi mphamvu ndi kuti mupite kukalanda mʼdziko limene mwakhala pangʼono kulowamo mukawoloka Yorodani,
9 ka unu bie ogologo ndụ nʼime ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna unu ha, na ụmụ ụmụ ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
ndiponso kuti mukhalitse mʼdziko limene Yehova analumbira kupatsa makolo anu ndi zidzukulu zawo, lomwe ndi dziko loyenda mkaka ndi uchi.
10 Nʼihi na ala a unu na-aga ịbanye nʼime ya inweta adịghị ka ala Ijipt, ebe unu si pụta, ebe ị na-agha mkpụrụ gị, were ụkwụ tụwara mmiri ụzọ, dịka a na-eme nʼubi akwụkwọ nri.
Dziko limene mukukalanda ndi kulowamo silokhala ngati dziko la ku Igupto kumene mukuchokera ayi, kuja mumadzala mbewu ndi kumathirira ndi mapazi anu ngati ku dimba.
11 Ma ala unu na-agafe Jọdan inweta bụ ala nwere ugwu na ndagwurugwu, nke na-aṅụ mmiri ozuzo si nʼeluigwe.
Koma dziko limene mukalande mukawoloka Yorodani ndi dziko la mapiri ndi zigwa, dziko limene limalandira mvula kuchokera kumwamba.
12 Ọ bụ ala nke Onyenwe anyị Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya.
Ili ndi dziko limene Yehova Mulungu wanu amalisamalira. Maso a Yehova Mulungu wanu amaliyangʼanira nthawi zonse kuchokera ku mayambiriro a chaka mpaka kumapeto kwake.
13 Ya mere, ọ bụrụ na unu ga-eji ntụkwasị obi rube isi nʼiwu ya niile, nke m na-enye unu taa, ọ bụrụkwa na unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ọ bụrụkwa na unu ga-efe ya ofufe,
Choncho mukasunga mokhulupirika malamulo amene ndikukupatsani lero lino, kukonda Yehova Mulungu wanu ndi kumutumikira Iyeyo ndi mtima wanu wonse ndi moyo wanu wonse,
14 ọ ga na-ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ, nke ga-eme ka ọka unu mịa mkpụrụ hiri nne, ka unu nwee ọtụtụ vaịnị, nweekwa mmanụ oliv.
pamenepo ndidzatumiza mvula mʼdziko mwanu pa nthawi yake mʼnyengo ya dzinja ndi chilimwe, kuti mudzakolole tirigu wambiri ndi kuti mudzakhale ndi vinyo watsopano ndi mafuta.
15 Ọ ga-eme ka anụ ụlọ gị nwee ahịhịa ha ga-ata, gị onwe gị ga-enwekwa ihe oriri dị ukwuu. Afọ ga-ejukwa gị nʼihe i nwere.
Ndidzakupatsani udzu mʼminda mwanu woti muzidzadyetsera ngʼombe zanu ndipo inuyo mudzadya ndi kukhuta.
16 Ma lezienụ anya, ka ahapụ ịrafu obi unu mee ka unu wezuga onwe unu, bido ife chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha.
Dzisamalireni nokha, kuopa kuti mungakopeke mtima ndi kubwerera mʼmbuyo kuyamba kutumikira milungu ina ndi kumayigwadira.
17 Mgbe ahụ, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ nʼebe unu nọ, ọ ga-agbachi eluigwe, mmiri agaghị ezo, ala agaghị epupụtakwa ihe ubi, unu ga-alakwa nʼiyi nʼotu ntabi anya, nʼezi ala ahụ Onyenwe anyị na-enye unu.
Mukatero Yehova Mulungu wanu adzakukwiyirani kwambiri, nadzaletsa thambo kuti lisabweretsenso mvula ndipo dziko silidzapereka zokolola. Choncho mudzawonongeka msanga mʼdziko limene Yehova akukupatsani.
18 Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu.
Sungani mawu amenewa mu mtima mwanu ndi mʼmaganizo mwanu, muwamangirire pa mikono yanu ndipo muwayike pamphumi panu.
19 Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
Mawuwa muziphunzitsa ana anu, muzikamba za iwo pamene mukhala pansi mʼnyumba zanu, pamene mukuyenda mʼnjira, pamene mugona ndi pamene mukudzuka.
20 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
Muwalembe pa mphuthu za nyumba zanu ndi pa zipata zanu,
21 Ka ụbọchị ndụ unu na nke ụmụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya, nke Onyenwe anyị kwere nna unu na nkwa. Dịka ogologo ụbọchị niile ha nke eluigwe dị nʼelu, ụwa dịkwa nʼokpuru ya.
kuti inu ndi ana anu mukhale mʼdziko limene Yehova analumbira kupatsa makolo anu mpaka kalekale monga umakhalira mlengalenga pamwamba pa dziko.
22 Ọ bụrụ na unu elezie anya debe iwu niile m na-enye unu taa, na-ahụkwa Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, na-eso ụzọ ya, na-adaberekwa na ya,
Mukatsatira mosamalitsa malamulo amene ndikukupatsaniwa, kukonda Yehova Mulungu wanu, kuyenda mʼnjira zake zonse ndi kumugwiritsitsa Iye
23 Onyenwe anyị ga-achụpụ mba niile bi nʼala ahụ unu na-aga inweta, unu ga-anapụkwa ha ala ahụ, ọ bụladị na ha buru ibu, siekwa ike karịa unu.
Yehova adzapirikitsa mitundu ina yonseyi inu musanafike ndipo mudzagonjetsa mitundu ikuluikulu ndi yamphamvu kuposa inu.
24 Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ unu nʼala ahụ aghọọla nke unu, site na ndịda Negeb ruo Lebanọn, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo Osimiri Mediterenịa. Ha ga-abụ nke unu.
Malo aliwonse amene mudzaponda adzakhala anu: dziko lanu lidzachokera ku chipululu mpaka ku Lebanoni, ndi ku Mtsinje wa Yufurate mpaka ku nyanja ya kumadzulo.
25 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.
Palibe munthu amene adzalimbana nanu. Monga analonjezera, Yehova adzachititsa kuti anthu onse mʼdziko limene mukupitalo adzachite nanu mantha ndi kukuopani.
26 Lee, taa, ana m eche nʼihu unu ngọzị Onyenwe anyị na ọbụbụ ọnụ.
Taonani, lero ndikuyika dalitso ndi temberero pakati panu,
27 Ngọzị ga-adịrị unu ma ọ bụrụ na unu edebe iwu Onyenwe anyị Chineke unu, nke m na-enye unu taa.
dalitso ngati mumvera malamulo a Yehova Mulungu wanu amene ndikukupatsani lero.
28 Nkọcha ahụ ga-adị ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu niile nke Onyenwe anyị, bụ Chineke unu, wezuga onwe unu nʼụzọ ahụ nke m nyere unu nʼiwu taa site nʼịgbaso chi ndị ọzọ, nke unu na-amaghị.
Temberero ngati simumvera malamulo a Yehova Mulungu wanu ndi kupatuka pa njira imene ndikulamulirani lero potsata milungu ina imene simunayidziwe.
29 Mgbe Onyenwe anyị Chineke unu mere ka unu nweta ala ahụ, a ga-esite nʼelu ugwu Gerizim kwupụta ngọzị ga-adịrị unu, a ga-esitekwa nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ ga-adakwasị unu.
Yehova Mulungu wanu akakakufikitsani mʼdziko mukukalandalo kuti mulowemo mukanene za madalitso pa Phiri la Gerizimu, ndi za matemberero pa Phiri la Ebala.
30 Gerizim na Ebal bụ ugwu dị nʼofe Jọdan, nʼakụkụ okporoụzọ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dị nso nʼebe osisi ukwu ndị ahụ toro na More, nʼala ndị Kenan ahụ bi nʼAraba, nʼakụkụ Gilgal.
Monga mudziwa, mapiriwa ali kutsidya kwa Yorodani, kumadzulo kolowera dzuwa, kufupi ndi mitengo ya thundu ya More, mʼdziko la Akanaani aja okhala ku Araba moyangʼanana ndi Giligala.
31 Nʼihi na unu na-aga ịgafe osimiri Jọdan, ịbanye nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu. Mgbe unu nwetara ya biri nʼime ya,
Mwatsala pangʼono kuwoloka Yorodani kuti mulowe ndi kutenga dziko limene Yehova Mulungu wanu akukupatsani. Mukadzalitenga dzikolo ndi kukhalamo,
32 hụnụ na unu rubere isi debe iwu niile na ụkpụrụ niile m na-eche nʼihu unu taa.
mudzaonetsetse kuti mukumvera malangizo ndi malamulo amene ndikukuwuzani lero.

< Diuteronomi 11 >