< Daniel 7 >

1 Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ.
Dans la première année de Balthasar, roi de Babylone, Daniel eut un songe, et des visions se présentèrent à son esprit sur sa couche. Immédiatement il mit par écrit le songe, racontant la substance des choses.
2 “Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri.
Daniel commença et dit: "Je regardais au cours de ma vision nocturne, et voilà que les quatre vents du ciel firent irruption sur la grande mer.
3 Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya.
Et quatre bêtes énormes surgirent du fond de la mer, différentes l’une de l’autre.
4 “Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere.
La première était semblable à un lion et avait des ailes d’aigle; tandis que je regardais, les ailes lui furent arrachées, elle fut soulevée de terre, redressée sur ses pieds comme un homme, et elle reçut un cœur d’homme.
5 “Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’
Puis, ce fut une autre bête, une deuxième, semblable à un ours; elle était soulevée d’un côté et tenait trois côtes dans la gueule, entre ses dents, et on lui disait: "Lève-toi, mange beaucoup de chair."
6 “Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị.
Après cela, je regardai encore, et voilà une autre bête, semblable à une panthère, ayant sur le dos quatre ailes d’oiseau; cette bête avait aussi quatre têtes, et elle reçut la domination en partage.
7 “Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri.
Ensuite, je regardai encore au cours de ma vision nocturne, et voilà une quatrième bête, formidable, terrifiante et extrêmement vigoureuse; elle avait de puissantes dents de fer, elle dévorait et broyait; ce qu’elle laissait, elle le foulait aux pieds. Elle différait de toutes les bêtes qui l’avaient précédée et était munie de dix cornes.
8 “Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.
Je contemplais ces cornes, et voilà qu’une autre corne encore, une petite, monta parmi elles; et trois des premières cornes furent arrachées pour lui faire place. Cette corne avait des yeux pareils à des yeux d’homme et une bouche qui parlait avec arrogance.
9 “Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.
Je continuai à regarder, lorsque des trônes furent dressés et un ancien des jours prit la place. Son vêtement avait la blancheur de la neige, et la chevelure de sa tête, celle de la laine éclatante son trône était des flammes étincelantes et ses roues un feu incandescent.
10 Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.
Un torrent de feu jaillissait et s’épandait devant lui; mille milliers le servaient et dix mille myriades se tenaient en sa présence: le tribunal entra en séance et les livres furent ouverts.
11 “Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ.
Je continuai à regarder: alors, à la suite des paroles arrogantes que proférait la corne, je vis comme la bête fut tuée, son corps détruit et livré à l’action du feu.
12 (Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge).
Quant aux autres bêtes, le pouvoir leur fut également enlevé; mais une prolongation de vie leur fut accordée jusqu’à un temps et un délai déterminés.
13 “Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya.
Je regardai encore dans la vision nocturne, et voilà qu’au sein des nuages célestes survint quelqu’un qui ressemblait à un fils de l’homme; il arriva jusqu’à l’ancien des jours, et on le mit en sa présence.
14 E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.
C’Est à lui que furent données la domination, la gloire et la royauté; l’ensemble des nations, peuples et langues lui rendaient hommage. Sa domination était une domination éternelle, immuable, et sa royauté ne devait plus être détruite.
15 “Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji.
Mon âme, à moi Daniel, défaillit dans son enveloppe corporelle et les visions de mon esprit me jetèrent dans une grande frayeur.
16 Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara. “Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara.
Je m’approchai de l’un des assistants et l’interrogeai sur le sens véritable de tout cela; il me répondit et me fit connaître la signification de ces choses.
17 ‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa.
"Ces bêtes formidables dit-il, qui sont au nombre de quatre, ce sont quatre rois qui s’élèveront sur la terre.
18 Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’
Puis, les saints du Très-Haut recevront la royauté et demeureront en possession de cette royauté jusque dans l’éternité et l’éternité des éternités."
19 “Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ.
Là-dessus, je voulus être fixé sur le compte de la quatrième bête, qui différait de toutes les autres, redoutable à l’excès, qui avait des dents de fer et des griffes d’airain, qui dévorait, broyait et foulait aux pieds ce qui restait,
20 Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ.
ainsi que sur le compte des dix cornes qu’elle portait sur sa tête et de la dernière qui avait poussé, amenant la chute de trois d’entre elles, de cette corne qui avait des yeux et une bouche parlant avec arrogance, et paraissait plus grande que ses devancières.
21 Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa.
Je voyais comme cette corne engageait une guerre avec les saints et triomphait d’eux,
22 Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ.
jusqu’au moment où, l’ancien des jours étant venu, justice fut rendue aux saints du Dieu suprême, et le temps arriva où les saints furent mis en possession de la royauté.
23 “Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile.
Voici quelle fut sa réponse: "La quatrième bête représente un quatrième empire qui s’élèvera sur la terre et se distinguera de tous les empires; il dévorera toute la terre, la foulera et la broiera.
24 Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi.
Les dix cornes, ce sont dix rois qui naîtront de cet empire; et après eux s’en élèvera un autre, différent des précédents, et qui abaissera trois rois.
25 Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara.
II proférera des paroles contre le Très-Haut, opprimera les saints de l’être suprême; il aura la prétention de changer les solennités et la loi; et tous seront livrés entre ses mains durant une période, deux périodes et une demi-période.
26 “‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam.
Puis, la cour de justice tiendra séance, et on lui enlèvera le pouvoir, de façon à le ruiner et à le détruire de fond en comble.
27 Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’
Mais la royauté, la domination et la puissance des royaumes qui sont sous toute l’étendue des cieux seront données au peuple des saints du Très-Haut: son empire sera un empire éternel, et toutes les puissances lui seront assujetties et lui obéiront."
28 “Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.”
Ici se termina la communication. Quant à moi, Daniel, mes réflexions furent pour moi une cause de grande frayeur, mon visage s’en trouva altéré; mais je gardai la chose au fond de mon cœur.

< Daniel 7 >