< Daniel 5 >

1 Eze Belshaza, kpọrọ puku ndịisi nọ nʼalaeze ya oriri, ebe ha nọ ṅụọ nnọọ mmanya dị ukwuu.
King Belshazzar made a great feast to a thousand of his princes, and dranke wine before the thousand.
2 Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.
And Belshazzar whiles he tasted the wine, commanded to bring him the golden and siluer vessels, which his father Nebuchad-nezzar had brought from the Temple in Ierusalem, that the King and his princes, his wiues, and his concubines might drinke therein.
3 Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.
Then were brought the golden vessels, that were taken out of the Temple of the Lords house at Ierusalem, and the King and his princes, his wiues and his concubines dranke in them.
4 Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume.
They drunke wine and praysed the gods of golde, and of siluer, of brasse, of yron, of wood and of stone.
5 Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ.
At the same houre appeared fingers of a mans hand, which wrote ouer against the candlesticke vpon the plaister of the wall of ye Kings palace, and the King sawe the palme of the hand that wrote.
6 Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha.
Then the Kings countenance was changed, and his thoughtes troubled him, so that the ioynts of his loynes were loosed, and his knees smote one against the other.
7 Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.”
Wherefore the King cryed loude, that they should bring the astrologians, the Caldeans and the soothsayers. And the King spake, and sayd to the wise men of Babel, Whosoeuer can reade this writing, and declare me the interpretation thereof, shalbe clothed with purple, and shall haue a chaine of golde about his necke, and shall be the third ruler in the kingdome.
8 Mgbe ahụ, ndị amamihe eze batara, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha pụrụ ịgụta, maọbụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara.
Then came all the Kings wise men, but they could neither reade the writing, nor shewe the King the interpretation.
9 Nke a mere, ka eze Belshaza maa jijiji karịa, ihu ya gburu maramara ma gbarụkwaa. Ọ gbakwara ndị ozi ya gharịị.
Then was King Belshazzar greatly troubled, and his countenance was changed in him, and his princes were astonied.
10 Mgbe eze nwanyị, nụrụ olu eze na olu ndị a mara aha ha nʼala ya, ọ batara nʼụlọ oriri ahụ. Eze nwanyị sịrị, “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; ka ihe a mere ghara iwetara gị ihu mgbarụ, atụla ụjọ.
Now the Queene by reason of the talke of the King, and his princes came into the banket house, and the Queene spake, and sayd, O King, liue for euer: let not thy thoughtes trouble thee, nor let thy countenance be changed.
11 Nʼihi na o nwere otu nwoke nọ nʼalaeze gị, onye mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ bi nʼime ya. Nʼoge ahụ nna gị bụ eze, a chọpụtara na nwoke a jupụtara nʼamamihe na nghọta, dịka a ga-asị na ya onwe ya bụ chi. Nna gị eze Nebukadneza mere ya onyeisi ndị amamihe niile, ndị dibịa, ndị na-enyocha kpakpando, ndị Kaldịa na ndị mgba afa niile.
There is a man in thy kingdome, in whom is the spirit of the holy gods, and in the dayes of thy father light and vnderstanding and wisdome like the wisdome of the gods, was found in him: whom the King Nebuchad-nezzar thy father, the King, I say, thy father, made chiefe of the enchanters, astrologians, Caldeans, and soothsayers,
12 Ebe ọ bụ na ezigbo mmụọ, mmụta na nghọta nke e ji akọwa nrọ na ihe mgbagwoju anya, na igbo mkpa dị iche iche, dị nʼime nwoke a a na-akpọ Daniel, nke eze kpọrọ Belteshaza. Ugbu a, zie ozi ka a kpọọ Daniel ka ọ kọwara gị ihe a.”
Because a more excellent spirit, and knowledge, and vnderstanding (for hee did expound dreames, and declare hard sentences, and dissolued doubtes) were founde in him, euen in Daniel, whome the King named Belteshazzar: nowe let Daniel be called, and hee will declare the interpretation.
13 Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda?
Then was Daniel brought before the King, and the King spake and sayd vnto Daniel, Art thou that Daniel, which art of the children of the captiuitie of Iudah, whom my father the King brought out of Iewrie?
14 Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe.
Now I haue heard of thee, that the spirit of the holy gods is in thee, and that light and vnderstanding and excellent wisdome is found in thee.
15 Ndị amamihe m, na ndị na-enyocha kpakpando abịala nʼihu m ịgụ ihe ahụ e dere nʼaja ụlọ ma ha enweghị ike ịgụta ya maọbụ ịkọwa ihe ọ bụ.
Now therefore, wisemen and astrologians haue bene brought before me, that they should reade this writing, and shewe me the interpretation thereof: but they could not declare the interpretation of the thing.
16 Agwara m na i nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe e dere nʼaja ma kọwakwara m ihe ọ pụtara, aga m eyikwasị gị uwe odo odo ndị eze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo nʼolu, meekwa ka i bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze m.”
Then heard I of thee, that thou couldest shewe interpretations, and dissolue doutes: nowe if thou canst reade the writing, and shew me the interpretation thereof, thou shalt be clothed with purple, and shalt haue a chaine of golde about thy necke, and shalt be the third ruler in the kingdome.
17 Daniel zara nʼihu eze, “Debere onwe gị onyinye gị, ma ọ bụkwanụ were ya nye onye ọzọ. Ma aga m agụrụ gị eze ihe ahụ e dere ma kọwakwara gị ihe ọ pụtara.
Then Daniel answered, and sayd before the King, Keepe thy rewards to thy selfe, and giue thy giftes to another: yet I will reade the writing vnto the King, and shew him the interpretation.
18 “Gị eze, Chineke nke kachasị ihe niile elu nyere nna gị, Nebukadneza ike ọchịchị a, na ịdị ukwu, na ebube, na ịma mma.
O King, heare thou, The most high God gaue vnto Nebuchad-nezzar thy father a kingdome, and maiestie, and honour and glory.
19 Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala.
And for the maiestie that he gaue him, all people, nations, and languages trembled, and feared before him: he put to death whom he would: he smote whome he would: whome he would he set vp, and whome he would he put downe.
20 Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze.
But when his heart was puft vp, and his minde hardened in pride, hee was deposed from his kingly throne, and they tooke his honour from him.
21 A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa.
And hee was driuen from the sonnes of men, and his heart was made like the beastes, and his dwelling was with the wilde asses: they fed him with grasse like oxen, and his body was wet with the dewe of the heauen, till he knewe, that the most high God bare rule ouer the kingdome of men, and that he appointeth ouer it, whomsoeuer he pleaseth.
22 “Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile.
And thou his sonne, O Belshazzar, hast not humbled thine heart, though thou knewest all these things,
23 Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ.
But hast lift thy selfe vp against the Lord of heauen, and they haue brought the vessels of his House before thee, and thou and thy princes, thy wiues and thy concubines haue drunke wine in them, and thou hast praysed the gods of siluer and golde, of brasse, yron, wood and stone, which neither see, neither heare, nor vnderstand: and the God in whose hand thy breath is and all thy wayes, him hast thou not glorified.
24 Ọ bụ nke a mere o ji zite aka ahụ ị hụrụ, nke depụtara ozi a.
Then was the palme of the hand sent from him, and hath written this writing.
25 “Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin
And this is the writing that he hath written, MENE, MENE, TEKEL UPHARSIN.
26 “Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe.
This is the interpretation of the thing, MENE, God hath nombred thy kingdome, and hath finished it.
27 “Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ.
TEKEL, thou art wayed in the balance, and art found too light.
28 “Parsin, ekewala alaeze gị nyefee ya nʼaka ndị Midia na Peshịa.”
PERES, thy kingdome is deuided, and giuen to the Medes and Persians.
29 Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ.
Then at the commandement of Belshazzar they clothed Daniel with purple, and put a chaine of golde about his necke, and made a proclamation concerning him that he should be the third ruler in the kingdome.
30 Nʼabalị ụbọchị ahụ kwa ka e gburu Belshaza eze ndị Kaldịa.
The same night was Belshazzar the King of the Caldeans slaine.
31 Nʼabalị ahụ kwa ka Daraiọs onye Midia, bidoro ịchị dịka eze. Ọ gbara iri afọ isii na abụọ nʼoge o bidoro ịchị.
And Darius of the Medes tooke the kingdome, being threescore and two yeere olde.

< Daniel 5 >