< Daniel 10 >
1 Nʼafọ atọ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, e nyere Daniel (onye aha ya bụkwa Belteshaza mkpughe). Ozi ahụ bụ eziokwu, ọ gbasakwara oke ọgbaaghara. Ọ ghọtara ozi ahụ, nwetakwa nkọwa banyere ọhụ ahụ.
波斯王居魯士第三年,那名叫貝耳特沙匝的達尼爾得了一個啟示,這啟示是真實的,是有關一場大戰的事;達尼爾注意了這事,也明白了這異象。
2 Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ.
在這些日子裏,我達尼爾憂悶了三個星期,
3 Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile.
我食不知味,酒肉也沒有沾過唇,也沒有用油抹過身,直到滿了三個星期。
4 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris,
正月二十四日,我在底格里斯大河邊時,
5 eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya.
我舉目觀望:看見有一個人身穿麻衣,腰束敖非爾金帶,
6 Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.
他的身體好像碧玉,他的面容好似閃電,他的眼睛有如火炬,他的手臂和腿有如磨光了的銅,他說話的聲音彷彿群眾的喧嚷。
7 Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha.
惟獨我達尼爾看見了這異象,隨從我的人都沒有看見,只有一種巨大的恐怖臨到他們身上,因而他們都逃避隱藏了。
8 Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ.
只留下我一個人,獨自觀看這巨大的異象;我頓時全身無力,容貌改變,面色蒼白,沒有一點氣力,
9 Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra.
但仍能聽到他說話的聲音;一聽到他說話的聲音,我就昏迷過去,俯伏於地。
10 Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ.
忽然有一隻手觸摸我,使我用膝和手掌勉強支持,
11 Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji.
然後他對我說:「達尼爾,最可愛的人! 你要明白我對你所說的話! 你站起來,因為我現在是被派到你這裏來的。」他對說這話時,我站立起來,渾身戰慄。
12 Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha.
他又對我說:「達尼爾,你不要害怕! 因為自從你下決心要明白此事,在你的天主前,自卑自賤的第一天以來,你的祈禱就得蒙應允,我就是因你的祈禱而來的。
13 Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa.
但是波斯國的護守天使卻反對我,使我在波斯國護守天使那裏滯留了二十一天,後來忽有總領護守天使之一的彌額爾前來協助我,
14 Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.”
我纔來了,為叫你明白,你的百姓在末日所要遭遇的事,因為這神視是有關那未來之日的。」
15 Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla.
他對我說這些話時,我俯首至地,啞口無言。
16 Mgbe ahụ, otu onye, nke yiri mmadụ, bịara metụ egbugbere ọnụ m aka, mee ka m nwee ike ikwukwa okwu ọzọ. Mgbe ahụ agwara m onye ahụ nke guzo m nʼihu, “Anọ m nʼoke ihe mgbu; Onyenwe m, enwekwaghị m ike ọbụla, nʼihi ọhụ m hụrụ.
忽然有個像人子的手,觸摸了我的唇,我便開口向那站在我面前的說道:「我主! 由於這異象,我又感到非常痛苦,沒有一點氣力。
17 Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.”
我主的這個僕人如何能同我主說話﹖因為我現在全身無力,連呼吸也沒有了。」
18 Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike.
那像人子的又撫摸了我,堅固我,
19 Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.” Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.”
說:「極可愛的! 不要害怕! 願你平安! 鼓起勇氣,振作精神! 」他一對我說話,我立刻覺得有了力量,於是我說:「我主,請你發言罷! 因為你堅固了我。」
20 Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa;
他於是說:「你知道我為什麼到你這裏來﹖現在我要回去,同波斯的護守天使交戰。我一去,希臘的護守天使就會前來。
21 ma otu ọ dị, aga m agwa gị ihe e dere nʼakwụkwọ nke eziokwu. (Ọ dịghị onye na-enyere m aka imegide ha ma ọ bụghị naanị Maikel onyeisi unu.
我要把載於真理書上的事告訴你。除了你們的護守天使彌額爾外,沒有前來協助我的。