< Daniel 1 >
1 Mgbe afọ atọ gafere site na mgbe Jehoiakim bidoro bụrụ eze na-achị Juda, Nebukadneza eze na-achị Babilọn bịara buso Jerusalem agha.
Године треће царовања Јоакима, цара Јудиног дође Навуходоносор, цар вавилонски на Јерусалим, и опколи га.
2 Onyenwe anyị nyefere Jehoiakim, eze Juda nʼaka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma. O buuru ha niile gawa Shaịna nʼụlọ chi ya, dobe ha nʼime nʼụlọakụ chi ya.
И Господ му даде у руку Јоакима, цара Јудиног и део судова дома Божијег, и однесе их у земљу Сенар у дом бога свог, и метну судове у ризницу бога свог.
3 Eze nyere Ashipenaz, onyeisi ndị ozi ya iwu ka ọ kpọbata ụmụ okorobịa sitere nʼezinaụlọ eze na nke ndị ọchịchị nʼala Izrel nʼije ozi eze.
И рече цар Асфеназу старешини својих дворана да доведе између синова Израиљевих, и од царског семена и од кнезова,
4 Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa.
Младиће на којима нема мане, и који су лепог лица и научени свакој мудрости и вешти знању и разумни и који могу стајати у царском двору, па да их учи књигу и језик халдејски.
5 Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze.
И одреди им цар оброк на дан од јела царског и од вина које он пијаше, да се хране три године, а после да стоје пред царем.
6 Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda.
А међу њима беху од синова Јудиних Данило, Ананија, Мисаило и Азарија.
7 Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
А старешина над дворанима даде им имена, и Данилу наде име Валтасар, а Ананији Седрах, а Мисаилу Мисах, а Азарији Авденаго.
8 Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.
Али Данило науми да се не скврни оброком јела царевог и вином које он пијаше, и замоли се старешини над дворанима да се не скврни.
9 Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha.
И даде Бог Данилу те нађе милост и љубав у старешине над дворанима.
10 Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”
И рече старешина над дворанима Данилу: Бојим се господара свог цара, који вам је одредио јело и пиће; јер кад цар види лица ваша лошија него у осталих младића, ваших врсника, зашто да ми учините да будем главом крив цару?
11 Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka,
А Данило рече Амелсару, ког старешина над дворанима постави над Данилом, Ананијом, Мисаилом и Азаријом:
12 “Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri.
Огледај слуге своје за десет дана, нека нам се даје вариво да једемо и вода да пијемо.
13 Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.”
Па онда нека нам се виде лица пред тобом и лица младића који једу царско јело, па како видиш, онако чини са слугама својим.
14 O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.
И послуша их у том, и огледа их за десет дана.
15 Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ.
А после десет дана лица им дођоше лепша и меснатија него у свих младића који јеђаху царско јело.
16 Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.
И Амелсар узимаше јело њихово и вино које њима требаше пити, и даваше им варива.
17 Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
И даде Бог свој четворици младића знање и разум у свакој књизи и мудрости; а Данилу даде да разуме сваку утвару и сне.
18 Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza.
И кад прође време по коме цар беше рекао да их изведу, изведе их старешина над дворанима пред Навуходоносора.
19 Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ.
И говори цар с њима, и не нађе се међу свима њима ни један као Данило, Ананија, Мисаило и Азарија; и стајаху пред царем.
20 Mgbe ọ bụlakwa eze chọrọ ndụmọdụ banyere amamihe na nghọta, ọ na-achọpụta na ndụmọdụ ha na-enye ya na-adị mma okpukpu iri karịa ndụmọdụ nke ndị majiki ya na ndị maara ihe banyere kpakpando nọ nʼalaeze ya na-enye ya.
И у свему чему треба мудрост и разум, за шта их цар запита, нађе да су десет пута бољи од свих врача и звездара што их беше у свему царству његовом.
21 Daniel nọgidere bụrụ onye na-adụ eze ọdụ tutu ruo afọ mbụ nke Sairọs bidoro ịchị dịka eze.
И оста Данило до прве године цара Кира.