< Ndị Kọlọsị 4 >

1 Unu ndị nwe odibo, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na ikpe ziri ezi na-emeso ndị ohu unu omume, ebe unu maara na unu onwe unu nwere onyenwe unu nʼeluigwe.
主人たちよ。あなたがたは、自分たちの主も天におられることを知っているのですから、奴隷に対して正義と公平を示しなさい。
2 Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele.
目をさまして、感謝をもって、たゆみなく祈りなさい。
3 Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ,
同時に、私たちのためにも、神がみことばのために門を開いてくださって、私たちがキリストの奥義を語れるように、祈ってください。この奥義のために、私は牢に入れられています。
4 ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri.
また、私がこの奥義を、当然語るべき語り方で、はっきり語れるように、祈ってください。
5 Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma.
外部の人に対して賢明にふるまい、機会を十分に生かして用いなさい。
6 Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
あなたがたのことばが、いつも親切で、塩味のきいたものであるようにしなさい。そうすれば、ひとりひとりに対する答え方がわかります。
7 Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m.
私の様子については、主にあって愛する兄弟、忠実な奉仕者、同労のしもべであるテキコが、あなたがたに一部始終を知らせるでしょう。
8 Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume.
私がテキコをあなたがたのもとに送るのは、あなたがたが私たちの様子を知り、彼によって心に励ましを受けるためにほかなりません。
9 Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a.
また彼は、あなたがたの仲間のひとりで、忠実な愛する兄弟オネシモといっしょに行きます。このふたりが、こちらの様子をみな知らせてくれるでしょう。
10 Arịstakọs, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. (Onye unu natara ihe ntụziaka banyere ya, ọ bụrụ na ọ bịarute nʼebe unu nọ, unu nabata ya nke ọma.)
私といっしょに囚人となっているアリスタルコが、あなたがたによろしくと言っています。バルナバのいとこであるマルコも同じです。――この人については、もし彼があなたがたのところに行ったなら、歓迎するようにという指示をあなたがたは受けています。――
11 Jisọs, onye a na-akpọkwa Jọstus, na-ekelekwa unu. Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị Juu mụ na ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nʼebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ.
ユストと呼ばれるイエスもよろしくと言っています。割礼を受けた人では、この人たちだけが、神の国のために働く私の同労者です。また、彼らは私を激励する者となってくれました。
12 Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nʼime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge niile ka ọ na-ekpe ekpere nʼihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike bụrụ ndị tozuru etozu na ndị kwesiri ike nʼọchịchọ niile nke Chineke.
あなたがたの仲間のひとり、キリスト・イエスのしもべエパフラスが、あなたがたによろしくと言っています。彼はいつも、あなたがたが完全な人となり、また神のすべてのみこころを十分に確信して立つことができるよう、あなたがたのために祈りに励んでいます。
13 Ana m agbara ya akaebe na ọ rụsịrị ọrụ ike nʼihi unu na nʼihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis.
私はあかしします。彼はあなたがたのために、またラオデキヤとヒエラポリスにいる人々のために、非常に苦労しています。
14 Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu.
愛する医者ルカ、それにデマスが、あなたがたによろしくと言っています。
15 Keleerenụ m ụmụnna anyị bi na Laodisia na nwanna anyị Nimfas na chọọchị na-ezukọ nʼụlọ ya.
どうか、ラオデキヤの兄弟たちに、またヌンパとその家にある教会に、よろしく言ってください。
16 Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na Laodisia. Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na Laodisia bịa.
この手紙があなたがたのところで読まれたなら、ラオデキヤ人の教会でも読まれるようにしてください。あなたがたのほうも、ラオデキヤから回って来る手紙を読んでください。
17 Gwanụ Akipos ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ Onyenwe anyị nyere ya ịrụ.
アルキポに、「主にあって受けた務めを、注意してよく果たすように。」と言ってください。
18 Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.
パウロが自筆であいさつを送ります。私が牢につながれていることを覚えていてください。どうか、恵みがあなたがたとともにありますように。

< Ndị Kọlọsị 4 >