< Emọs 8 >

1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara.
Thus has Lord YHWH showed me, and behold, a basket of summer-fruit.
2 Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”
And He says, “What are you seeing, Amos?” And I say, “A basket of summer-fruit.” And YHWH says to me: “The end has come to My people Israel, I no longer pass over to it anymore.
3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”
And female singers have howled of a palace in that day,” A declaration of Lord YHWH, “Many [are] the carcasses, into any place throw—hush!”
4 Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa, na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,
Hear this, you who are swallowing up the needy, To cause the poor of the land to cease,
5 na-asị, “Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe ka anyị ree mkpụrụ ubi, na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ ka anyị ree ọka wiiti?” Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta, na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu, na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.
Saying, “When does the new moon pass, And we sell ground grain? And the Sabbath, and we open out pure grain? To make little the ephah, And to make great the shekel, And to use balances of deceit perversely.
6 Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye, jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa, ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.
To purchase the poor with money, And the needy for a pair of sandals, Indeed, the refuse of the pure grain we sell.”
7 Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”
YHWH has sworn by the excellence of Jacob: “I do not forget any of their works forever.
8 Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a, ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ? Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl, a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa dịka iyi Ijipt.
Does the land not tremble for this, And every dweller in it has mourned? And all of it has come up as a flood. And it has been cast out, and has sunk, Like the flood of Egypt.
9 “Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie, ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
And it has come to pass in that day,” A declaration of Lord YHWH, “I have caused the sun to go in at noon, And caused darkness on the land in a day of light,
10 Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ; gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa. Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe, meekwa ka unu kpụchaa isi unu. Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ. Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.
And have turned your festivals to mourning, And all your songs to lamentation, And caused sackcloth to come up on all loins, And on every head—baldness, And made it as a mourning of an only one, And its latter end as a day of bitterness.
11 “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala, ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.
Behold, days are coming,” A declaration of Lord YHWH, “And I have sent a famine into the land, Not a famine of bread, nor a thirst of water, But of hearing the words of YHWH.
12 Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, ma ha agaghị achọta ya.
And they have wandered from sea to sea, And from north even to east, They go to and fro to seek the word of YHWH, And they do not find [it].
13 “Nʼụbọchị ahụ, “ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
In that day the beautiful virgins, And the young men, faint with thirst.
14 Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi, ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’ nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’ ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”
Those swearing by the guilt of Samaria, And who have said, Your god lives, O Dan, And, The way of Beer-Sheba lives, Indeed, they have fallen and do not rise again!”

< Emọs 8 >