< Emọs 7 >

1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka m hụ. Lee, ọ na-akwado igwe igurube nke ga-abịa bibie ihe ubi niile ga-etopụta mgbe e burula ụzọ wee ihe ubi nke mbụ nke a na-enye eze, dịka ihe ruuru ya.
This is what the Lord GOD showed me: He was preparing swarms of locusts just after the king’s harvest, as the late spring crop was coming up.
2 Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.”
And when the locusts had eaten every green plant in the land, I said, “Lord GOD, please forgive! How will Jacob survive, since he is so small?”
3 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onyenwe anyị kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
So the LORD relented from this plan. “It will not happen,” He said.
4 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile.
This is what the Lord GOD showed me: The Lord GOD was calling for judgment by fire. It consumed the great deep and devoured the land.
5 Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!”
Then I said, “Lord GOD, please stop! How will Jacob survive, since he is so small?”
6 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
So the LORD relented from this plan. “It will not happen either,” said the Lord GOD.
7 Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya.
This is what He showed me: Behold, the Lord was standing by a wall true to plumb, with a plumb line in His hand.
8 Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.
“Amos, what do you see?” asked the LORD. “A plumb line,” I replied. “Behold,” said the Lord, “I am setting a plumb line among My people Israel; I will no longer spare them:
9 “Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.”
The high places of Isaac will be deserted, and the sanctuaries of Israel will be laid waste; and I will rise up against the house of Jeroboam with My sword.”
10 Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.
Then Amaziah the priest of Bethel sent word to Jeroboam king of Israel, saying, “Amos has conspired against you in the midst of the house of Israel. The land cannot bear all his words,
11 Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị, “‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha, Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.’”
for this is what Amos has said: ‘Jeroboam will die by the sword, and Israel will surely go into exile, away from their homeland.’”
12 Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.
And Amaziah said to Amos, “Go away, you seer! Flee to the land of Judah; earn your bread there and do your prophesying there.
13 Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.”
But never prophesy at Bethel again, because it is the sanctuary of the king and the temple of the kingdom.”
14 Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ.
“I was not a prophet,” Amos replied, “nor was I the son of a prophet; rather, I was a herdsman and a tender of sycamore-fig trees.
15 Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’
But the LORD took me from following the flock and said to me, ‘Go, prophesy to My people Israel.’
16 Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’
Now, therefore, hear the word of the LORD. You say: ‘Do not prophesy against Israel; do not preach against the house of Isaac.’
17 “Ya mere, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo. Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo. A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ, ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ. A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’”
Therefore this is what the LORD says: ‘Your wife will become a prostitute in the city, and your sons and daughters will fall by the sword. Your land will be divided by a measuring line, and you yourself will die on pagan soil. And Israel will surely go into exile, away from their homeland.’”

< Emọs 7 >