< Emọs 7 >

1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka m hụ. Lee, ọ na-akwado igwe igurube nke ga-abịa bibie ihe ubi niile ga-etopụta mgbe e burula ụzọ wee ihe ubi nke mbụ nke a na-enye eze, dịka ihe ruuru ya.
Zimene Ambuye Yehova anandionetsa ndi izi: Yehova ankasonkhanitsa gulu la dzombe nthawi imene gawo la zokolola za mfumu linali litakololedwa kale ndipo mbewu zachiwiri zinali zitangoyamba kumera kumene.
2 Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.”
Dzombelo litadya zomera zonse za mʼdzikomo, Ine ndinafuwula kuti, “Ambuye Yehova, khululukani! Kodi Yakobo adzapulumuka bwanji? Iye ndi wofowoka kwambiri!”
3 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onyenwe anyị kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
Kotero Yehova anakhululuka. Yehovayo anati, “Izi sizidzachitika.”
4 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile.
Zimene Ambuye Yehova anandionetsa ndi izi: Ambuye Yehova ankayitana malawi a moto kuti alange anthu. Motowo unawumitsa nyanja yakuya ndi kupsereza dziko.
5 Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!”
Tsono ine ndinafuwula kuti, “Ambuye Yehova, chonde ndikukupemphani, lekani! Kodi Yakobo adzapulumuka bwanji? Iye ndi wofowoka kwambiri!”
6 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”
Kotero Yehova anakhululuka. Ambuye Yehova anati, “Izinso sizidzachitika.”
7 Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya.
Zimene Iye anandionetsa ndi izi: Ambuye anayima pambali pa khoma lomangamanga, mʼmanja mwake muli chingwe chowongolera khoma.
8 Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.
Ndipo Ambuye anandifunsa kuti, “Amosi, nʼchiyani ukuonachi?” Ine ndinayankha kuti, “Chingwe chowongolera khoma.” Ndipo Yehova anati, “Taona, Ine ndikuyika chingwe chowongolerachi pakati pa anthu anga, Aisraeli; sindidzawalekereranso.
9 “Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.”
“Malo achipembedzo a Isake adzawonongedwa ndipo malo opatulika a Israeli adzasanduka bwinja; ndidzagwetsa nyumba ya Yeroboamu ndi lupanga langa.”
10 Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.
Pamenepo Amaziya wansembe wa ku Beteli anatumiza uthenga kwa Yeroboamu mfumu ya Israeli kuti, “Amosi akukuutsirani chiwembu pakati pa Aisraeli. Dziko silingalekerere zonena zake zonsezo.
11 Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị, “‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha, Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.’”
Pakuti zimene Amosi akunena ndi izi: “‘Yeroboamu adzaphedwa ndi lupanga, ndipo Israeli adzapita ndithu ku ukapolo, kutali ndi dziko lake.’”
12 Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.
Ndipo Amaziya anawuza Amosi kuti, “Choka, mlosi iwe! Bwerera ku dziko la Yuda. Uzikalosera kumeneko ndipo anthu a kumeneko azikakudyetsa.
13 Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.”
Usanenerenso ku Beteli, chifukwa kumeneko ndi malo opatulika a mfumu ndiponso ndi malo a nyumba yachipembedzo yaufumu.”
14 Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ.
Amosi anayankha Amaziya kuti, “Ine sindine mneneri kapena mwana wa mneneri; koma ndine woweta ziweto, ndiponso mlimi wa nkhuyu.
15 Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’
Koma Yehova ananditenga ndikuweta nkhosa ndipo anati, ‘Pita ukanenere kwa anthu anga Aisraeli.’
16 Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị, “‘Ebula amụma megide Izrel, ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’
Tsono imva mawu a Yehova. Iwe ukunena kuti, “‘Usanenere zotsutsa Israeli, ndipo siya kulalikira motsutsa nyumba ya Isake.’”
17 “Ya mere, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo. Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo. A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ, ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ. A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’”
“Tsono zimene akunena Yehova ndi izi: “‘Mkazi wako adzasanduka wachiwerewere mu mzindamu, ndipo ana ako aamuna ndi aakazi adzaphedwa ndi lupanga. Munda wako udzayezedwa ndi chingwe ndi kugawidwa, ndipo iwe mwini udzafera mʼdziko la anthu osapembedza Mulungu. Ndipo Israeli adzatengedwa ndithu kupita ku ukapolo, kutali ndi dziko lake.’”

< Emọs 7 >