< Emọs 6 >

1 Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn, na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria, bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile, ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute.
國為列國之首,人最著名, 且為以色列家所歸向, 在錫安和撒馬利亞山安逸無慮的,有禍了!
2 Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya, site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ, mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma? Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?
你們要過到甲尼察看, 從那裏往大城哈馬去, 又下到非利士人的迦特, 看那些國比你們的國還強嗎? 境界比你們的境界還寬嗎?
3 Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.
你們以為降禍的日子還遠, 坐在位上盡行強暴。
4 Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi, na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.
你們躺臥在象牙床上,舒身在榻上, 吃群中的羊羔,棚裏的牛犢;
5 Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara, ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.
彈琴鼓瑟唱消閑的歌曲, 為自己製造樂器,如同大衛所造的;
6 Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba; na-ete mmanụ makarịsịrị mma, ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.
以大碗喝酒,用上等的油抹身, 卻不為約瑟的苦難擔憂。
7 Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ. Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.
所以這些人必在被擄的人中首先被擄; 舒身的人荒宴之樂必消滅了。
8 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela onwe ya ṅụọ iyi, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ekwupụtala sị, “Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m; ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị. Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.”
主耶和華-萬軍之上帝指着自己起誓說: 我憎惡雅各的榮華,厭棄他的宮殿; 因此,我必將城和其中所有的都交付敵人。
9 Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ.
那時,若在一房之內剩下十個人,也都必死。
10 Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha Onyenwe anyị.”
死人的伯叔,就是燒他屍首的,要將這屍首搬到房外,問房屋內間的人說:「你那裏還有人沒有?」他必說:「沒有」;又說:「不要作聲,因為我們不可提耶和華的名。」
11 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu. Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ, tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.
看哪,耶和華出令, 大房就被攻破, 小屋就被打裂。
12 Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume? Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri? Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi, mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.
馬豈能在崖石上奔跑? 人豈能在那裏用牛耕種呢? 你們卻使公平變為苦膽, 使公義的果子變為茵蔯。
13 Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba, ndị na-asị, “Ọ bụghị site nʼike aka anyị ka anyị nwetakwara Kanaịm?”
你們喜愛虛浮的事,自誇說: 我們不是憑自己的力量取了角嗎?
14 “Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Ha ga-emekpa unu ahụ site nʼụzọ niile site na Lebo Hamat ruo ndagwurugwu Araba.”
耶和華、萬軍之上帝說: 以色列家啊,我必興起一國攻擊你們; 他們必欺壓你們, 從哈馬口直到亞拉巴的河。

< Emọs 6 >