< Emọs 3 >

1 Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.
Ku ji wannan maganar da Ubangiji ya yi game da ku, ya ku jama’ar Isra’ila, a kan dukan iyalin da na fitar daga Masar.
2 “Naanị unu ka m họọrọ nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa; Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ nʼihi mmehie unu niile.”
“Ku ne kaɗai na zaɓa cikin dukan al’umman duniya; saboda haka zan hukunta ku saboda dukan zunubanku.”
3 Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?
Mutum biyu za su iya yin tafiya tare in ba su yarda su yi haka ba?
4 Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya, mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?
Zaki yakan yi ruri a jeji in bai sami kama nama ba? Zai yi gurnani a cikin kogonsa in bai kama kome ba?
5 Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya? Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?
Tsuntsu yakan fāɗa a tarko a ƙasa inda ba a sa tarko ba, ko tarko yakan zargu daga ƙasa in ba abin da ya taɓa shi?
6 Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?
Idan aka busa ƙaho a ciki birni mutane ba sa yin rawar jiki? Sa’ad da bala’i ya auko wa birni, ba Ubangiji ne ya sa a kawo shi ba?
7 Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.
Ba shakka, Ubangiji Mai Iko Duka ba ya yin wani abu ba tare da ya sanar wa bayinsa annabawa ba.
8 Ọdụm agbọọla ụja, o nwere onye na-agaghị atụ egwu? Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu, onye ga-ahapụ ibu amụma?
Zaki ya yi ruri, wa ba zai tsorata ba? Ubangiji Mai Iko Duka ya yi magana, wa ba zai yi annabci ba?
9 Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị, “Zukọtanụ nʼelu ugwu niile nke Sameria ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.”
Ku yi shela ga kagarun Ashdod da kuma ga kagarun Masar. “Ku tara kanku a tuddan Samariya; ku ga rashin jituwar da take a cikinta, da kuma zaluncin da ake yi a cikin mutanenta.”
10 “Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”
“Ba su ma san yadda za su yi abin da yake daidai ba,” in ji Ubangiji, “sun ɓoye ganima da abubuwan da suka washe a cikin kagarunsu.”
11 Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu; ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike, ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.”
Saboda haka ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka ya ce, “Abokin gāba zai ƙwace ƙasar, zai saukar da mafakarku, zai washe kagarunku.”
12 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm, otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria, na nkuku isi ihe ndina na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.”
Ga abin da Ubangiji ya ce, “Kamar yadda makiyayi yakan ceci daga bakin zaki ƙasusuwa ƙafafu biyu kawai ko kunne ɗaya, haka za a ceci Isra’ilawa, masu zama a Samariya da kan gado kawai da kuma a ɗan ƙyalle a kan dogayen kujerunsu.”
13 “Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.
“Ku ji wannan ku kuma yi wa gidan Yaƙub gargaɗi,” in ji Ubangiji, Ubangiji Allah Maɗaukaki.
14 “Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha, aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel. Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa, mee ka ha daa nʼala.
“A ranar da zan hukunta Isra’ila saboda zunubanta, zan hallaka bagadan Betel; za a yayyanka ƙahonin bagadan za su fāɗa ƙasa
15 Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi, na nke ha wuru maka oge okpomọkụ; aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo. Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Zan rushe gidan rani da na damina; gidajen da aka yi musu ado da hauren giwa za a rushe su haka ma duk za a rurrushe manyan gidaje,” in ji Ubangiji.

< Emọs 3 >