< Emọs 2 >

1 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.
Hivi ndivyo Yahwe asemavyo: “Kwa dhambi tatu za Moabu, hata kwa nne, sintobadilisha adhabu, kwa sababu amechoma moto mifupa ya mfalme wa Edomu hadi kuwa chokaa.
2 Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.
Nitatuma moto juu ya Moabu, na utaangamiza ngome za Keriothi. Moabu atakufa katika gasia, pamoja na kelele na sauti ya tarumbeta.
3 Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
Nitamuharibu mwamuzi kati yake, na nitawaua wana wa mfalme pamoja na yeye,” asema Yahwe.
4 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.
Hivi ndivyo Yahwe asemavyo: “Kwa dhambi tatu za Yuda, hata kwa nne, sintobadilisha adhabu, kwa sababu wameikataa sheria ya Yahwe na hawakuzishika amri zake. Uongo wao umesababisha kupotea, ambao baba zao pia waliufuata.
5 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
Nitatuma moto juu ya Yuda, na utaimeza ngome ya Yerusalemu.”
6 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
Hivi ndivyo Yahwe asemavyo: “Kwa dhambi tatu za Israeli, hata kwa nne, sintobadilisha adhabu, kwa sababu wamewauza wasio na hatia kwa fedha na maskini kwa jozi moja ya makubadhi.
7 Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị, na-echi ha ọnụ nʼaja, na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe. Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ, si otu a merụọ aha nsọ m.
Nao hukanyaga juu ya vichwa vya maskini kama kukanyaga kwenye mavumbi juu ya aridhi; wanasukuma kukandamiza. Mtu mmoja na baba yake walilala na msichana mmoja na hivyo kukufuru jina langu takatifu.
8 Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
Nao hulala chini karibu na kila madhabahu kwenye nguo zilizowekwa dhamana, na katika nyumba ya Mungu wao hunywa divai ya wale ambao walitozwa faini.
9 “Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.
Bado nimemwangamiza Mwamori mbele yao, ambaye urefu wake ulikuwa kama urefu wa mierezi; alikuwa na nguvu kama mialoni. Kisha nikaharibu matunda yake juu na mizizi yake chini.
10 Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu, duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ, ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.
Pia, niliwapandisha kutoka nchi ya Misri na kuwaongoza miaka arobaini nyikani ili mmiliki nchi ya Wamori.
11 “Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
Nimewainua manabii kutoka miongoni mwa watoto wanu wawe Wanadhiri kutoka vijana wenu. Je sio hivyo, watu wa Israeli? -hivi ndivyo Yahwe asemavyo.
12 “Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya. Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
Lakini mmewashawishi Wanadhiri kunywa mvinyo na kuwaamuru manabii wasifanye unabii.
13 “Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
Tazama, nitawakanyaga kama mkokoteni uliojaa miganda inayoweza kumkanyaga mtu.
14 Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
Mtu akimbiaye hatapata kimbilio; mwenye nguvu hatoongeza nguvu zake mwenyewe; wala shujaa kujiokoa mwenyewe.
15 Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.
Apindaye upinde hatasimama; mkimbiaji sana hatakimbia; mwendesha farasi hatajiokoa mwenyewe.
16 Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu, ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Hata wapiganaji shujaa watakimbia uchi katika siku hiyo -hivi ndivyo Yahwe asemavy.”

< Emọs 2 >