< Emọs 1 >

1 Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị.
Àwọn ọ̀rọ̀ Amosi, ọ̀kan lára àwọn olùṣọ́-àgùntàn Tekoa; ohun tí o rí nípa Israẹli ní ọdún méjì ṣáájú ilẹ̀-rírì, nígbà tí Ussiah ọba Juda àti Jeroboamu ọmọ Jehoaṣi jẹ́ ọba ní ilẹ̀ Israẹli.
2 Ọ sịrị, Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.
Ó wí pé, “Olúwa yóò bú jáde láti Sioni, ohùn rẹ̀ yóò sì sán bí àrá láti Jerusalẹmu wá; ibùgbé àwọn olùṣọ́-àgùntàn yóò sì ṣọ̀fọ̀, orí òkè Karmeli yóò sì rọ.”
3 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs, na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead, ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze.
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ mẹ́ta tí Damasku, àní fún mẹ́rin, Èmi kò ní yí ìpinnu ìjìyà mi padà. Nítorí wọn fi ohun èlò ìpakà pa Gileadi. Pẹ̀lú ohun èlò irin tí ó ní eyín mímú,
4 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.
Èmi yóò rán iná sí ilé Hasaeli, èyí ti yóò jó àwọn ààfin Beni-Hadadi run.
5 Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
Èmi yóò ṣẹ́ ọ̀pá ìdábùú Damasku; Èmi yóò sì pa ọba tí ó wà ní àfonífojì Afeni run àti ẹni tí ó di ọ̀pá aládé mú ní Beti-Edeni. Àwọn ará a Aramu yóò lọ sí ìgbèkùn sí Kiri,” ni Olúwa wí.
6 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Gaza, e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha, ranye nʼaka ndị Edọm.
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ mẹ́ta Gasa, àní nítorí mẹ́rin, Èmi kò ní yí ìpinnu ìjìyà mi padà. Gẹ́gẹ́ bí í oníṣòwò ẹrú, ó kó gbogbo àwọn ènìyàn mi ní ìgbèkùn. Ó sì tà wọ́n fún Edomu,
7 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.
Èmi yóò rán iná sí ara odi Gasa tí yóò jó gbogbo ààfin rẹ̀ run.
8 Aga m egbu ndị Ashdọd, ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn. Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn, ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị.
Èmi yóò ké àwọn olùgbé Aṣdodu kúrò, ti ẹni tí ó di ọ̀pá aládé ní Aṣkeloni mú. Èmi yóò yí ọwọ́ mi sí Ekroni títí tí ìyókù Filistini yóò fi ṣègbé,” ni Olúwa Olódùmarè wí.
9 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Taịa, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu, ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ mẹ́ta ti Tire àní nítorí mẹ́rin, Èmi kì yóò yí ìpinnu ìjìyà mi padà. Nítorí wọ́n ta gbogbo àwọn ènìyàn tí ó wà ní ìgbèkùn fún Edomu. Wọn kò sì náání májẹ̀mú ọbàkan,
10 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa; ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.”
Èmi yóò rán iná sí ara odi Tire, tí yóò jó gbogbo àwọn ààfin rẹ̀ run.”
11 Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ mẹ́ta tí Edomu, àní nítorí mẹ́rin, Èmi kò ní yí ìpinnu ìjìyà mi padà. Nítorí òhun fi idà lépa arákùnrin rẹ̀, Ó sì gbé gbogbo àánú sọnù, ìbínú rẹ̀ sì ń faniya títí, ó sì pa ìbínú rẹ̀ bí èéfín mọ́,
12 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman; ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.”
Èmi yóò rán iná sí orí Temani, tí yóò jó gbogbo ààfin Bosra run.”
13 Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Amọn, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime, nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Nítorí ẹ̀ṣẹ̀ mẹ́ta ti Ammoni, àní mẹ́rin, Èmi kò ní yí ìpinnu ìjìyà mi padà. Nítorí wọn ti la inú àwọn aboyún Gileadi kí wọ́n ba à lè fẹ ilẹ̀ wọn sẹ́yìn.
14 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba. Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike. Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe, na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ.
Èmi yóò rán iná sí ara odi Rabba èyí tí yóò jó àwọn ààfin rẹ̀ run pẹ̀lú ìhó ayọ̀ ní ọjọ́ ogun, pẹ̀lú ìjì líle ni ọjọ́ àjà.
15 Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha, ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.” Ka Onyenwe anyị sịrị.
Ọba wọn yóò sì lọ sí ìgbèkùn, òun àti àwọn ọmọ-aládé rẹ̀ lápapọ̀,” ni Olúwa wí.

< Emọs 1 >