< Emọs 1 >

1 Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị.
亞毛斯的言論:亞毛斯原是特科亞的一個牧人,在猶大王烏齊亞時代和以色列王耶曷阿士的兒子雅洛貝罕時代,地震前二年,見了關於以色列的神視。
2 Ọ sịrị, Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.
他說:「上主由熙雍一怒吼,從耶路撒冷一出聲,牧場即淒涼,加爾默耳山頂即乾枯。」
3 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs, na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead, ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze.
上主這樣說:「為了大馬士革再三再四犯罪,我不收回成命,因為他們用鐵棍壓榨了基肋阿得。
4 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.
我必把火投於阿匝耳家,燒毀本哈達得的王宮。
5 Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
我必打斷大馬士革的門閂,消滅彼卡特阿文的居民和貝特厄登的掌權者;阿蘭人民必被擄往克爾──上主說。
6 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Gaza, e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha, ranye nʼaka ndị Edọm.
上主這樣說:「為了迦薩再三再四犯罪,我不收回成命,因為他們將戰俘全部擄去,賣給厄東。
7 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.
我必把火投在迦薩城牆上,燒盡她的王宮。
8 Aga m egbu ndị Ashdọd, ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn. Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn, ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị.
我必消滅阿市多得的固民和阿市刻隆的掌權者,伸手打攻擊厄刻龍,培肋舍特的殘餘必要滅亡」──吾主上主說。
9 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Taịa, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu, ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.
上主這樣說:「為了提洛再三再四犯罪,我不收回成命,因他們將戰俘全都賣給了厄東,毫不念兄弟的盟約。
10 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa; ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.”
我必把火投在提洛的城牆上,燒盡她的王宮。」
11 Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.
上主這樣說:「為了厄東再三再四犯罪,我不收回成命,因為他們持刀追擊自己的兄弟,毫無憐憫,常存怒氣,永懷憤怒。
12 Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman; ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.”
我必把火投於特曼,燒盡波責辣的王宮。」
13 Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Amọn, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime, nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.
上主這樣說:「為了阿孟子民再三再四犯罪,我不收回成命,因為他們剖開基肋阿得的孕婦,為擴展的疆土。
14 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba. Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike. Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe, na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ.
在作戰之日的吶喊中,在風雨的狂暴中,我必在辣巴的城牆上放火,燒盡她的王宮。
15 Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha, ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.” Ka Onyenwe anyị sịrị.
他們的君王和君王的官吏必一起被擄去」──上主說。

< Emọs 1 >