< Ọrụ Ndị Ozi 1 >
1 Ezigbo enyi m Tiofilọs, nʼakwụkwọ m nke mbụ m dere gị banyere ihe niile Jisọs malitere ime nakwa ikuzi,
Mubhuku rangu rokutanga, Teofirasi, ndakanyora pamusoro pezvose zvakatanga kuitwa uye nokudzidziswa naJesu
2 ruo nʼụbọchị e mere ka ọ laghachi nʼeluigwe mgbe o sitere nʼike Mmụọ nsọ nyesịa ndị na-eso ụzọ ya iwu, bụ ndị ọ họpụtara.
kusvikira pazuva raakakwidzwa kudenga, shure kwokunge arayira, kubudikidza noMweya Mutsvene, vapostori vaakanga asarudza.
3 Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.
Mushure mokutambudzika kwake, akazviratidza kuvarume ava uye akaratidza zviratidzo zvakasimba zvizhinji zvokuti akanga ari mupenyu. Akaonekwa navo mazuva anopfuura makumi mana uye akataura nezvoumambo hwaMwari.
4 Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m.
Pane imwe nguva, paakanga achidya navo, akavarayira achiti, “Musabva muJerusarema, asi mumirire chipo chakavimbiswa naBaba vangu, icho chamakandinzwa ndichitaura pamusoro pacho.
5 Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
Nokuti Johani akabhabhatidza nemvura, asi mushure mamazuva mashoma muchabhabhatidzwa noMweya Mutsvene.”
6 Mgbe ha gbakọrọ, ha jụrụ ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugbu a ka i ga-enyeghachi Izrel alaeze ahụ?”
Saka, vakati vaungana pamwe chete, vakamubvunza vakati, “Ishe, mava kuzodzosera ushe kuvaIsraeri panguva ino here?”
7 Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya.
Akati kwavari, “Hazvisi kwamuri kuti muzive nguva kana musi wakatarwa naBaba nesimba ravo pachavo.
8 Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.”
Asi muchagamuchira simba kana Mweya Mutsvene auya pamusoro penyu; uye muchava zvapupu zvangu muJerusarema, nomuJudhea mose, nomuSamaria, kusvikira kumigumo yenyika.”
9 Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.
Mushure mokunge ataura izvi, akakwidzwa kudenga pamberi pameso avo chaipo, uye gore rikamufukidza vakasazomuona.
10 Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso.
Vakanga vakatarisisa paakanga achienda, uye pakarepo varume vaviri vakanga vakapfeka nguo chena vakamira pavari.
11 Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”
Vakati kwavari, “Varume veGarirea, makamirireiko pano makatarisa kudenga? Iyeyu Jesu abviswa kwamuri achienda kudenga, achadzokazve sezvamamuona achienda kudenga.”
12 Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
Ipapo vakadzokera kuJerusarema vachibva kugomo rinonzi reMiorivhi, rwendo rwezuva reSabata uchibva kuguta.
13 Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis.
Vakati vasvika, vakakwira kuimba yapamusoro kukamuri ravaigara. Vakanga varipo vaiti: Petro, Johani, Jakobho naAndirea; Firipi naTomasi; Bhatoromeo naMateo; Jakobho mwanakomana waArifeasi naSimoni muZeroti, uye naJudhasi mwanakomana waJakobho.
14 Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike nʼekpere. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna ya.
Vakabatana vose pakuramba vachinyengetera, pamwe chete navakadzi uye naMaria mai vaJesu, navanunʼuna vake.
15 Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị,
Mumazuva iwayo, Petro akasimuka pakati pavatendi (ungano yaida kusvika zana namakumi maviri)
16 “Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga.
akati, “Hama, Rugwaro rwaifanira kuzadziswa rwakataurwa noMweya Mutsvene nomuromo waDhavhidhi pamusoro paJudhasi, uyo akabatsira kutungamirira vaya vakasunga Jesu,
17 Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.”
akanga ari mumwe wedu uye akanga ano mugove muushumiri uhu.”
18 Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.
(Nomubayiro waakawana nokuda kwokuipa kwake, Judhasi akatenga munda; imomo ndimo maakawira pasi nomusoro, muviri wake ukaputika, ura hwake hukabuda.
19 Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara.
Munhu wose akanzwa nezvazvo muJerusarema, saka vakatumidza munda uya nomutauro wavo kuti Akeridhama, ndiko kuti, Munda weRopa.)
20 Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’
Petro akati, “Nokuti kwakanyorwa mubhuku raMapisarema kuti, “‘Musha wake ngauve dongo; ngakurege kuva nomunhu anogaramo,’ uye kuti, “‘Mumwe ngaatore nzvimbo yake youtungamiri.’
21 Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,
Naizvozvo zvakafanira kuti kusarudzwe mumwe murume akanga anesu nguva yose Ishe Jesu paaipinda nokubuda pakati pedu,
22 bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”
kutanga parubhabhatidzo rwaJohani kusvikira panguva yakabviswa Jesu kwatiri. Nokuti mumwe waava anofanira kuva chapupu chokumuka kwake, pamwe chete nesu.”
23 Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.
Saka vakasarudza varume vaviri vaiti: Josefa ainzi Bhanabhasi (aizivikanwawo sokunzi Jastasi) naMatiasi.
24 Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.
Ipapo vakanyengetera vachiti, “Ishe, munoziva mwoyo yavanhu vose. Tiratidzei pakati pavaviri ava wamasarudza
25 Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.”
kuti atore basa iri roupostori, rakasiyiwa naJudhasi achienda kunzvimbo yake.”
26 Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.
Ipapo vakakanda mijenya, uye mujenya ukawira kuna Matiasi; saka akawedzerwa kuvapostori vane gumi nomumwe.