< Ọrụ Ndị Ozi 6 >

1 Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị.
A u ove dane, kad se umnožiše uèenici, podigoše Grci viku na Jevreje što se njihove udovice zaboravljahu kad se dijeljaše hrana svaki dan.
2 Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri.
Onda dvanaestorica dozvavši mnoštvo uèenika, rekoše: nije prilièno nama da ostavimo rijeè Božiju pa da služimo oko trpeza.
3 Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.
Naðite dakle, braæo, meðu sobom sedam poštenijeh ljudi, punijeh Duha svetoga i premudrosti, koje æemo postaviti nad ovijem poslom.
4 Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.”
A mi æemo u molitvi i u službi rijeèi ostati.
5 Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.
I ova rijeè bi ugodna svemu narodu. I izbraše Stefana, èovjeka napunjena vjere i Duha svetoga, i Filipa, i Prohora, i Nikanora, i Timona, i Parmena, i Nikolu pokrštenjaka iz Antiohije.
6 Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi.
Ove postaviše pred apostole, i oni pomolivši se Bogu metnuše ruke na njih.
7 Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.
I rijeè Božija rastijaše, i množaše se vrlo broj uèenika u Jerusalimu. I sveštenici mnogi pokoravahu se vjeri.
8 Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ.
A Stefan pun vjere i sile èinjaše znake i èudesa velika meðu ljudima.
9 Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka.
Tada ustaše neki iz zbornice koja se zove Liveræanska i Kirinaèka i Aleksandrijnaèka i onijeh koji bijahu iz Kilikije i Azije, i prepirahu se sa Stefanom.
10 Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu.
I ne mogahu protivu stati premudrosti i Duhu kojijem govoraše.
11 Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.”
Tada podgovoriše ljude te kazaše: èusmo ga gdje huli na Mojsija i na Boga.
12 Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe.
I pobuniše narod i starješine i književnike, i napadoše i uhvatiše ga, i dovedoše ga na sabor.
13 Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị.
I izvedoše lažne svjedoke koji govorahu: ovaj èovjek ne prestaje huliti na ovo sveto mjesto i na zakon.
14 Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”
Jer ga èusmo gdje govori: ovaj Isus Nazareæanin razvaliæe ovo mjesto, i izmijeniæe obièaje koje nam ostavi Mojsije.
15 Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.
I pogledavši na nj svi koji sjeðahu na saboru vidješe lice njegovo kao lice anðela.

< Ọrụ Ndị Ozi 6 >