< Ọrụ Ndị Ozi 3 >

1 Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.
Tsiku lina Petro ndi Yohane ankapita ku Nyumba ya Mulungu kukapemphera nthawi ya 3 koloko masana.
2 Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.
Ndipo munthu wolumala chibadwire ankanyamulidwa tsiku ndi tsiku kukayikidwa pa khomo la Nyumbayo lotchedwa Khomo Lokongola kuti azikapempha amene amalowa ku bwalo la Nyumbayo.
3 Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.
Ataona Petro ndi Yohane ali pafupi kulowa anawapempha ndalama.
4 Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”
Iwo anamuyangʼanitsitsa iye. Kenaka Petro anati, “Tiyangʼane!”
5 O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.
Munthuyo anawayangʼanitsitsa kuyembekezera kuti alandira kanthu kuchokera kwa iwo.
6 Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”
Petro anati kwa iye, “Ine ndilibe siliva kapena golide, koma chimene ndili nacho ndikupatsa. Mʼdzina la Yesu Khristu wa ku Nazareti, yenda.”
7 O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.
Ndipo anamugwira dzanja lamanja, namuthandiza kuti ayimirire ndipo nthawi yomweyo mapazi ake ndi akakolo ake analimba.
8 Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
Iye analumpha ndi kuyamba kuyenda. Kenaka analowa nawo pamodzi mʼbwalo la Nyumba ya Mulungu, akuyenda ndi kulumpha ndiponso kuyamika Mulungu.
9 Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke,
Anthu onse atamuona akuyenda ndiponso kuyamika Mulungu,
10 ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.
anamuzindikira kuti ndi yemwe uja ankakhala pa khomo la Nyumbayo lotchedwa Khomo Lokongola, ndipo anazizwa ndi kudabwa ndi zimene zinamuchitikira.
11 Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.
Wopempha uja akuyenda pamodzi ndi Petro ndi Yohane, anthu onse anadabwa ndipo anawathamangira iwo kumalo wotchedwa Khonde la Solomoni.
12 Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?
Petro ataona zimenezi anawawuza kuti, “Inu Aisraeli, chifukwa chiyani mukudabwa ndi zimene zachitikazi? Bwanji mukuyangʼana ife ngati kuti tamuyendetsa munthuyu ndi mphamvu yathu kapena chifukwa cha kupembedza kwathu?
13 Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.
Mulungu wa Abrahamu, Isake ndi Yakobo, Mulungu wa makolo athu, wamulemekeza mtumiki wake Yesu. Amene inu munamukana pamaso pa Pilato ndi kumupereka Iye kuti aphedwe, ngakhale kuti Pilato anafuna kuti amumasule.
14 Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.
Koma inu munamukana Woyera ndi Wolungamayo ndipo munapempha kuti akumasulireni munthu wakupha anthu.
15 Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a.
Inu munapha mwini moyo, koma Mulungu anamuukitsa kwa akufa. Ife ndife mboni za zimenezi.
16 Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
Mwachikhulupiriro mʼdzina la Yesu, munthu uyu amene mukumuona ndi kumudziwa analimbikitsidwa. Mʼdzina la Yesu ndi chikhulupiriro chimene chili mwa iye chamuchiritsa kwathunthu, monga nonse mukuona.
17 “Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa.
“Tsopano abale ine ndikudziwa kuti inu munachita zimenezi mosadziwa, monga momwenso anachitira atsogoleri anu.
18 Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ.
Koma umu ndi mmene Mulungu anakwaniritsira zimene zinanenedwa kale ndi aneneri onse, kuti Khristu adzamva zowawa.
19 Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
Chifukwa chake, lapani, bwererani kwa Mulungu, kuti machimo anu afafanizidwe, kuti nthawi ya kutsitsimuka ibwere kuchokera kwa Ambuye,
20 ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs.
ndi kuti Iye atumize Yesu Khristu amene anasankhidwa chifukwa cha inu.
21 Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. (aiōn g165)
Iye ayenera kukhalabe kumwamba mpaka nthawi ya kukonzanso zinthu zonse monga Mulungu analonjeza kale kudzera mwa aneneri ake oyera mtima. (aiōn g165)
22 Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.
Pakuti Mose anati, ‘Ambuye Mulungu wanu adzakuukitsirani mneneri monga ine kuchokera pakati pa anthu anu; mumvere zonse zimene iye akuwuzeni.
23 Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’
Aliyense amene sadzamvera mawu a mneneriyo, adzayenera kuchotsedwa pakati pa abale ake.’
24 “Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a.
“Ndipo aneneri onse ambiri amene anayankhula kuyambira Samueli, ananeneratu za masiku ano.
25 Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’
Inu ndinu ana a aneneri ndiponso ana apangano limene Mulungu anachita ndi makolo anu. Iye anati kwa Abrahamu, ‘Anthu onse a pa dziko lapansi adzadalitsika kudzera mwa zidzukulu zako.’
26 Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”
Pamene Mulungu anaukitsa mtumiki wake, anamutuma Iye poyamba kwa inu kuti akudalitseni pobweza aliyense wa inu ku zoyipa zake.”

< Ọrụ Ndị Ozi 3 >