< Ọrụ Ndị Ozi 26 >

1 Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.” Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya,
Тогава Агрипа рече на Павла: Позволява ти се да говориш за себе си. И така, Павел простря ръка и почна да говори в своя защита:
2 “Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m.
Честит се считам, царю Агрипо, задето пред тебе ще се защитя днес относно всичко, за което ме обвиняват юдеите,
3 Nke ka nke, amatara m na omenaala ndị Juu na ịrụ ụka metụtara iwu ha doro gị anya. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị.
а най-вече защото си вещ във всичките обреди и разисквания между юдеите; затова ти се моля да ме изслушаш с търпение.
4 “Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem.
Какъв, прочее, беше Моя живот още от младини, това всичките юдеи знаят, понеже се прекара отначало между народа ми в Ерусалим.
5 Ha matara kemgbe ogologo oge, ha ga-agbakwa ama, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu eziokwu, na site na mbụ e biri m ndụ dịka otu onye so nʼime otu ahụ nke iwu ya dị ike karịchasịa nʼime okpukpe ndị Juu, nke bụ otu ndị Farisii.
Защото ме познават от начало, (ако искаха да засвидетелствуват), че според най-строгото учение на нашето вероизповедание живях фарисей,
6 Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nʼihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha.
И сега стоя пред съда понеже имам надежда на обещанието, което Бог е дал на бащите ни,
7 Nkwa nke ebo iri na abụọ niile na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe ofufe ehihie na abalị. Eze Agripa, ọ bụ nʼihi olileanya a, gị onye a na-asọpụrụ, ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo.
до изпълнението на, което нашите дванадесет племена се надяват да достигнат, като служат на Бога усърдно нощя и деня. За тая надежда, царю [Агрипо], ме обвиняват юдеите!
8 Gịnị mere unu jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka ndị nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie?
Защото да се мисли между вас нещо не за вярване, че Бог възкресява мъртвите?
9 “Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso aha Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ niile.
И аз си мислех, че трябваше да върша много неща против името на Исуса Назарянина;
10 Otu a ka m mere na Jerusalem. Ọ bụghị naanị na m natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja jiri ya kpọchie ọtụtụ ndị nsọ nʼụlọ mkpọrọ, ewelikwara m aka elu nʼoge a na-ama ha ikpe ọnwụ.
което и върших в Ерусалим, понеже затварях в тъмница мнозина от светиите, като се снабдих с власт от първосвещениците, и за убиването им давах глас против тях.
11 Ọtụtụ mgbe ka m hụrụ na a tara ha ahụhụ nʼụlọ nzukọ niile. Agbalịrị m ịkwagide ha ka ha kwuo arụ ma kwutọkwa okwukwe ha. Nʼihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nʼobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.
И като ги мъчех много пъти във всичките синагоги стараех се да ги накарам да хулят; и в чрезмерната си ярост против тях гонех ги даже и по чуждите градове.
12 “Nʼihi nke a, a gara m Damaskọs site nʼikike na nkwenye nke ndịisi nchụaja. Anatakwara m ike nʼaka ndịisi nchụaja.
По която работа когато пътувах за Дамаск с власт и поръка о т първосвещениците,
13 Nʼoge ehihie, eze Agripa, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nʼụzọ, gị onye a na-asọpụrụ, ka m hụrụ ìhè nke na-acha karịa anyanwụ ka o si nʼeluigwe chaa m na ndị mụ na ha so gburugburu.
по пладне, царю, видях на пътя светлина от небето, която надминаваше слънчевия блясък, и осия мене и тия, които пътуваха с мене,
14 Anyị niile dara nʼala. Ma anụrụ m olu gwara m okwu nʼasụsụ Hibru, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ site nʼịkpọ ụkwụ na ndụdụ e ji achị ehi.’
И като паднахме всинца на земята, чух глас, който ми казваше на еврейски, Савле, Савле, защо ме гониш? Мъчно ти е да риташ срещу остен.
15 “Asịrị m, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị kwuru, ‘Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.
И аз рекох, Кой си ти, Господи? А Господ рече, Аз съм Исус, когото ти гониш.
16 Ugbu a, bilie, kwụrụ ọtọ! Nʼihi na-emere m ka ị hụ m anya, ka m họpụta gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa niile mara ihe banyere nzute a i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị.
Но стани и се изправи на нозете си; понеже за туй ти се явих, да те назнача служител и свидетел на това, че си ме видял, и на онова, което ще ти открия,
17 Aga m azọpụta gị site nʼaka ndị nke gị na sitekwa nʼaka ndị mba ọzọ, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru.
като те избавям от юдейския народ и от езичниците, между които те пращам,
18 Imeghe anya ha mee ka ha si nʼọchịchịrị lọghachi banye nʼìhè, sikwa nʼike nke ekwensu lọghachikwute Chineke. Ka ha site nʼokwukwe ha nwere nʼebe m nọ nata mgbaghara mmehie ha, ketakwa oke ahụ dị ngọzị nʼetiti ndị e doro nsọ.’
да им отвориш очите, та да се обърнат от тъмнината към светлината, и от властта на Сатана към Бога, и да приемат прощение на греховете си и наследство между осветените, чрез вяра в мене.
19 “Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ.
Затова, царю Агрипо, не бях непокорен на небесното видение.
20 Ebidoro m izisa oziọma a na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nʼime Judịa niile na nʼetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ niile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nʼezi ọrụ nke ha na-arụ.
но проповядвах първом на юдеите в Дамаск, в Ерусалим, и в цялата юдейска земя, а после и на езичниците, да се покайват и да се обръщат към Бога, като вършат дела съответствени на покаянието си,
21 Ọ bụ nʼihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nʼụlọnsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m.
По тая причина юдеите ме уловиха в храма и се опитаха да ме убият.
22 Ma Chineke chebere m mee ka m bụrụ onye dị ndụ taa, ịkọrọ mmadụ niile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosis kwuru na ọ ga-emezu,
Но с помощта, която получих от Бога, стоя до тоя ден т а свидетелствувам и пред скромен и пред високопоставен, без да говоря нищо друго освен това, което пророците и Моисей са говорили, че щеше да бъде,
23 na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye mbụ ga-esi nʼọnwụ bilie, iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ ìhè.”
сиреч, че Христос трябваше да пострада, и че той, като възкръсне пръв от мъртвите, щеше да проповядва светлина и на юдейския народ и на езичниците.
24 Mgbe ọ na-agọpụ onwe ya, Festọs tiri mkpu, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị emebiela gị isi.”
Когато той така се защищаваше, Фест, извика със силен глас: Полудял си, Павле; голямата ти ученост те докарва до лудост.
25 Ma Pọl sịrị, “Isi emebighị m, ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu nʼanya udo bụ naanị eziokwu.
А Павел рече: Не съм полудял, честити Фесте, но от здрав ум изговарям истинни думи,
26 Eze nʼonwe ya makwaara ihe ndị a niile, nʼihi ya ejighị m egwu ọbụla agwa ya okwu a. Ekwenyere m na ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe ndị a merenụ nke ezonarịrị ya, nʼihi na o nweghị nke mere na nzuzo.
Защото царят, комуто и говоря дързостно, знае за това понеже съм убеден, че нищо от това не е скрито от него, защото то не е станало в някой ъгъл.
27 Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.”
Царю Агрипо, вярваш ли пророците? Зная, че ги вярваш.
28 Mgbe ahụ Agripa sịrị, “Pọl, ị na-achọ nʼime ntakịrị oge a ịkwagide m ka m bụrụ onye kwere na Kraịst?”
А Агрипа рече на Павла: Без малко ме убеждаваш да стана Християнин;
29 Ma Pọl sịrị, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe, mee ka gị na ndị niile nọ nʼebe a bụrụ ihe mụ onwe m bụ nʼime Kraịst ma ewezuga agbụ ndị a.”
А Павел рече: Молил се бях Богу щото било с малко, било с много, не само ти но и всички, които ме слушат днес, да станат такива, какъвто съм аз, освен тия окови.
30 Mgbe ahụ eze biliri ọtọ, ya na Festọs na Benaisi nwunye ya na ndị ọzọ niile ya na ha nọ nʼoche.
Тогава царят стана, с управителя и Верникия и седящите с тях.
31 Mgbe ha na-apụ, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Nwoke a emeghị ihe ọbụla kwesiri ọnwụ maọbụ ịga mkpọrọ.”
И като се оттеглиха настрана говореха помежду си, казвайки: Тоя човек не върши нищо достойно за смърт или окови.
32 Agripa gwara Festọs, “A gaara a hapụ nwoke a ma ọ bụrụ na o nyefeghị Siza ikpe ya.”
А Агрипа рече на Феста: Тоя човек можеше да се пусне ако не беше се отнесъл до Кесаря.

< Ọrụ Ndị Ozi 26 >