< Ọrụ Ndị Ozi 24 >

1 Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo.
닷새 후에 대제사장 아나니아가 어떤 장로들과 한 변사 더둘로와 함께 내려와서 총독 앞에서 바울을 고소하니라
2 Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a.
바울을 부르매 더둘로가 송사하여 가로되
3 Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ.
`벨릭스 각하여 우리가 당신을 힘입어 태평을 누리고 또 이 민족이 당신의 선견을 인하여 여러 가지로 개량된 것을 우리가 어느 모양으로나 어느 곳에서나 감사 무지 하옵나이다
4 Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.
당신을 더 괴롭게 아니하려 하여 우리가 대강 여짜옵나니 관용하여 들으시기를 원하나이다
5 “Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.
우리가 보니 이 사람은 염병이라 천하에 퍼진 유대인을 다 소요케 하는 자요 나사렛 이단의 괴수라
6 Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị,
저가 또 성전을 더럽게 하려 하므로 우리가 잡았사오니
7 ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
당신이 친히 그를 심문하시면
8 Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”
우리의 송사하는 이 모든 일을 아실 수 있나이다' 하니
9 Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.
유대인들도 이에 참가하여 이 말이 옳다 주장하니라
10 Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.
총독이 바울에게 머리로 표시하여 말하라 하니 그가 대답하되 `당신이 여러 해 전부터 이 민족의 재판장 된 것을 내가 알고 내 사건에 대하여 기쁘게 변명하나이다
11 Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.
당신이 아실 수 있는 바와 같이 내가 예루살렘에 예배하러 올라간 지 열 이틀 밖에 못되었고
12 Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo.
저희는 내가 성전에서 아무와 변론하는 것이나 회당과 또는 성중에서 무리를 소동케 하는 것을 보지 못하였으니
13 Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
이제 나를 송사하는 모든 일에 대하여 저희가 능히 당신 앞에 내세울 것이 없나이다
14 Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma.
그러나 이것을 당신께 고백하리이다 나는 저희가 이단이라 하는 도를 좇아 조상의 하나님을 섬기고 율법과 및 선지자들의 글에 기록된 것을 다 믿으며
15 Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
저희의 기다리는 바 하나님께 향한 소망을 나도 가졌으니 곧 의인과 악인의 부활이 있으리라 함이라
16 Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.
이것을 인하여 나도 하나님과 사람을 대하여 항상 양심에 거리낌이 없기를 힘쓰노라
17 “Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.
여러 해만에 내가 내 민족을 구제할 것과 제물을 가지고 와서
18 Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.
드리는 중에 내가 결례를 행하였고 모임도 없고 소동도 없이 성전에 있는 것을 저희가 보았나이다 그러나 아시아로부터 온 어떤 유대인들이 있었으니
19 Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.
저희가 만일 나를 반대할 사건이 있으면 마땅히 당신 앞에 와서 송사하였을 것이요
20 Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.
그렇지 않으면 이 사람들이 내가 공회 앞에 섰을 때에 무슨 옳지 않은 것을 보았는가 말하라 하소서
21 Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’”
오직 내가 저희 가운데 서서 외치기를 내가 죽은 자의 부활에 대하여 오늘 너희 앞에 심문을 받는다고 한 이 한 소리가 있을 따름이니이다' 하니
22 Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”
벨릭스가 이 도에 관한 것을 더 자세히 아는고로 연기하여 가로되 천부장 루시아가 내려오거든 너희 일을 처결하리라 하고
23 O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.
백부장을 명하여 `바울을 지키되 자유를 주며 친구 중 아무나 수종하는 것을 금치 말라' 하니라
24 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
수일 후에 벨릭스가 그 아내 유대 여자 드루실라와 함께 와서 바울을 불러 그리스도 예수 믿는 도를 듣거늘
25 Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
바울이 의와 절제와 장차 오는 심판을 강론하니 벨릭스가 두려워하여 대답하되 `시방은 가라 내가 틈이 있으면 너를 부르리라' 하고
26 Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
동시에 또 바울에게서 돈을 받을까 바라는고로 더 자주 불러 같이 이야기하더라
27 Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.
이태를 지내서 보르기오 베스도가 벨릭스의 소임을 대신하니 벨릭스가 유대인의 마음을 얻고자 하여 바울을 구류하여 두니라

< Ọrụ Ndị Ozi 24 >