< Ọrụ Ndị Ozi 23 >

1 Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.”
パウロ議員の方を熟視めて云ひけるは、兄弟たる人々よ、我今日に至るまで、良心を盡して神の御前に事へたり、と。
2 Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ.
是に於て司祭長アナニア、立添へる人々に、パウロの口を打てと命ぜしかば、
3 Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?”
パウロ之に謂ひけるは、白塗の壁よ、神は汝を打ち給はん、汝律法の儘に我を審かんとて坐しながら、律法に反して命じて我を打たしむるか、と。
4 Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?”
立會へる人々、汝神の大司祭を詛ふや、と云ひしに、
5 Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’”
パウロ云ひけるは、兄弟等よ、我其大司祭なる事を知らざりき。蓋録して「汝が民の君を詛ふこと勿れ」とあり、と。
6 Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.”
パウロ議員の一部はサドカイ人なるに、一部はファリザイ人なる事を知りて、議會に呼はりけるは、兄弟たる人々よ、我はファリザイ人の子にして、ファリザイ人なるが、死人の復活の希望の為に裁判せらるるなり、と。
7 Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara.
斯く云ひしかば、ファリザイ人とサドカイ人との間に激論起りて、會衆分裂せり。
8 Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile.
其はサドカイ人は復活も天使も霊も無しと言ふを、ファリザイ人は孰れも有りと主張すればなり。
9 Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?”
然て凄じき叫喚となりて、ファリザイ人中の或者等立争ひて云ひけるは、我等此人に何等の惡をも認めず、若霊又は天使ありて彼に語りたらんには如何、とて、
10 Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.
激しき争ひとなりしかば、千夫長パウロが彼等に引裂かれん事を恐れて、兵卒に命じ、下りて彼等の中よりパウロを奪取り、営内に牽入れしめたり。
11 Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”
次夜、主忽ちパウロの傍に現れて曰ひけるは、励め、蓋エルザレムに於て我を證したるが如く、ロマに於ても證せざるべからず、と。
12 Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl.
夜明けて、或ユデア人等相集り、誓ひてパウロを殺すまでは飲食すまじと言へり。
13 Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ.
此企に與りし者四十人以上なりしが、
14 Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl.
司祭長と長老等との許に至りて云ひけるは、我等大願を立てて、パウロを殺すまでは何をも口に入れじと誓へり。
15 Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.”
然れば、パウロの事情を尚詳しく知らんとする如くにして、彼を汝等の前に出頭せしむる様、千夫長に報知せよ、我等其近づかざる中に之を殺さんと覚悟せり、と。
16 Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl.
パウロが姉妹の子、此惡計を聞きて、行きて兵営の内に入りパウロに之を告げしかば、
17 Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.”
パウロ一人の百夫長を呼びて云ひけるは、請ふ此青年を千夫長の許に携へ往け、其は彼に告ぐべき事あればなり、と。
18 Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị. “Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.”
百夫長携へて之を千夫長の許に導き、然て云ひけるは、囚人パウロ我に請ふに、汝に語るべき事ある此青年を汝の許に導かん事を以てせり、と。
19 Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?”
千夫長青年の手を取りて別所に連行き、我に語るべき事とは何事ぞ、と問ひしかば、
20 Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya.
彼云ひけるは、ユデア人申合せて、パウロの事情を尚確に尋問せんとする如くにして、明日パウロを議會に出頭せしめん事を汝に申出でんとす、
21 Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.”
然れど彼等を信ずること勿れ、其は彼等の中四十人以上の者等、彼を殺すまでは飲食せずと誓ひ、今既に準備して、汝の約束を待ちつつあればなり、と。
22 Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.”
千夫長、此事を我に告げたりと誰にも語ること勿れ、と戒めて青年を返し、
23 Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a.
然て二人の百夫長を呼びて云ひけるは、汝等カイザリアに向けて、兵卒二百人、騎兵七十人、槍持二百人を夜の九時より仕立てさせ、
24 Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.”
又馬を備へてパウロを乗らしめ、無事に総督フェリクスの許へ伴ひ行かしめよ、と。
25 O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a:
是ユデア人がパウロを捕へて殺す事あらば、己賄賂を受けたる如く、後に至りて讒訴せられん事を恐れし故なり。
26 Klọdiọs Lisias, Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a. Ana m ekele gị.
然て書添へたる書簡の文左の如し、
27 Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha.
クロウヂオ、ルジア、最尊き総督フェリクスに挨拶す。此人ユデア人に捕へられて既に殺されんとせしを、我其ロマ人たる事を聞き、軍隊を牽往きて救出したるが、
28 Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha.
彼等の之を咎むる所以を知らんと欲して、之を其議會に召連れたるに、
29 Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ.
我は其訴へらるる所が彼等の律法に関する問題たるを認めて、聊も死刑若くは入獄に當る罪あるを認めず、
30 Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.
加之彼等之を害せんとする企ありと告げられたれば、之を汝の許に送り、告訴人にも、汝の法廷に起訴せよ、と告示せり、汝健康なれ、と。
31 Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu.
然れば兵卒等は命令に從ひ、パウロを携へて夜中にアンチパトリに連行き、
32 Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha.
明日は騎兵を殘して之に伴はしめ、然て己等は兵営に返りしが、
33 Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl.
騎兵はカイザリアに至り、総督に添書を渡して、パウロをも其前に立たしめたり。
34 Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia,
総督添書を読みて、本國は何國ぞ、と問ひ、其シリシア州なる由を聞きしかば、
35 ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.
汝の告訴人來りて後汝に聞くべし、と云ひて、命じてパウロをヘロデの邸内に護らしめたり。

< Ọrụ Ndị Ozi 23 >