< Ọrụ Ndị Ozi 22 >

1 “Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nʼihu unu.”
Varume, hama, nemadzibaba, inzwai kuzvidavirira kwangu ikozvino kwamuri.
2 Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nʼasụsụ Hibru, ha deere duu karịa. Mgbe ọ sịrị,
Vakati vachinzwa kuti anotaura nerurimi rwechiHebheru kwavari, vakanyanya kunyarara, zvino akati:
3 “Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa.
Ini ndiri zvirokwazvo murume muJudha, wakaberekerwa muTaso yeKirikia, akarerwa muguta rino pamakumbo aGamarieri, ndikadzidziswa zvakasimba maererano nemurairo wemadzibaba, mushingairiri waMwari, sezvamuri mese nhasi;
4 Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ.
waishusha nzira iyi kusvikira parufu, ndichisunga nekukumikidza mutirongo vese varume nevakadzi,
5 Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
nemupristi mukuru sezvaanondipupurira, nedare rese remakurukota evakuru, kwandakagamuchirawo kwavari tsamba kuhama, ndikaenda kuDhamasiko kuti ndiuise kuJerusarema avo vaivapowo vakasungwa, kuti varangwe.
6 “Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m.
Zvino zvakaitika kuti ndichifamba ndoswedera Dhamasiko, anenge masikati, pakarepo kwakapenya kubva kudenga chiedza chikuru chakandipoteredza.
7 Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
Zvino ndakawira pasi, ndokunzwa inzwi richiti kwandiri: Sauro, Sauro, unondishushirei?
8 “‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’
Ini ndikapindura, ndikati: Ndimwi ani, Ishe? Akati kwandiri: Ndini Jesu weNazareta waunoshusha iwe.
9 Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
Zvino avo vaiva neni vakaona chiedza, uye vakatya; asi havana kunzwisisa inzwi rewakataura neni.
10 “Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’
Zvino ndikati: Ndoita chii, Ishe? Ishe ndokuti kwandiri: Simuka uende kuDhamasiko; uye ikoko uchaudzwa maererano nezvinhu zvese zvakatarirwa iwe kuti uite.
11 Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs.
Zvino zvandakange ndisingaoni nekubwinya kwechiedza icho, ndakatungamirirwa neruoko nevaiva neni, ndikasvika kuDhamasiko.
12 “Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ.
Zvino umwe Ananiasi, murume waishingaira pakunamata zvinoenderana nemurairo, waipupurirwa zvakanaka neVaJudha vese vakange vagerepo,
13 Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya.
akauya kwandiri ndokumira padivi pangu akati kwandiri: Sauro hama, chionazve. Neni nenguva iyo ndikamuona.
14 “Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya.
Zvino akati: Mwari wemadzibaba edu wakagara akusarudza kuti uzive chido chake, nekuona Wakarurama, uye unzwe inzwi rinobva mumuromo wake.
15 Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.
Nokuti uchava chapupu chake kuvanhu vese chezvawakaona nekunzwa.
16 Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’
Zvino ikozvino uchanonokerei? Simuka ubhabhatidzwe uye usukwe zvivi zvako, uchidana zita raIshe.
17 “Mgbe m lọghachikwara na Jerusalem, nọrọ na-ekpe ekpere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ahụrụ m ọhụ,
Zvino zvakaitika kuti ndadzokera kuJerusarema, uye ndichinyengetera mutembere, ndikaita chiyeverwa chemweya,
18 ebe ọ na-agwa m, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nʼihi na ndị bi nʼala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere m.’
ndokumuona achiti kwandiri: Kurumidza uye ubude muJerusarema ikozvino-zvino; nokuti havagamuchiri uchapupu hwako maererano neni.
19 “Ma asịrị m, ‘Onyenwe anyị, ndị a maara nke ọma na m na-aga nʼụlọ nzukọ nʼotu nʼotu, na-atụba ndị kwere na gị nʼụlọ mkpọrọ, na-etikwa ha ihe.
Ini ndikati: Ishe, ivo vanoziva kuti ini ndaiisa mutirongo nekurova musinagoge rega-rega avo vaitenda kwamuri;
20 Nʼoge a na-awụfu ọbara onyeama gị bụ Stivin, eguzo m nso na-akwado nʼihe emere dị mma, ma na-elekọtakwa uwe ndị ahụ tụgburu ya anya.’
uye pakadururwa ropa raSitefano chapupu chenyu, neni ndakange ndimirepo ndichibvumirana nekuurawa kwake, uye ndakachengeta nguvo dzevaimuuraya.
21 “Mgbe ahụ, ọ sịrị m, ‘Gawa; nʼihi na aga m ezipu gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ.’”
Zvino akati kwandiri: Enda, nokuti ini ndichakutuma kure kuvahedheni.
22 Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”
Vakamuteerera kusvikira pashoko iri, ndokusimudza inzwi ravo vachiti: Wakadai ngaabviswe panyika; nokuti hazvina kufanira kuti ararame.
23 Ha tiri mkpu na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achilikwa aja nʼala na-efesasị ya ebe niile,
Zvino vachidanidzira, nekurasa nguvo, vachikushira guruva mumhepo,
24 ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya.
mukuru wechuru wakaraira kuti aiswe kuimba yemauto achiti abvunzurudzwe nekurohwa netyava, kuti azive kuti chikonzeroi chavaidanidzira kudai pamusoro pake.
25 Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?”
Zvino vakati vamutandavadzira mberi nemakashu, Pauro akati kumukuru wezana wakange amirepo: Zviri pamutemo here kwamuri kurova netyava munhu ari muRoma uye asina kupiwa mhosva?
26 Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.”
Zvino mukuru wezana wakati achizvinzwa, akaswedera akaudza mukuru wechuru achiti: Chenjerai zvamoda kuita; nokuti munhu uyu muRoma.
27 Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Ọ sịrị, “E.”
Zvino mukuru wechuru akaswedera akati kwaari: Ndiudze, iwe uri muRoma here? Iye akati: Hongu.
28 Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.” Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”
Mukuru wechuru ndokupindura akati: Nemutengo mukuru ini ndakawana ugaro uhu. Pauro akati: Asi neni ndakaberekwa nahwo.
29 Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
Naizvozvo pakarepo vakabva kwaari ivo vaiva vomubvunzurudza. Nemukuru wechuru wakatyawo aziva kuti iye muRoma, uye nokuti wakange amusunga.
30 Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.
Zvino chifume achida kuziva chokwadi, kuti nemhosva yei aipomerwa neVaJudha, wakamusunungura pazvisungo, akaraira kuti vapristi vakuru nedare ravo remakurukota rese vauye, akaburusira Pauro ndokugadzika pamberi pavo.

< Ọrụ Ndị Ozi 22 >