< Ọrụ Ndị Ozi 22 >

1 “Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nʼihu unu.”
“Brothers and Father, listen to the defence which I am about to make.”
2 Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nʼasụsụ Hibru, ha deere duu karịa. Mgbe ọ sịrị,
When they heard that he was speaking to them in Hebrew, they were still more quiet; and Paul went on:
3 “Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa.
“I am a Jew, a native of Tarsus in Cilicia, but I was brought up in this city under the teaching of Gamaliel, and educated in accordance with the strict system of our ancestral Law. I was as zealous in God’s service as any of you who are here to-day.
4 Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ.
In my persecution of this Cause I did not stop even at the taking of life. I put in chains, and imprisoned, men and women alike —
5 Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
And to that the High Priest himself and all the Council can testify. For I had letters of introduction from them to our fellow Jews at Damascus, and I was on my way to that place, to bring those whom I might find there prisoners to Jerusalem for punishment.
6 “Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m.
While I was still on my way, just as I was getting close to Damascus, about mid-day, suddenly there flashed from the heavens a great light all round me.
7 Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’
I fell to the ground, and heard a voice saying to me ‘Saul, Saul, why are you persecuting me?’
8 “‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. “Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’
‘Who are you, Lord?’ I replied. Then the voice said ‘I am Jesus of Nazareth whom you are persecuting.’
9 Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.
The men with me saw the light, but did not hear the speaker’s voice.
10 “Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ “Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’
Then I said ‘What am I to do, Lord?’ ‘Get up and go into Damascus,’ The Lord said to me, ‘and there you shall be told all that you have been appointed to do.’
11 Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs.
In consequence of that dazzling light I could not see, but my companions held me by the hand, till I reached Damascus.
12 “Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ.
There a man named Ananias, a strict observer of our Law, well spoken of by all the Jewish inhabitants, came to see me.
13 Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya.
Standing close to me, he said ‘Saul, my Brother, recover your sight.’ And then and there I recovered my sight and looked up at him.
14 “Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya.
Then he said ‘The God of our ancestors has appointed you to learn his will, and to see the Righteous One, and to hear words from his lips;
15 Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.
for you shall be a witness for him to all the world of what you have just seen and heard.
16 Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’
And now why wait any longer: Be baptized at once, wash away your sins, and invoke his Name.
17 “Mgbe m lọghachikwara na Jerusalem, nọrọ na-ekpe ekpere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ahụrụ m ọhụ,
After my return to Jerusalem, while I was praying one day in the Temple, I fell into a trance,
18 ebe ọ na-agwa m, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nʼihi na ndị bi nʼala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere m.’
and saw Jesus saying to me ‘Make haste and leave Jerusalem at once, because they will not accept your testimony about me.’
19 “Ma asịrị m, ‘Onyenwe anyị, ndị a maara nke ọma na m na-aga nʼụlọ nzukọ nʼotu nʼotu, na-atụba ndị kwere na gị nʼụlọ mkpọrọ, na-etikwa ha ihe.
‘Lord,’ I answered, ‘these people know that I used to imprison and scourge, in Synagogue after Synagogue, those who believed in you;
20 Nʼoge a na-awụfu ọbara onyeama gị bụ Stivin, eguzo m nso na-akwado nʼihe emere dị mma, ma na-elekọtakwa uwe ndị ahụ tụgburu ya anya.’
and, when the blood of your martyr, Stephen, was being shed, I was myself standing by, approving of his death, and took charge of the clothes of those who were murdering him.
21 “Mgbe ahụ, ọ sịrị m, ‘Gawa; nʼihi na aga m ezipu gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ.’”
But Jesus said to me ‘Go; for I will send you to the Gentiles far away’.”
22 Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”
Up to this point the people had been listening to Paul, but at these words they called out: “Kill him! A fellow like this ought not to have been allowed to live!”
23 Ha tiri mkpu na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achilikwa aja nʼala na-efesasị ya ebe niile,
As they were shouting, tearing off their clothes, and throwing dust in the air,
24 ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya.
the Commanding Officer ordered Paul to be taken into the Fort, and directed that he should be examined under the lash, that he might find out the reason for their outcry against him.
25 Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?”
But just as they had tied him up to be scourged, Paul said to the Captain standing near: “Is it legal for you to scourge a Roman citizen, unconvicted?”
26 Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.”
On hearing this, the Captain went and reported it to the Commanding Officer. “Do you know what you are doing?” he said. “This man is a Roman citizen.”
27 Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Ọ sịrị, “E.”
So the Commanding Officer went up to Paul and said: “Tell me, are you a Roman citizen?” “Yes,” replied Paul.
28 Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.” Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”
“I had to pay a heavy price for my position as citizen,” said the Officer. “I am one by birth,” rejoined Paul.
29 Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.
The men who were to have examined Paul immediately drew back, and the Officer, finding that Paul was a Roman citizen, was alarmed at having put him in chains.
30 Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.
On the next day the Commanding Officer, wishing to find out the real reason why Paul was denounced by the Jews, had his chains taken off, and directed the Chief Priests and the whole of the High Council to assemble, and then took Paul down and brought him before them.

< Ọrụ Ndị Ozi 22 >