< Ọrụ Ndị Ozi 17 >
1 Mgbe ha gafechara obodo Amfipolis na Apolonia, ha bịaruru obodo Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị.
Now when they had passed through Amphipolis and Apollonia, they came to Thessalonica, where there was a Jewish synagogue.
2 Pọl bakwuuru ha, dịka ọ na-eme oge niile. Ọ nọnyere ha izu ụka atọ, ya na ha na-atụgharị uche nʼAkwụkwọ Nsọ,
Paul, as was his custom, went in to them, and for three Sabbath days reasoned with them from the Scriptures,
3 na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.”
explaining and demonstrating that the Christ had to suffer and rise again from the dead, and saying, "This Jesus, whom I proclaim to you, is the Christ."
4 Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.
Some of them were persuaded, and joined Paul and Silas, as did a large number of the devout Greeks, and not a few of the prominent women.
5 Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ.
But the Jews, being moved with jealousy, took along some wicked men from the marketplace, and gathering a crowd, set the city in an uproar. Assaulting the house of Jason, they sought to bring them out to the people.
6 Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu.
When they did not find them, they dragged Jason and certain brothers before the rulers of the city, crying, "These who have turned the world upside down have come here also,
7 Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.”
whom Jason has received. These all act contrary to the decrees of Caesar, saying that there is another king, Jesus."
8 Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile.
The crowd and the rulers of the city were troubled when they heard these things.
9 Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha.
When they had taken security from Jason and the rest, they let them go.
10 Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
The brothers immediately sent Paul and Silas away by night to Beroea. When they arrived, they went into the Jewish synagogue.
11 Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile.
Now these were more noble than those in Thessalonica, in that they received the word with all readiness of the mind, examining the Scriptures daily to see whether these things were so.
12 Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara.
Many of them therefore believed; also of the prominent Greek women, and not a few men.
13 Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara.
But when the Jews of Thessalonica had knowledge that the word of God was proclaimed by Paul at Beroea also, they came there likewise, inciting and disturbing the crowds.
14 Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ.
Then the brothers immediately sent out Paul to go as far as to the sea, and Silas and Timothy still stayed there.
15 Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge.
But those who escorted Paul brought him as far as Athens. Receiving a commandment to Silas and Timothy that they should come to him very quickly, they departed.
16 Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.
Now while Paul waited for them at Athens, his spirit was provoked within him as he saw the city full of idols.
17 Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu.
So he reasoned in the synagogue with the Jews and the devout persons, and in the marketplace every day with those who met him.
18 Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya.
Some of the Epicurean and Stoic philosophers also were conversing with him. Some said, "What does this babbler want to say?" Others said, "He seems to be advocating foreign deities," because he preached Jesus and the resurrection.
19 Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a?
They took hold of him, and brought him to the Areopagus, saying, "May we know what this new teaching is, which is spoken by you?
20 Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.”
For you bring certain strange things to our ears. We want to know therefore what these things mean."
21 (Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.)
Now all the Athenians and the strangers living there spent their time in nothing else, but either to tell or to hear some new thing.
22 Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.
Paul stood in the middle of the Areopagus, and said, "You men of Athens, I perceive that you are very religious in all things.
23 Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu.
For as I passed along, and observed the objects of your worship, I found also an altar with this inscription: 'TO AN UNKNOWN GOD.' What therefore you worship in ignorance, this I announce to you.
24 “Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo.
The God who made the world and all things in it, he, being Lord of heaven and earth, does not dwell in temples made with hands,
25 Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile.
neither is he served by human hands, as though he needed anything, seeing he himself gives to all life and breath, and all things.
26 O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha.
He made from one blood every nation of the human race to dwell on all the surface of the earth, having determined appointed seasons, and the boundaries of their dwellings,
27 Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya.
that they should seek God, if perhaps they might reach out for him and find him, though he is not far from each one of us.
28 ‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’
'For in him we live, and move, and have our being.' As some of your own poets have said, 'For we are also his offspring.'
29 “Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ.
Being then the offspring of God, we ought not to think that the Divine Nature is like gold, or silver, or stone, engraved by human art and design.
30 Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.
The times of ignorance therefore God overlooked. But now he commands that all people everywhere should repent,
31 Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”
because he has appointed a day in which he will judge the world in righteousness by the man whom he has ordained; of which he has given assurance to everyone by raising him from the dead."
32 Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”
Now when they heard of the resurrection of the dead, some mocked; but others said, "We want to hear you again concerning this."
33 Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha.
Thus Paul went out from among them.
34 Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.
But some people joined with him, and believed, among whom also was Dionysius the Areopagite, and a woman named Damaris, and others with them.