< Ọrụ Ndị Ozi 16 >

1 Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik.
Dorazili do Derbe a pak do Lystry. Tam žil mladý věřící muž jménem Timoteus, syn křesťanské Židovky a pohanského otce.
2 Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya.
Křesťané v Lystře a Ikoniu si ho velice pochvalovali.
3 Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.
Také Pavel si ho oblíbil a vybral za svého dalšího průvodce. Protože v těchto oblastech měli stále co činit s židovskými usedlíky, kteří Timotea znali a považovali ho podle otce za pohana, Pavel mu raději doporučil obřízku.
4 Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha.
Putovali pak společně do dalších měst a seznamovali je s dopisem apoštolů a vedoucích jeruzalémské církve.
5 Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị.
Maloasijské sbory se upevňovaly ve víře a také tam stále přibývali noví křesťané.
6 Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ.
Tak procestovali Frygii a obrátili se nazpět do Galacie, protože neměli vnitřní jistotu, že mají pokračovat dále na západ do provincie Asie. Pak chtěli na pobřeží Černého moře do Bytinie, ale cítili, že ani tam je Kristus neposílá.
7 Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa.
8 Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas.
Obrátili se tedy znovu k západu, bez zdržování prošli Mysií, až dorazili do Troady.
9 Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.”
V noci měl Pavel sen. Stál před ním muž v makedonském kroji a prosil ho: „Přeplav se do Makedonie a pomoz nám!“
10 Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.
My všichni jsme uvěřili, že tento sen byl Božím příkazem, abychom šířili zvěst o spáse také v Evropě, a hned jsme se začali připravovat na cestu.
11 Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis.
Z troadského přístavu jsme se plavili na ostrov Samotraké a na evropskou pevninu jsme vystoupili v makedonské Neapoli.
12 Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị.
Po souši jsme pokračovali do Filip, nejvýznamnějšího města severní Makedonie, obydleného hlavně římskými kolonisty. Tam jsme se usadili na několik dní.
13 Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu.
Protože ve městě nebyla synagoga, vyšli jsme v sobotu za bránu na břeh řeky. Předpokládali jsme totiž, že by se tam mohli scházet místní židé a bohabojní pohané k modlitbám. Byla tam opravdu skupina žen, a tak jsme se posadili a mluvili k nim.
14 Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.
Mezi posluchačkami byla také Lydie, obchodnice s purpurovými sukny, pohanka, která uvěřila v Boha. Kristovo slovo ji zaujalo a ona dychtivě naslouchala Pavlovu kázání.
15 Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.
Přijala s celou svou rodinou křest a přiměla nás, abychom se stali hosty v jejich domě.
16 Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa.
Když jsme zase jednou šli na místo modliteb, potkala nás mladá otrokyně, která měla věštecké nadání. Její majitelé na tom pořádně vydělávali.
17 Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.”
Připojila se hned k nám a hlasitě vyvolávala: „Vidíte ty lidi? To jsou sluhové nejvyššího Boha a říkají nám, jak najít záchranu!“
18 O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta.
Tak to dělala den za dnem. Pavel to těžce nesl a jednoho dne jí přikázal: „Ve jménu Ježíše Krista, okamžitě přestaň!“Dívka se probrala ze svého vytržení a úplně tu schopnost ztratila.
19 Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa.
To ovšem rozzlobilo její pány, kteří přišli o zdroj značných příjmů.
20 Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,
Přivlekli Pavla a Silase na radnici před soudce a vznesli proti nim vážné obvinění: „To jsou židé, kteří pobuřují v našem římském městě a snaží se tu šířit svoje náboženství.“
21 site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.”
22 Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe.
Srocený lid se také připojil k tomu obvinění a úředníci tedy dali Pavla a Silase zmrskat pruty po nahém těle.
23 Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma.
Po krutém bičování je předali vězeňskému strážci do přísné vazby.
24 Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.
Ten je vsadil do nejhlubší kobky a nohy jim sevřel kládou.
25 Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.
Pavel a Silas se ještě o půlnoci hlasitě modlili a zpívali Bohu chvalozpěvy, až se to rozléhalo celou věznicí.
26 Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.
Tu se zatřásla země, základy vězení byly porušeny, dveře vyvaleny a okovy se uvolnily.
27 Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.
Žalářník se probudil a viděl, co se stalo. Tasil svůj meč a chtěl se jím probodnout, protože se domníval, že vězňové utekli, a on za ně ručil svým životem.
28 Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!”
Pavel na něj zavolal: „Nezabíjej se, vždyť nikdo neutekl!“
29 Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji.
Správce žaláře popadl pochodeň, seběhl do jejich kobky a vrhl se před nimi na kolena.
30 Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
Pak je vyvedl ven a ptal se: „Vy jste jistě bohové; co mám dělat, abych byl zachráněn?“
31 Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.”
Řekli mu: „Bůh je Ježíš Kristus, v něho uvěř a budeš zachráněn s celou rodinou.“
32 Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị.
A vyprávěli jemu a všem obyvatelům jeho domácnosti o Kristu.
33 Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim.
Žalářník je pečlivě ošetřil a ještě v noci se dal s celou svojí rodinou i otroky pokřtít.
34 Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
Pak zasedli ke stolu a bylo tam veselo, vždyť uvěřili v živého Boha!
35 Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.”
Ráno k němu poslali úředníci vojáka se vzkazem, aby apoštoly propustil.
36 Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”
Žalářník měl radost, že mohou klidně odejít,
37 Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.”
ale Pavel si postavil hlavu: „To tedy ne! Nás, římské občany, dají bez výslechu veřejně zmrskat, vsadit do žaláře, a teď by se nás chtěli v tichosti zbavit? Ať pěkně sami přijdou a propustí nás.“
38 Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.
Voják to vyřídil. Městští úředníci se polekali té skutečnosti, že Pavel a Silas jsou občany Římské říše.
39 Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ.
Přišli tedy s omluvami, ale prosili je, aby opustili Filipy.
40 Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.
A tak apoštolové ještě navštívili křesťanku Lydii, kde se setkali s věřícími, potěšili se navzájem a odešli z města.

< Ọrụ Ndị Ozi 16 >