< Ọrụ Ndị Ozi 15 >

1 Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”
Uto neki siđoše iz Judeje i počeše učiti braću: “Ako se ne obrežete po običaju Mojsijevu, ne možete se spasiti.”
2 Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a.
Kad između njih te Pavla i Barnabe nasta prepirka i raspra nemalena, odrediše da Pavao i Barnaba i još neki drugi između njih uzađu u Jeruzalem k apostolima i starješinama poradi tog pitanja.
3 Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu.
Oni su dakle, ispraćeni od Crkve, prolazili kroz Feniciju i Samariju pripovijedajući o obraćenju pogana i donoseći svoj braći veliku radost.
4 Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.
Kada pak stigoše u Jeruzalem, primi ih Crkva, apostoli i starješine. Ispripovjediše što sve Bog učini po njima.
5 Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.”
Onda ustanu neki od onih što iz farizejske sljedbe bijahu prigrlili vjeru pa reknu: “Treba ih obrezati i zapovjediti im da opslužuju Zakon Mojsijev.”
6 Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.
Nato se apostoli i starješine sastanu da to razmotre.
7 Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa.
Nakon duge raspre ustade Petar i reče im: “Braćo, vi znate kako me Bog od najprvih dana između vas izabra da iz mojih usta pogani čuju riječ evanđelja i uzvjeruju.
8 Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ.
I Bog, Poznavatelj srdaca, posvjedoči za njih: dade im Duha Svetoga kao i nama.
9 O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe.
Nikakve razlike nije pravio između nas i njih: vjerom očisti njihova srca.
10 Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ?
Što dakle sada iskušavate Boga stavljajući učenicima na vrat jaram kojeg ni oci naši ni mi nismo mogli nositi?
11 Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”
Vjerujemo, naprotiv: po milosti smo Gospodina Isusa spašeni, baš kao i oni.”
12 Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ.
Nato sve mnoštvo umuknu. Slušali su Barnabu i Pavla koji pripovjedahu kolika je znamenja i čudesa Bog po njima učinio među poganima.
13 Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị.
Kad oni ušutješe, progovori Jakov: “Poslušajte me, braćo!
14 Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.
Šimun je izložio kako se Bog već na početku pobrinu između pogana uzeti narod imenu svojemu.
15 Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya,
S time su u skladu riječi Proroka. Ovako je doista pisano:
16 “‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,
Nakon toga vratit ću se i opet podići pali šator Davidov, iz ruševina ga podići, opet ga sazidati
17 ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’
da preostali ljudi potraže Gospodina i svi pogani na koje je zazvano ime moje, govori Gospodin, koji to
18 Nke a amaara site na mgbe ochie. (aiōn g165)
obznanjuje odvijeka. (aiōn g165)
19 “Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke,
Zato smatram da ne valja dodijavati onima koji se s poganstva obraćaju k Bogu,
20 kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.
nego im poručiti da se uzdržavaju od mesa okaljana idolima, od bludništva, od udavljenoga i od krvi.
21 Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”
Ta Mojsije od pradavnih naraštaja ima po gradovima propovjednike koji ga u sinagogama svake subote čitaju.”
22 Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna.
Tad apostoli i starješine zajedno sa svom Crkvom zaključe izabrati neke muževe između sebe i poslati ih u Antiohiju s Pavlom i Barnabom. Bijahu to Juda zvani Barsaba, i Sila, muževi vodeći među braćom.
23 Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele.
Po njima pošalju ovo pismo: “Apostoli i starješine, braća, braći iz poganstva po Antiohiji, Siriji i Ciliciji - pozdrav!”
24 E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a.
“Budući da smo čuli kako vas neki od naših, ali bez našega naloga, nekakvim izjavama smetoše i duše vam uznemiriše,
25 Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas,
zaključismo jednodušno izabrati neke muževe i poslati ih k vama zajedno s našim ljubljenim Barnabom i Pavlom,
26 ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
ljudima koji su svoje živote izložili za ime Gospodina našega Isusa Krista.
27 Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a.
Šaljemo vam dakle Judu i Silu. Oni će vam i usmeno priopćiti to isto.
28 Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa.
Zaključismo Duh Sveti i mi ne nametati vam nikakva tereta osim onoga što je potrebno:
29 Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.
uzdržavati se od mesa žrtvovana idolima, od krvi, od udavljenoga i od bludništva. Budete li se toga držali, dobro ćete učiniti. Živjeli!”
30 Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ.
Oni su se dakle oprostili i sišli u Antiohiju; sabrali su mnoštvo i predali pismo.
31 Mgbe ndị otu ọgbakọ ahụ gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nʼihi agbamume ha natara.
Kad ga pročitaše, svi se obradovaše zbog ohrabrenja.
32 Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike.
Juda i Sila, i sami proroci, mnogim riječima ohrabriše i utvrdiše braću.
33 Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha.
Neko se vrijeme zadrže pa se onda s mirom od braće vrate onima koji ih poslaše.
34 Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.
35 Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.
A Pavao i Barnaba ostadoše u Antiohiji naučavajući i navješćujući zajedno s mnogima drugima riječ Gospodnju.
36 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.”
Nakon nekog vremena reče Pavao Barnabi: “Vratimo se i pohodimo braću po svim gradovima u kojima smo navješćivali riječ Gospodnju, da vidimo kako su!”
37 Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa.
Barnaba je htio povesti i Ivana zvanog Marko.
38 Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha.
Pavao pak nije smatrao uputnim sa sobom voditi onoga koji se u Pamfiliji odvojio od njih te nije s njima pošao na djelo.
39 Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.
Spopade ih takva ogorčenost da se raziđoše: Barnaba povede Marka i otplovi na Cipar,
40 Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị.
a Pavao sebi izabra Silu pa od braće povjeren milosti Gospodnjoj
41 O jegharịrị nʼime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ nọ nʼebe ahụ ume.
proputova Siriju i Ciliciju, utvrđujući Crkve.

< Ọrụ Ndị Ozi 15 >