< Ọrụ Ndị Ozi 12 >

1 Nʼoge ahụ, eze Herọd jidere ụfọdụ ndị so na chọọchị buru nʼobi ịkpagbu ha.
Now, about that time, Herod the king made cruel attacks on the Christians.
2 O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn.
And he put James, the brother of John, to death with the sword.
3 Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko.
And when he saw that this was pleasing to the Jews he went on to take Peter in addition. This was at the time of the feast of unleavened bread.
4 Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị.
And having taken him, he put him in prison, with four bands of armed men to keep watch over him; his purpose being to take him out to the people after the Passover.
5 Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke.
So Peter was kept in prison: but the church made strong prayer to God for him.
6 Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.
And when Herod was about to take him out, the same night Peter was sleeping in chains between two armed men, and the watchmen were keeping watch before the door of the prison.
7 Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya.
And a great light was seen shining in the room, and an angel of the Lord came to Peter and, touching him on his side so that he came out of his sleep, said, Get up quickly. And his chains came off his hands.
8 Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.”
Then the angel said, Put on your shoes and get ready to go. And he did so. And he said, Put your coat round you and come with me.
9 Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie.
And he went out after him; and he was not certain if what was done by the angel was a fact, for it seemed to him that he was seeing a vision.
10 Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.
And when they had gone past the first and second watchmen they came to the iron door into the town, which came open by itself: and they went out and down one street; and then the angel went away.
11 Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”
And when Peter came to his senses he said, Now, truly, I am certain that the Lord has sent his angel and taken me out of the hands of Herod, against all the hopes of the Jews.
12 Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere.
And when he became clear about this, he went to the house of Mary, the mother of John named Mark, where a number of them had come together for prayer.
13 Mgbe ọ kụrụ aka nʼọnụ ụzọ ama, otu odibo nwanyị aha ya bụ Roda bịara ka o zaa ya.
And he gave a blow on the door, and a young girl came to it, named Rhoda.
14 Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!”
And hearing the voice of Peter, in her joy she went running, without opening the door, to say that Peter was outside.
15 Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.”
And they said to her, You are off your head. But still she said, with decision, that it was so. And they said, It is his angel.
16 Ma Pita nọgidere na-akụ aka nʼụzọ. Mgbe ha meghere ụzọ hụ ya, ọ gbagwojuru ha anya.
But Peter went on giving blows on the door: and when it was open and they saw him, they were full of wonder.
17 O feere ha aka ka ha mechie ọnụ. Ọ kọọrọ ha otu Onyenwe anyị si dupụta ya site nʼụlọ mkpọrọ. Ọ gwara ha, “Meenụ ka Jemis na ụmụnna anyị niile mata ihe ndị a.” Ọ pụrụ gawa ebe ọzọ.
But he made a sign to them with his hand to be quiet, and gave them an account of how the Lord had taken him out of prison. And he said, Give the news to James and the brothers. And then he went away.
18 Nʼisi ụtụtụ echi ya, oke ọgbaaghara dị nʼetiti ndị agha, ebe ha na-eche ihe mere Pita.
Now when it was day, the armed men were greatly troubled about what had become of Peter.
19 Mgbe Herọd chọgharịchara ya ma ọ chọtaghị ya, ọ jụrụ ndị nche ahụ ajụjụ dị iche iche. Nʼikpeazụ ọ nyere iwu ka e gbuo ha. Emesịa ọ hapụrụ Judịa gaa Sizaria nọdụ nʼebe ahụ.
And Herod, when he sent for him, and he was not there, after questioning the watchmen, gave orders that they were to be put to death. Then he went down from Judaea to Caesarea for a time.
20 Nʼoge ahụ Herọd na-eweso ndị Taịa na Saịdọn iwe, ha zipụrụ ndị ozi ha izute ya. Ha buru ụzọ mee ka ha na Blastọs bụrụ enyi, onye eze tụkwasịrị obi nke na-elekọtakwa ime ụlọ ndina eze anya. Ha rịọrọ ya ka udo dịrị, nʼihi na a na-esi nʼobodo eze na-enwetara ha ihe oriri.
Now he was very angry with the people of Tyre and Sidon: and they came to him, all together, and having made friends with Blastus, the controller of the king's house, they made a request for peace, because their country was dependent on the king's country for its food.
21 Nʼụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị uwe ndị eze ya nọkwasị nʼocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ niile okwu.
And on the day which had been fixed, Herod, dressed in his robes and seated in his place, made a public statement to them.
22 Igwe mmadụ ahụ nọ na-eti mkpu, “Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu chi!”
And the people, with loud cries, said, It is the voice of a god, not of a man.
23 Nʼotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti dị egwu nʼihi na o nyeghị Chineke otuto ma otu. Ikpuru ripịara ya ahụ, nke mere ka ọ nwụọ.
And straight away the angel of the Lord sent a disease on him, because he did not give the glory to God: and his flesh was wasted away by worms, and so he came to his end.
24 Ma okwu Chineke gara nʼihu na-aba ụba na-agbasakwa.
But the word of the Lord went on increasing.
25 Mgbe ha rụchara ọrụ ha, Banabas na Sọl si Jerusalem lọghachi. Ha kpọọrọ Jọn onye a na-akpọkwa Mak nʼije ha.
And Barnabas and Saul came back from Jerusalem, when their work was ended, taking with them John named Mark.

< Ọrụ Ndị Ozi 12 >