< Ọrụ Ndị Ozi 10 >

1 Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọnelịọs. O bụ ọchịagha na-elekọta narị ndị agha si na mpaghara Itali.
Il y avait à Césarée un homme du nom de Corneille, centurion de ce qu'on appelait le régiment d'Italie,
2 Nwoke a na ezinaụlọ ya bụ ndị na-asọpụrụ ma na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka na-ekpekwara Chineke mgbe niile.
homme pieux et craignant Dieu de toute sa maison, qui faisait généreusement aux gens des dons pour les indigents et qui priait toujours Dieu.
3 Otu ụbọchị, nʼihe dịka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ ebe otu mmụọ ozi nke Chineke bịakwutere ya sị ya, “Kọnelịọs!”
Vers la neuvième heure du jour, il vit clairement dans une vision un ange de Dieu qui venait à lui et lui disait: « Corneille! »
4 Kọnelịọs lekwasịrị ya anya nʼegwu jụọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụ gịnị?” Ọ sịrị ya, “Ekpere gị na onyinye gị nye ndị ogbenye e rutela dịka ihe ncheta nʼihu Chineke.
Lui, fixant les yeux sur lui et effrayé, dit: « Qu'y a-t-il, Seigneur? » Il lui dit: « Tes prières et tes dons aux indigents sont montés en souvenir devant Dieu.
5 Ugbu a, zie ndị ikom ka ha gaa nʼobodo Jopa kpọta otu onye aha ya bụ Saimọn, onye a na-akpọkwa Pita.
Envoie maintenant des hommes à Joppé, et fais venir Simon, qu'on appelle aussi Pierre.
6 Ọ bụ ọbịa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Onye ụlọ ya dị nʼakụkụ osimiri.”
Il est chez un corroyeur, nommé Simon, dont la maison est au bord de la mer.
7 Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ ndị ohu ya abụọ na otu nʼime ndị agha na-eche ya nche nke na-atụkwa egwu Chineke.
Lorsque l'ange qui lui avait parlé fut parti, Corneille appela deux de ses domestiques et un soldat pieux parmi ceux qui le servaient continuellement.
8 Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa.
Après leur avoir tout expliqué, il les envoya à Joppé.
9 Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere.
Le lendemain, comme ils étaient en route et qu'ils approchaient de la ville, Pierre monta sur le toit de la maison pour prier, vers midi.
10 Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ.
Il eut faim et voulut manger, mais pendant qu'on préparait le repas, il tomba en transe.
11 Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala.
Il vit le ciel ouvert et un récipient qui descendait vers lui, comme une grande nappe étendue par les quatre coins sur la terre,
12 Ihe dị nʼime ya: bụ ụmụ anụmanụ dị iche iche, ndị nwere ụkwụ anọ, ma anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke igwe.
dans lequel se trouvaient toutes sortes d'animaux quadrupèdes de la terre, des bêtes sauvages, des reptiles et des oiseaux du ciel.
13 Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.”
Une voix s'adressa à lui: « Lève-toi, Pierre, tue et mange! »
14 Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.”
Mais Pierre dit: « Non, Seigneur, car je n'ai jamais rien mangé de commun ou d'impur. »
15 Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.”
La deuxième fois, une voix se fit entendre: « Ce que Dieu a purifié, tu ne dois pas l'appeler impur. »
16 Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe.
Cela se fit trois fois, et aussitôt la chose fut reçue au ciel.
17 Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị.
Comme Pierre était très perplexe sur la signification de la vision qu'il avait eue, voici que les hommes envoyés par Corneille, s'étant informés de la maison de Simon, se présentèrent devant la porte,
18 Ha kpọrọ oku ịjụ ma Saimọn onye a na-akpọ Pita ọ nọ nʼụlọ ahụ.
et appelèrent pour demander si Simon, appelé aussi Pierre, y était logé.
19 Ka Pita nọrịị na-atụgharị uche nʼihe ọhụ ahụ pụtara, Mmụọ Nsọ gwara ya, “Lee, mmadụ atọ guzo nʼọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị.
Pendant que Pierre réfléchissait à la vision, l'Esprit lui dit: « Voici, trois hommes te cherchent.
20 Bilie, rịda jekwuru ha ngwangwa, enwela obi abụọ ị soro ha gawa, nʼihi na ọ bụ m zitere ha.”
Mais lève-toi, descends, et va avec eux, sans douter de rien; car je les ai envoyés. »
21 Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?”
Pierre descendit vers les hommes, et dit: « Voici, je suis celui que vous cherchez. Pourquoi êtes-vous venus? »
22 Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.”
Ils répondirent: « Corneille, centurion, homme juste et craignant Dieu, et dont toute la nation des Juifs parle en bien, a été chargé par un saint ange de vous inviter dans sa maison et d'écouter ce que vous direz. »
23 Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa. Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa.
Il les fit donc venir et leur procura un logement. Le lendemain, Pierre se leva et sortit avec eux, et quelques-uns des frères de Joppé l'accompagnèrent.
24 Nʼụbọchị na-esota ya, ha bịaruru Sizaria. Kọnelịọs nọrịị na-eche ha, ya na ndị ezinaụlọ ya, na ndị ikwu na ibe ya, na ndị enyi ya ọ kpọrọ.
Le lendemain, ils entrèrent dans Césarée. Corneille les attendait, ayant convoqué ses parents et ses amis proches.
25 Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala.
Lorsque Pierre entra, Corneille vint à sa rencontre, se jeta à ses pieds et l'adora.
26 Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.”
Mais Pierre le releva, en disant: « Lève-toi! Moi aussi, je suis un homme. »
27 Mgbe ha na-ekwurịta okwu, ọ banyere nʼime ụlọ ma hụ igwe mmadụ ka ha zukọtara.
Comme il parlait avec lui, il entra et trouva beaucoup de gens rassemblés.
28 Ọ sịrị ha, “Unu maara nke ọma na ọ bụ ihe megidere iwu na onye Juu na onye mba ọzọ ga-enwe mmekọrịta maọbụ gaa leta onye mba ọzọ. Ma Chineke ezila m na m ekwesighị ịkpọ mmadụ ọbụla onye rụrụ arụ maọbụ onye na-adịghị ọcha.
Il leur dit: « Vous savez vous-mêmes qu'il est interdit à un homme de race juive de s'unir ou de s'approcher d'un homme d'une autre nation; mais Dieu m'a montré que je ne devais appeler aucun homme impie ou impur.
29 Nʼihi nke a, ọ bụ ya mere m jiri bịa mgbe akpọrọ m na-ajụghị ajụjụ. Ma ka m jụọ ugbu a ihe mere unu ji kpọọ m?”
C'est pourquoi je suis aussi venu sans me plaindre quand on m'a envoyé chercher. Je vous demande donc pourquoi vous m'avez fait venir. »
30 Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m.
Corneille dit: « Il y a quatre jours, j'ai jeûné jusqu'à cette heure-ci; à la neuvième heure, j'ai prié dans ma maison, et voici qu'un homme se tenait devant moi, vêtu d'un vêtement éclatant
31 Ọ sịrị, Kọnelịọs, ‘Chineke anụla ekpere gị ma chetakwa onyinye ị na-enye ndị ogbenye.
et disant: 'Corneille, ta prière a été entendue, et Dieu se souvient de tes dons aux indigents'.
32 Ziga nʼobodo Jopa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. O bi nʼakụkụ osimiri.’ Nʼebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye ọbịa aha ya bụ Saimọn a na-akpọ Pita.
Envoie donc à Joppé et fais venir Simon, qu'on appelle aussi Pierre. Il loge dans la maison d'un corroyeur nommé Simon, au bord de la mer. Quand il sera arrivé, il te parlera.
33 Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji mee ngwangwa zie ka a kpọọ gị. Ọ dị mma na ị bịara. Ugbu a, anyị niile ezukọtala nʼebe a nʼihu Chineke ịnụrụ ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ka ị gwa anyị.”
Je t'ai donc envoyé sur-le-champ, et tu as bien fait de venir. Maintenant donc, nous sommes tous ici présents devant Dieu pour entendre tout ce que Dieu vous a ordonné. »
34 Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu.
Pierre ouvrit la bouche et dit: En vérité, je sais que Dieu ne fait pas de favoritisme,
35 Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata.
mais qu'il accepte dans toutes les nations celui qui le craint et qui pratique la justice.
36 Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile.
La parole qu'il a envoyée aux enfants d'Israël, annonçant la bonne nouvelle de la paix par Jésus-Christ, qui est le Seigneur de tous,
37 Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya.
vous savez vous-mêmes ce qui s'est passé, et qui a été proclamé dans toute la Judée, à commencer par la Galilée, après le baptême que Jean a prêché,
38 Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya.
comment Dieu a oint du Saint-Esprit et de puissance Jésus de Nazareth, qui allait de lieu en lieu faisant du bien et guérissant tous ceux qui étaient opprimés par le diable, car Dieu était avec lui.
39 “Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe.
Nous sommes témoins de tout ce qu'il a fait, tant dans le pays des Juifs qu'à Jérusalem, où ils l'ont aussi tué, en le pendant au bois.
40 Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ndị mmadụ hụ ya anya.
Dieu l'a ressuscité le troisième jour et l'a fait connaître,
41 Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie.
non pas à tout le peuple, mais à des témoins choisis d'avance par Dieu, à nous qui avons mangé et bu avec lui après sa résurrection des morts.
42 O nyere anyị iwu ka anyị gaa zisaa oziọma nʼebe niile, ịkọwa na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
Il nous a ordonné de prêcher au peuple et d'attester que c'est lui qui a été établi par Dieu comme juge des vivants et des morts.
43 Ndị amụma niile gbara ama ihe banyere ya na onye ọbụla nke kweere na ya ga-enweta mgbaghara mmehie site nʼaha ya.”
Tous les prophètes témoignent de lui que, par son nom, quiconque croit en lui reçoit le pardon des péchés. »
44 Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a.
Comme Pierre prononçait encore ces paroles, le Saint-Esprit tomba sur tous ceux qui écoutaient la parole.
45 Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ.
Ceux des circoncis qui avaient cru étaient dans l'étonnement, tous ceux qui étaient venus avec Pierre, parce que le don du Saint-Esprit était aussi répandu sur les païens.
46 Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ,
Car ils les entendaient parler en d'autres langues et magnifier Dieu. Pierre répondit:
47 “Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?”
« Quelqu'un peut-il interdire à ces gens d'être baptisés d'eau? Ils ont reçu le Saint-Esprit, tout comme nous. »
48 Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.
Il leur ordonna de se faire baptiser au nom de Jésus-Christ. Puis ils lui demandèrent de rester quelques jours.

< Ọrụ Ndị Ozi 10 >