< 2 Timoti 3 >

1 Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ.
But know this: In the last days there will be difficult times.
2 Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha.
For people will be lovers of themselves, lovers of money, boastful, proud, blasphemers, disobedient to parents, ungrateful, and unholy.
3 Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.
They will be without natural affection, unable to reconcile, slanderers, without self-control, violent, not lovers of good.
4 Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya.
They will be betrayers, reckless, conceited, lovers of pleasure rather than lovers of God.
5 Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ.
They will have a shape of godliness, but they will deny its power. Turn away from these people.
6 Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ.
For some of them are men who enter into households and captivate foolish women. These are women who are heaped up with sins and are led away by various desires.
7 Ndị a na-akụziri ihe oge niile, ma ha apụghị inweta amamihe nke eziokwu.
These women are always learning, but they are never able to come to the knowledge of the truth.
8 Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosis ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị.
In the same way that Jannes and Jambres stood against Moses, these false teachers also stand against the truth. They are men corrupt in mind, and with regard to the faith they are proven to be false.
9 Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ.
But they will not advance very far. For their foolishness will be obvious to all, just like that of those men.
10 Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m,
But as for you, you have followed my teaching, conduct, purpose, faith, longsuffering, love, patience,
11 na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼAntiọk, na Aikoniọm, na Listra. Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma Onyenwe anyị napụtara m site nʼime ha niile.
persecutions, sufferings, and what happened to me at Antioch, at Iconium, and at Lystra. I endured persecutions. Out of them all, the Lord rescued me.
12 Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga mkpagbu.
All those who want to live in a godly manner in Christ Jesus will be persecuted.
13 Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.
Evil people and impostors will go from bad to worse, leading others and themselves astray.
14 Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha.
But as for you, remain in the things that you have learned and have firmly believed. You know from whom you have learned.
15 Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.
You know that from childhood you have known the sacred writings. These are able to make you wise for salvation through faith in Christ Jesus.
16 Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:
All scripture has been inspired by God. It is profitable for doctrine, for conviction, for correction, and for training in righteousness.
17 ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.
This is so that the man of God may be competent, equipped for every good work.

< 2 Timoti 3 >