< 2 Timoti 1 >

1 Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị,
Paul, an apostle of Jesus Christ by the will of God according to the promise of life that is in Christ Jesus,
2 Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị.
to Timothy, my beloved child: Grace, mercy, and peace from God the Father and Christ Jesus our Lord.
3 Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị.
I thank God, whom I serve with a clear conscience as my forefathers did, as night and day I constantly remember yoʋ in my prayers.
4 Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke.
Recalling yoʋr tears, I long to see yoʋ so that I may be filled with joy.
5 Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị.
I am reminded of the sincere faith that is in yoʋ, which dwelt first in yoʋr grandmother Lois and in yoʋr mother Eunice, and now, I am sure, dwells in yoʋ also.
6 Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi.
Therefore I remind yoʋ to rekindle the gift of God that is in yoʋ through the laying on of my hands.
7 Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
For God did not give us a spirit of timidity, but a spirit of power, love, and sound judgment.
8 Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.
Therefore do not be ashamed of the testimony of our Lord or of me his prisoner. Rather, join with me in suffering for the gospel as you rely on the power of God.
9 Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a. (aiōnios g166)
He saved us and called us with a holy calling, not according to our works, but according to his own purpose and grace. This grace was given to us in Christ Jesus before time began, (aiōnios g166)
10 Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.
but has now been revealed through the appearing of our Savior Jesus Christ, who abolished death and brought life and immortality to light through the gospel.
11 Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.
For this gospel I was appointed to be a preacher, an apostle, and a teacher of the Gentiles.
12 Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.
That is why I am suffering these things. But I am not ashamed, for I know whom I have believed, and I am persuaded that he is able to guard what has been entrusted to me until that day.
13 Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs.
Hold to the pattern of sound teaching that yoʋ have heard from me, in the faith and love that are in Christ Jesus.
14 Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe.
By the Holy Spirit who dwells within us, guard the good deposit that has been entrusted to yoʋ.
15 Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa.
Yoʋ know that everyone in Asia has turned away from me, including Phygelus and Hermogenes.
16 Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.
May the Lord give mercy to the household of Onesiphorus, because he often refreshed me and was not ashamed of my chains.
17 Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m.
On the contrary, when he arrived in Rome, he sought me out very diligently and found me.
18 Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.
May the Lord grant him to find mercy from the Lord on that day! Yoʋ know very well all the ways he helped me in Ephesus.

< 2 Timoti 1 >