< 2 Ndị Tesalonaịka 3 >

1 Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu.
Ti kpiiba, ti majuodikaama tie mine: Ya miadi mani U Tienu tipo ke o Diedo maama n suagi liiga ki yayadi, bi niba n jigini ma nani lan tie yi ya siiga maama.
2 Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.
Yin go ya miadi o mani wan faabi ti leni bi nibiadiba leni yaaba n bia ke li kandi, kelima bi niba kuli ka tuo li dandanli.
3 Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.
Ama o Diedo tie tin fidi ki dugi yua yaa po. O baa teni yin yaa se ke li pa boŋanla, ki kubi yi ke o biado n da paadi yi.
4 Anyị nwere nchekwube nʼime Onyenwe anyị na unu na-eme ma ga-anọgidekwa na-eme ihe niile anyị nyere unu nʼiwu.
Ti pia yipo laa dugidi o Diedo nni ke yi tiendi ki go baa tiendi tin den puogi yi yaala kuli.
5 Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.
O Diedo n gobidi yi yantiana yin yaa pia U Tienu buama leni Kilisiti ya juunli.
6 Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị.
Ti kpiiba, ti Diedo Jesu Kilisiti yeli po ti waani yi ke yin paadi leni yi kpiiba yaaba n tie kpadijedanba kaa ŋua tin bangi yi yaa bangima.
7 Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ.
Yinba yiba bani lan pundi yin yaa togidi ti maama. Tin den ye yi siiga tii den yie a tuona.
8 O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla.
Tii den di oba kuli jiema fanma fanma, ama ti den tuuni a tuona u yensiinu leni ku ñiagu ki laadi fala ke ti yema n da tua oba kuli po tugili.
9 Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi.
Laa tie ke tii den pia liba ka, ama ti den tiendi yeni kelima ti den bua ki ŋa yipo li bontogidikaala.
10 Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”
Tin den ye yi siiga ti den waani line: “yua n ki bua ki soani n da je moko”.
11 Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla.
Ti maadi yeni kelima ti gba ke yi siiga bi tiaba yie kaa tuuni tuonliba kuli ama ki goadi leni mi kulinkundima.
12 Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.
Ti waani laa niba ki tundi ba kelima o diedo Jesu Kilisiti yeli po ke ban yaa tuuni li tuonli leni mi yansoangima, ki baadi bi jiema.
13 Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.
Ti kpiiba, yin da coagi leni a tuonŋama tienma.
14 Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha.
Yi yaa sua ke niloba ki tuo ki ŋua tin bili yipo yaala li naa tili nni, yin faami opo ki da pia ŋantaado leni o, ke i fe n cuo o.
15 Nʼagbanyeghị nke a, unu agụkwala ha dị ka ndị iro unu, kama nyenụ ha ndụmọdụ dị ka ụmụnna.
Yin da nua o ke o tie yibali ka, ama yin ya nua o ke o tie yi kpiilo ki tuodi ki tundi o.
16 Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu.
Mi yanduanma Diedo, wani oba n yaa puuni mi yanduama u yogunu kuli yi yema buoli kuli nni. Wani o Diedo n ya ye leni yikuli.
17 Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu niile. Nke a bụ ihe e ji arịba akwụkwọ niile m dere ama. Otu a ka m si ede ihe.
Mini polo n diani ya fuondi n tie na leni n nuceli. Min diani ya tila kuli, n tieni n maalima yeni. Lan tie min dangi maama.
18 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.
Ti Diedo Jesu Kilisiti ya ŋanbili n ya ye leni yi kuli.

< 2 Ndị Tesalonaịka 3 >