< 2 Ndị Tesalonaịka 2 >

1 Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna.
Zvino tinokukumbirisai, hama, maererano nekuuya kwaIshe wedu Jesu Kristu, nekuunganira kwedu kwaari,
2 Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola.
kuti murege kukurumidza kuzununguswa mufungwa, kana kuvhunduswa, kana nemweya, kana neshoko, kana netsamba seinonyorwa nesu, sezvinonzi zuva raKristu ratosvika.
3 Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi.
Ngakurege kuva nemunhu anokunyengerai nemutoo upi neupi; nokuti harisviki kunze kwekuti kuwa kwatanga kusvika, uye munhu wechivi aratidzwe, mwanakomana wekuparadzwa,
4 Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.
anopikisa nekuzvikudza pamusoro pezvese zvinonzi Mwari, kana zvinonamatwa, kusvikira agara mutembere yaMwari saMwari, achizviratidza kuti ndiMwari.
5 Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya?
Hamurangariri here kuti ndichiri nemwi ndakakuudzai zvinhu izvi?
6 Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru.
Asi ikozvino munoziva chinodzivirira kuti aratidzwe munguva yake pachake.
7 Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya.
Nokuti chakavanzika chekusava nemurairo chotoshanda; chete aripo anodzivirira ikozvino, kusvikira achibviswa pakati.
8 Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya.
Ipapowo asina murairo acharatidzwa, Ishe waachapedza nemweya wemuromo wake, uye waachaparadza nekuonekwa kwekuuya kwake;
9 Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha.
iye kuuya kwake kwakaita sekuita kwaSatani nesimba rese nezviratidzo nezvinoshamisa zvenhema,
10 Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta.
nepakunyengera kwese kwekusarurama mune vanoparara, nokuti havana kugamuchira rudo rwechokwadi kuti vaponeswe.
11 Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a.
Uye nekuda kwaizvozvi Mwari achavatumira simba rekutsauka, kuti vatende nhema;
12 Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.
kuti vese varaswe vasina kutenda chokwadi, asi vakafara mukusarurama.
13 Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ.
Asi isu tinofanira kuvonga Mwari nguva dzese pamusoro penyu, hama vadikanwi vaIshe, kuti Mwari kubva pakutanga wakakusarudzirai ruponeso pakuitwa vatsvene kweMweya nerutendo rwechokwadi;
14 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
zvaakakudanirai neevhangeri yedu, pakuwana kubwinya kwaIshe wedu Jesu Kristu.
15 Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu.
Naizvozvo zvino, hama, mirai makasimba, mubatirire tsika dzamakadzidziswa, kana neshoko kana netsamba yedu.
16 Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, (aiōnios g166)
Zvino Ishe wedu Jesu Kristu amene, naMwari, kunyange Baba vedu vakatida, vakapa nyaradzo isingaperi netariro yakanaka munyasha, (aiōnios g166)
17 gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma.
anyaradze moyo yenyu, nekukusimbisai pashoko rega-rega rakanaka nebasa.

< 2 Ndị Tesalonaịka 2 >