< 2 Ndị Tesalonaịka 2 >

1 Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna.
Prosímeť pak vás, bratří, skrze příští Pána našeho Jezukrista a naše shromáždění v něj,
2 Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola.
Abyste se nedali rychle vyrážeti z mysli, ani kormoutiti, buď skrze ducha, buďto skrze řeč, neb skrze list, jako od nás poslaný, jako by nastával den Kristův.
3 Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi.
Nesvodiž vás žádný nižádným obyčejem. Neboť nenastane den Páně, než až prve přijde odstoupení, a zjeven bude ten člověk hřícha, syn zatracení,
4 Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.
Protivící a povyšující se nade všecko, což slove Bůh, anebo čemuž se děje Božská čest, takže se posadí v chrámě Božím, tak sobě počínaje, jako by byl Bůh.
5 Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya?
Nepomníte-liž, že ještě byv u vás, o tom jsem vám pravil?
6 Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru.
A nyní co mešká, víte, totiž aby on teprv zjeven byl časem svým.
7 Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya.
Nebo již tajemství nepravosti působí, toliko až by ten, jenž jej zdržuje nyní, z prostředku byl vyvržen.
8 Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya.
A tehdážť zjeven bude ten bezbožník, kteréhož Pán zabije duchem úst svých a zkazí zjevením jasné přítomnosti své,
9 Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha.
Kteréhožto nešlechetníka příští jest podle mocného díla satanova, se vší mocí a divy i zázraky lživými,
10 Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta.
A se všelikým podvodem nepravosti v těch, jenž hynou, protože lásky pravdy nepřijali, aby spaseni byli.
11 Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a.
A protož pošle jim Bůh mocné dílo podvodů, aby věřili lži,
12 Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.
A aby odsouzeni byli všickni, kteříž neuvěřili pravdě, ale oblíbili sobě nepravost.
13 Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ.
Myť pak jsme povinni děkovati Bohu vždycky z vás, bratří Pánu milí, že vyvolil vás Bůh od počátku k spasení, v posvěcení Ducha a u víře pravdy,
14 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
K čemuž povolal vás skrze evangelium naše, k dojití slávy Pána našeho Jezukrista.
15 Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu.
A protož, bratří, stůjtež a držtež se učení vydaného, jemuž jste se naučili, buďto skrze řeč, buďto i skrze list náš.
16 Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, (aiōnios g166)
On pak Pán náš Ježíš Kristus, a Bůh i Otec náš, kterýž zamiloval nás a dal nám potěšení věčné a naději dobrou z milosti, (aiōnios g166)
17 gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma.
Potěšujž srdcí vašich a utvrdiž vás v každém slovu i skutku dobrém.

< 2 Ndị Tesalonaịka 2 >