< 2 Samuel 9 >

1 Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”
Daudi akauliza, “Je, hakuna mtu hata mmoja wa nyumba ya Sauli aliyebaki ambaye naweza kumtendea wema kwa ajili ya Yonathani?”
2 Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.”
Basi palikuwepo mtumishi wa nyumba ya Sauli aliyeitwa Siba. Wakamwita aje mbele ya Daudi, naye mfalme akamwambia, “Wewe ndiwe Siba?” Akamjibu, “Naam, mimi ndiye mtumishi wako.”
3 Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”
Mfalme akauliza, “Je, hakuna yeyote ambaye amebaki wa nyumba ya Sauli ninayeweza kumwonyesha wema wa Mungu?” Siba akamjibu mfalme, “Bado yupo mwana wa Yonathani, yeye ni kiwete miguu yote.”
4 Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.”
Mfalme akauliza, “Yuko wapi?” Siba akajibu, “Yuko nyumbani kwa Makiri mwana wa Amieli huko Lo-Debari.”
5 Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.
Basi Mfalme Daudi akamtaka aletwe kutoka Lo-Debari, kutoka nyumbani kwa Makiri mwana wa Amieli.
6 Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.”
Mefiboshethi mwana wa Yonathani, mwana wa Sauli, alipofika kwa Daudi, akainama kumpa mfalme heshima. Daudi akamwita, “Mefiboshethi!” Mefiboshethi akajibu, “Ndimi mtumishi wako.”
7 Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
Daudi akamwambia, “Usiogope, kwa maana hakika nitakutendea wema kwa ajili ya baba yako Yonathani. Nitakurudishia ardhi yote iliyokuwa mali ya Sauli baba yako, nawe daima utakula chakula mezani pangu.”
8 Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?”
Mefiboshethi akasujudu akasema, “Mimi mtumishi wako ni nini hata uangalie mbwa mfu kama mimi?”
9 Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.
Ndipo mfalme akamwita Siba mtumishi wa Sauli na kumwambia, “Nimempa mwana wa bwana wako kila kitu kilichokuwa mali ya Sauli na jamaa yake.
10 Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.
Wewe, wanao na watumishi wako mtamlimia mashamba Mefiboshethi na kumletea mavuno, ili kwamba mwana wa bwana wako apate mahitaji yake. Naye Mefiboshethi mwana wa bwana wako atakula chakula mezani pangu daima.” (Siba alikuwa na wana kumi na watano, na watumishi ishirini.)
11 Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze.
Ndipo Siba akamwambia mfalme, “Mtumishi wako atafanya chochote bwana wangu mfalme atakachoagiza mtumishi wake kufanya.” Basi Mefiboshethi akala chakula mezani pa Daudi kama mmoja wa wana wa mfalme.
12 Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.
Mefiboshethi alikuwa na mwanawe mdogo aliyeitwa Mika, nao watu wote wa nyumba ya Siba walikuwa watumishi wa Mefiboshethi.
13 Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ.
Naye Mefiboshethi akaishi huko Yerusalemu, kwa sababu daima alikula mezani pa mfalme, naye alikuwa kiwete miguu yote.

< 2 Samuel 9 >